Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E MERE N’AFỌ GARA AGA

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

AMINIA Ebidola Inye Ụmụnna Anyị Na-achọghị Ịrụ Ọrụ Soja Ọrụ Ọzọ Ha Ga Na-arụ

Aminia: Gọọmenti mba a enyela ụmụnna anyị ọrụ ọzọ ha nwere ike ịrụ kama ịrụ ọrụ soja. Ọ bụ n’ime ime obodo ka e nyere ha ọrụ a. N’ebe ahụ, ha na-ewepụta ohere na-aga ekwusa ozi ọma

N’afọ 2013, gọọmenti Aminia bidoro inye ndị na-achọghị ịrụ ọrụ soja ọrụ ọzọ ha ga na-arụ. Nke a emeela ka Ndịàmà Jehova bi n’Aminia, bụ́ ndị akọnuche ha na-anaghị ekwe rụọ ọrụ soja, hụ ọrụ ọzọ ha nwere ike ịrụ kama ịga mkpọrọ. Alaka ụlọ ọrụ anyị kwuru na malite n’ọnwa Jenụwarị afọ 2014, ụmụnna iri asaa na otu ebidola ịrụ ọrụ ọzọ e nyere ha. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị a gwara ka ha rụwa ọrụ n’ebe a na-esi nri, nweekwa ndị a gwara ka ha nyewere ndị nọọsụ aka n’ụlọ ọgwụ. Ndị na-ahazi ọrụ a ekwuola okwu ọma banyere àgwà ọma ụmụnna anyị na otú ha si arụsi ọrụ ike n’agbanyeghị na ọrụ a na-ekenyekarị ha na-esi ezigbo ike. Ma, obi dị ụmụnna anyị ụtọ na gọọmenti haziri ọrụ ndị ha ga na-arụ, akọnuche ha aghara ịna-ama ha ikpe na ha na-eme ihe Ndị Kraịst na-ekwesịghị ime. * Otu nwanna sịrị: “Anyị na-ekele Jehova na o mere ka e kwe anyị rụwa ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ soja. O meela ka anyị nọpụ iche n’ụwa ma nwere onwe anyị ife ya.”

DỌMINIKAN RIPỌBLIK Enyela Ndịàmà Jehova Ikike Ijikọta Ndị Chọrọ Ịgba Akwụkwọ

N’afọ 1954, gọọmenti Dọminikan Rịpọblik na Vatikan bịanyere aka n’akwụkwọ, nke mere ka ọ bụrụ naanị Chọọchị Katọlik bụ okpukpe e nyere ikike ijikọta nwoke na nwaanyị chọrọ ịgba akwụkwọ ná mba ahụ. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị achọghị ịgba akwụkwọ na Chọọchị Katọlik, onye na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ gọọmenti nke na-ahụ maka ịgba akwụkwọ nwere ike ijikọta ha. Ma n’afọ 2011, gọọmenti mba a mere iwu ọhụrụ nke nyere ndị nnọchiteanya ruru eru si n’okpukpe ndị ọzọ ikike ijikọta nwoke na nwaanyị ka ha bụrụ di na nwunye. Gọọmenti mba ahụ zụrụ ndị niile chọrọ ka e nye ha ikike ahụ. Alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Dọminikan Rịpọblik họpụtara ndị okenye iri atọ ka ha gaa ọzụzụ ahụ. N’ime ihe karịrị puku mmadụ abụọ gara ọzụzụ ahụ, ọ bụ naanị mmadụ iri atọ na abụọ ka e nyere ikike ahụ. Ma, e nyechara ụmụnna anyị ahụ dị mmadụ iri atọ ikike ijikọta Ndịàmà Jehova chọrọ ịgba akwụkwọ.

INDIA Ha Kpebisiri Ike na Ha Ga Na-ekwusa Ozi Ọma n’Atụghị Egwu

Sundeep na Deepalakshmi Muniswamy

Na Jenụwarị 27, 2014, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruru Mmadụ na steeti Kanataka kwuru na onyeisi ndị uwe ojii na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii dị na Old Hubli megburu Nwanna Sundeep Muniswamy. Ihe mere ha ji kwuo otú ahụ bụ na o nweghị ihe onyeisi ndị uwe ojii ahụ mere iji chebe ya mgbe ìgwè mmadụ wakporo ya na Jun 28, 2011. Ụlọ Ọrụ ahụ kwuru na onyeisi ndị uwe ojii ahụ mere ihe na-adịghị mma, nyekwa iwu ka gọọmenti steeti Kanataka taa ya ahụhụ. Ha kwukwara ka ọ kwụọ Nwanna Muniswamy puku rupii iri abụọ (ihe karịrị puku naịra iri ise). Ụlọ ọrụ ahụ nyere iwu ka gọọmenti si n’ụgwọ ọnwa onyeisi ndị uwe ojii ahụ were ego ahụ.

