Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ọrụ Na-aga n’Ihu n’Ihu na Wọwik

Ọrụ Na-aga n’Ihu n’Ihu na Wọwik

A NA-ARỤ nnukwu ọrụ n’ebe ga-emecha bụrụ isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova na Wọwik, nke dị na Niu Yọk. Obi na-atọkwa ndị so na-arụ ọrụ n’ebe ahụ ụtọ. Ọtụtụ narị ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ahapụla ọtụtụ ihe ha na-eme ka ha nwee ike iso rụọ ọrụ a. N’agbanyeghị ihe ndị ha hapụrụ, ọtụtụ n’ime ha ekwuola na “o nwedịghị ọrụ ka iso na-arụ ọrụ n’ebe a mma.” Ka anyị leba anya n’ihe na-eme na Wọwik.