Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

Nnọkọ Kacha Buo Ibu Ndịàmà Jehova Nwetụrụla

NA Satọdee, Ọktoba 5, 2013, ụmụnna dị 257,294, bụ́ ndị si mba iri abụọ na otu, bịara nnọkọ nke otu narị na iri abụọ na itoolu nke Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania na-enwe kwa afọ. Ụfọdụ bịara n’ụlọ nzukọ a nọ nwee nnọkọ a, ebe ndị ọzọ nọ n’ebe ndị ọzọ ma si n’Ịntanet na-ekiri ihe a na-eme. Ná ngwụcha izu ahụ, ọtụtụ ụmụnna anyị nọ n’ebe dị iche iche lee ihe omume ahụ e tinyere na teepụ. A gụkọta ndị niile bịara nnọkọ a na ndị nọ ebe ọzọ kirie ma gere ya, ha dị 1,413,676. Ha niile si mba iri atọ na otu. Ihe a bụ nnọkọ kachanụ Ndịàmà Jehova nwetụrụla.

Kemgbe afọ 1922, Ndịàmà Jehova na-esi na telefon nakwa na redio eme ka ọtụtụ ndị nọ n’ebe dị iche iche n’ụwa gere ihe a na-ekwu ná mgbakọ ha. Taa, a na-esi n’Ịntanet eme ka ndị nọ ma n’ime ime obodo na-egere ma na-ekiri ihe a na-eme n’ebe ọzọ n’oge a na-eme ihe ahụ ma ọ bụ mgbe e mechara ya.

Ọtụtụ ụmụnna nọ n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị iche iche rụrụ ọrụ ihe karịrị otu afọ ka ha nweta ihe ga-eme ka ha si n’Ịntanet na-ekiri ma na-egere ihe na-eme ebe ọzọ. Ná ngwụcha izu ụbọchị e nwere nnọkọ ahụ, ụmụnna anyị ndị okwu gbasara Ịntanet doro anya si na Bruklin, Niu Yọk, na-ele otú ihe a ha rụrụ si na-arụ ọrụ iji hụ na e gosiri ụmụnna anyị ndị nọ ná mpaghara dị iche iche n’ụwa ihe omume ahụ. Ha rụrụ ọrụ n’akwụsịghị akwụsị ruo mgbe e mechara ihe omume a n’ebe niile a chọrọ ka e mee ya.