Nwanna Muniswamy kwuru na ya na ezinụlọ ya na-ekele Jehova maka otú okwu ahụ si bie, ha kpebisikwara ike na ha ga na-ekwusa ozi ọma n’atụghị egwu. Ihe e kpebiri n’ikpe ahụ emeela ka okwukwe ụmụnna anyị nọ n’obodo ahụ sie ike, meekwa ka obi sie ha ike na Jehova ga na-echebe ndị ya. O meekwala ka ndị ọnụ na-eru n’okwu mata na ha kwesịrị ịhụ na e megbughị Ndịàmà Jehova bi na Kanataka. Nwanna Muniswamy na nwanna ọzọ ka nwere ikpe ọzọ dị n’ụlọikpe. Ọ bụ ihe mere mgbe a wakpọrọ Nwanna Muniswamy bọlitere ya.

KEGỊSTAN Òtù Ndị Ọkàikpe Bụ́ O Kwuchaa O Bie n’Okwu Gbasara Iwu n’Ụlọikpe Kasị Elu Ekpebiela na Mmadụ Nwere Ike Ịjụ Ịrụ Ọrụ Soja

Ụmụnna ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ soja ná mba a agaghị echefu Nọvemba 19, 2013 echefu. Ọ bụ n’ụbọchị ahụ ka Òtù Ndị Ọkàikpe Bụ́ O Kwuchaa O Bie n’Okwu Gbasara Iwu n’Ụlọikpe Kasị Elu ná mba a kpebiri ikpe Ndịàmà Jehova iri na otu. Ha kwuru na iwu mba a akwadoghị ọrụ e kenyere ndị a akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ soja. Tupu ha ekpebie ikpe a, iwu mba ahụ kwuru na ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ soja ga na-akwụ ndị soja mba ahụ ụgwọ iji na-akwado ọrụ ndị soja na-arụ. Iwu ahụ kwukwara na ọ bụrụ na oge e nyere ha ka ha rụọ ọrụ ahụ ezuo, a ga-edeba aha ha n’akwụkwọ ebe a na-ede aha ndị soja ga-eso lụọ agha ma agha su. Ụlọikpe ahụ mere ka o doo anya na ịmanye ndị akọnuche ha na-ekweghị gaa agha ka ha gaa rụọ ụdị ọrụ a megidere iwu mba ahụ nke kwuru na mmadụ nweere onwe ya ikpe okpukpe ọ chọrọ. Ná mbido afọ 2014, Ụlọikpe Kasị Elu nke mba Kegịstan mere ihe ahụ Òtù Ndị Ọkàikpe Bụ́ O Kwuchaa O Bie n’Okwu Gbasara Iwu kpebiri ma kwuo na aka Ndịàmà Jehova iri na anọ a maburu ikpe dị ọcha. Ọ bụ otú a ka ikpe e kpewere kemgbe afọ asaa si bie, ndị ahụ akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ soja enwerezie onwe ha. Otú obi si sie ụmụ okorobịa a na-eme udo ike emeela ka e bulie aha Jehova elu, meekwa ka ụmụnna anyị nwere onwe ha ife Chineke na Kegịstan.

Kegịstan: Ndịàmà Jehova e wepụrụ okwu ha n’ụlọikpe kacha elu e nwere na Kegịstan

NAỊJIRỊA “Jehova Agbachiterela M”

Na steeti Abịa dị na Naịjirịa, a na-eyikarị Ndịàmà Jehova egwu ma na-akpapụ ha n’obodo n’ihi na ha anaghị ekwe eso n’òtù ebiri. * Òtù ebiri ndị a na-emekarị ihe ike ma na-eme ememme ndị ọgọ mmụọ. N’otu isi ụtụtụ n’ọnwa Nọvemba afọ 2005, ndị òtù otu ebiri e nwere n’obodo Asaga Ọhafịa wabatara n’ụlọ Nwanna Emmanuel Ogwo na nwunye ya ma bukọrọ ihe niile ha ji biri iji manye ya ka o soro òtù ebiri ha. Naanị ihe fọọrọ di na nwunye a bụ uwe ha yi n’ahụ́. N’afọ 2006, ndị obodo ahụ chụpụrụ Nwanna Ogwo n’ụlọ ya nakwa n’obodo ha. Nwanna Ogwo na nwunye ya gbagara n’ụlọ otu nwanna bi n’obodo ọzọ. O nweghị ihe kọrọ ha n’ebe ahụ ha gbagara. N’afọ sochiri ya, Nwanna Ogwo laghachiri n’ụlọ ya. Ma, ndị obodo ya nọgidere na-enye ya nsogbu ka ọ bata n’òtù ebiri ha. Ha ekwekwaghị ebughachiri ya ngwongwo ya.

N’Eprel 15, 2014, Ụlọikpe Kasị Elu e nwere na steeti Abịa kpebiri ikpe ahụ. Ụlọikpe ahụ kwuru na Nwanna Ogwo nweere onwe ya ikpebi òtù ọ ga-eso ma ọ bụ okpukpe ọ ga-ekpe. Ndị òtù ebiri ahụ ebughachirila Nwanna Ogwo ngwongwo ya ha buuru. Ndị obodo ahụ anaghịzi eji ike akpapụ ụmụnna anyị otú ha na-emebu. Ụmụnna anyị nọ n’obodo Asaga Ọhafịa na-ekwusakwa ozi ọma n’enweghị onye na-enye ha nsogbu.

Nwanna Ogwo kwuru ihe mere mgbe ụlọikpe ahụ biri ikpe ahụ. Ọ sịrị: “Obi ụtọ mere ka m malie elu. Ọṅụ juru m obi. N’obi m, ama m na ọ bụ Jehova meriri. Ndị mmụọ ozi nọnyeere m. Jehova agbachiterela m.”

RỌSHỊA Ụlọikpe Kpebiri na A Gaghị Amachi jw.org

Ọtụtụ ikpe ụmụnna anyị nọ na Rọshịa nwere n’ụlọikpe emeela “ka ozi ọma na-aga n’ihu.” (Fil. 1:12) N’agbanyeghị na ụfọdụ ndị nọ n’ọchịchị na ndị isi okpukpe achọghị iji anya ahụ Ndịàmà Jehova, okwukwe ụmụnna anyị bi na Rọshịa ka siri ike, Jehova na-agọzikwa mbọ ha na-agba.

Otu ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ mmeri ụmụnna anyị nwetara n’ụlọikpe dị n’obodo Tivee. N’afọ 2013, otu ọkàiwu na-ekpechite ọnụ gọọmenti Rọshịa n’obodo Tivee gbara akwụkwọ n’ụlọikpe ka a machie ebe Ndịàmà Jehova na-edebe ihe n’Ịntanet bụ́ jw.org n’ebe niile na Rọshịa. Ụlọikpe ahụ kpebiri okwu ahụ ma kwuo ka e mee ihe ọkàiwu ahụ kwuru. Ma, ha agwaghị ndị na-anọchite anya Ndịàmà Jehova banyere ikpe ahụ. Mgbe ụmụnna anyị matara ihe merenụ, ha tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ. Na Jenụwarị 22, 2014, Ụlọikpe Ukwu dị na Tivee kagburu ihe ụlọikpe mbụ ahụ kpebiri ma biere anyị ikpe. Ihe a Jehova mere emeela ka ọtụtụ ụmụnna anyị bi na Rọshịa na-aga na jw.org enweta ihe ndị ga-enyere ha aka ka ha na Jehova na-adịkwu ná mma. Ekpere ụmụnna anyị n’ụwa niile sokwa mee ka nke a nwee isi.

TỌKI Ekwetabeghị Ka Ndị Akọnuche Ha Na-ekweghị Rụọ Ọrụ Soja Rụwa Ọrụ Ọzọ

A tụrụ Bariş Görmez, bụ́ Onyeàmà Jehova bi na Tọki, mkpọrọ ihe karịrị afọ anọ maka na o kweghị arụ ọrụ soja. Mgbe nwanna a nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị amị na ndị uwe ojii mesiri ya ike. Ha gbara ya ụkwụ, jirikwa okpiri kụtara ya isi aba okpu. Ọ takwara ahụhụ n’ụlọ mkpọrọ. Nwanna Görmez toro ezigbo ogologo. Ọ dị amaụkwụ asaa. N’ihi ya, ọ naghị ehili ụra n’àkwà e nyere ya. Kama, ọ na-eji àkwà abụọ a tụkọtara ọnụ ma sụkọta onwe ya asụkọta ka o nwee ike ịba ya. Ma ndị isi ụlọ mkpọrọ ahụ mechara kweta ka ọgbakọ dị nso n’ụlọ mkpọrọ ahụ wetara ya matras dị ezigbo ogologo, ya ejiri ya na-ehi ụra.

N’afọ 2008, Nwanna Görmez na ụmụnna atọ ọzọ gbara mba Tọki akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. N’akwụkwọ ha gbara, ha kwuru na mba Tọki na-emegbu ha emegbu maka na akọnuche ha ekweghị ha rụọ ọrụ soja. Na Jun 3, 2014, ụlọikpe ahụ biiri Ndịàmà Jehova anọ ahụ ikpe * ma gwa mba Tọki ka ha kwụọ ụmụnna ndị ahụ ego ha mefuru nakwa ego iti aka n’obi. Ihe a bụ nke ugboro atọ ụlọikpe ahụ biiri Ndịàmà Jehova ikpe n’ikpe ha na mba Tọki nwere, ya bụ, n’okwu gbasara ịrụ ọrụ soja. Ka ọ dị ugbu a, e nweghị Onyeàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ ná mba Tọki. Ma, okwu a agaghị ebi ruo mgbe mba Tọki kwetara ịhapụ ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ soja ka ha ṅụrụ mmiri tọgbọ iko.

Ikpe Ndị Anyị Kwuru Banyere Ha n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2014

Azebaịjan: Ndị uwe ojii ka na-abata n’ebe ụmụnna anyị na-amụ ihe akpaghasị ọmụmụ ihe ha. Ha ka na-enyocha ihe ndị e dere n’akwụkwọ ha, na-ejide ha mgbe ha na-ezi ozi ọma ma na-emegbu ha n’ụzọ ndị ọzọ. Gọọmenti ekwebeghị enyeghachi Ndịàmà Jehova ikike ka ha soro n’okpukpe ndị e nwere ná mba a. Ndịàmà Jehova agbaala mba Azebaịjan akwụkwọ ugboro iri na itoolu n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop n’ihi otu okwu a. Ma, Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ e wepụtara n’asụsụ Azebaịjani nakwa otú ndị nkwusa nọ ná mba a si na-amụba gosiri na Jehova na-agọzi ha.

Eritria: A ka na-akpagbu ụmụnna anyị. Ma, ha na-edi ya, jirikwa obi ha niile na-efe Jehova. Kemgbe Septemba 24, 1994, ụmụnna atọ aha ha bụ Paulos Eyassu, Isaac Mogos, na Negede Teklemariam ka nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ha anọọla ebe ahụ afọ iri abụọ. Mgbe a na-echeta Ọnwụ Jizọs n’Eprel 14, 2014, ndị ọchịchị nwụchiri ma Ndịàmà Jehova ma ndị ọzọ so ha bịa bụ́ ndị ruru ihe dị ka otu narị mmadụ na iri ise. Onye kacha bụrụ nwata n’ime ha dị otu afọ na ọnwa anọ, ebe onye kacha mee agadi n’ime ha dị afọ iri asatọ na ise. Mgbe e kwuru okwu ihu ọha pụrụ iche n’Eprel 27, 2014, ndị ọchịchị nwụchikwara ma Ndịàmà Jehova ma ndị ọzọ so ha bịa. Ha dị mmadụ iri atọ. Ma, a hapụla ọtụtụ n’ime ha.

Kazakstan: Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Gbasara Okpukpe ná mba a ekwetabeghị ka e webatawa ụzọ akwụkwọ iri na anọ Ndịàmà Jehova na-ebipụta ma ọ bụ ka e kesawa ha ná mba a. A naghịkwa ekwe ụmụnna anyị ka ha kọọrọ ndị ọzọ ihe ha kweere ọ gwụla ma hà nọ n’ebe gọọmenti nyere ha ikike ịna-ezukọ amụ ihe. A maakwala ihe dị ka ụmụnna iri ise ikpe maka na ha ziri ndị mmadụ ozi ọma bụ́ nke a sịrị na e nyeghị ha ikike ime. Mmadụ iri abụọ na isii agbaala mba a akwụkwọ n’aka Ngalaba Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Ndị Mmadụ ka ha mara ma à ga-ekwe ha fewe Chineke otú ha chọrọ.

^ para. 1 Ọ bụ mmadụ ga-ekpebiri onwe ya ma akọnuche ya ọ̀ ga-ekwe ya rụọrọ obodo ya ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ soja.

^ para. 1 Ọ bụ ụmụ nwoke ndị bụ́ ọgbọ ma ọ bụ uke na-abanyekarị n’òtù ebiri. Ha na-abụkarị ndị si n’otu obodo.

^ para. 2 Buldu and Others v. Turkey, No. 14017/08, June 3, 2014.