Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

NA-ECHENỤ NCHE!

Ọtụtụ Nde Mmadụ Esila Yukren Gbaa Ọsọ Ndụ

Ọtụtụ Nde Mmadụ Esila Yukren Gbaa Ọsọ Ndụ

 Rọshịa malitere ịlụso Yukren agha n’abalị 24 n’ọnwa Febụwarị afọ 2022. Agha a akpatala nnukwu nsogbu, nke mere ka ọtụtụ nde mmadụ si na Yukren gbaa ọsọ ndụ. a

 “A nọ na-atụ bọmbụ aghara aghara. Ụdị ụjọ bịara m abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. Mgbe anyị nụrụ na e nwere ụgbọ okporo ígwè na-eburu ndị chọrọ ịgbapụ, anyị kpebiri ịga banye na ya. Anyị hapụrụ ihe niile anyị nwe n’ihi na ihe onye ọ bụla ga-enwe ike iwere bụ naanị otu obere akpa. N’akpa ahụ ka anyị tinyere akwụkwọ ndị dị mkpa, ọgwụ, mmiri, na mgbadume. Anyị hapụrụ ihe niile ọzọ ma gaa n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè ka a nọ na-atụ bọmbụ aghara aghara.”​—Nataliia. O si n’obodo Kakiv, dị na Yukren.

 “Ruo mgbe agha a bidoro, o nweghị mgbe anyị chere na agha ga-ada. Anụrụ m ka bọmbụ na-ada n’ebe ụfọdụ n’obodo anyị bi. Windo anyị nọ na-ama jijiji. M kpebiri ịgbapụ, were naanị ihe ndị dị mkpa. M hapụrụ ụlọ n’elekere asatọ nke ụtụtụ, banye n’ụgbọ okporo ígwè gaa Liviv, banyezie bọs gaa Poland.”​—Nadija. O si n’obodo Kakiv, dị na Yukren.

Ihe ndị anyị ga-ekwu gbasara ha n’isiokwu a

 Gịnị kpatara ọsọ ndụ a ọtụtụ nde mmadụ gbara?

 Ihe mere ọtụtụ nde ndị bi na Yukren ji gbaa ọsọ ndụ bụ maka na ndị Rọshịa bidoro ịlụso ndị Yukren agha. Ma, Baịbụl mere ka a mata na e nwere ihe ndị ọzọ bụ́ isi na-eme ka ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ:

  •   Ọchịchị ndị mmadụ n’ụwa niile enwebeghị ike ịzụta ihe ndị mmadụ tụrụ ha n’ahịa. Ndị ọchịchị na-ejikarị ikike ha nwere emegbu ndị ọzọ.​—Ekliziastis 4:1; 8:9.

  •   Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu bụ “onye na-achị ụwa” a. Ọ na-eme ka ụmụ mmadụ na-eme ihe ọjọọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Ụwa niile dị n’aka ajọ onye ahụ.”​—Jọn 14:30; 1 Jọn 5:19.

  •   E wepụ nsogbu ndị na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala kemgbe ọtụtụ narị afọ, anyị bi ugbu a n’oge Baịbụl buru n’amụma. Ọ sịrị: “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1) Ihe ndị ọzọ a ga-eji amata oge ikpeazụ bụ agha, ọdachi ndị na-emere onwe ha, ụkọ nri, na ọrịa na-efe efe. Ihe ndị a so na-eme ka ndị mmadụ na-agba ọsọ ndụ.​—Luk 21:​10, 11.

 Olee ebe ndị gbara ọsọ ndụ ga-enweta olileanya?

 Baịbụl kwuru na Jehova, b bụ́ Onye kere anyị, bụ Chineke hụrụ ndị gbara ọsọ ndụ na ndị a chụpụrụ n’ụlọ ha n’anya. Ọ na-emetakwara ha ebere. (Diuterọnọmi 10:18) O kwere nkwa na ọ ga-eji ọchịchị ya dị n’eluigwe wepụ nsogbu ọ bụla gbasara ịgba ọsọ ndụ. Ihe Baịbụl kpọrọ ọchịchị ya ahụ bụ Alaeze Chineke. Chineke ga-eji ya dochie ọchịchị ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44; Matiu 6:10) Jehova ga-eji Alaeze ya wepụ Setan bụ́ Ekwensu. (Ndị Rom 16:20) Alaeze ahụ ga-achị ụwa niile, wepụkwa nkewa inwe mba dị iche iche kpatara. Mmadụ niile ga-abụzi otu ezinụlọ zuru ụwa ọnụ. E nweghịzi ihe ga-eme ka mmadụ si n’ụlọ ya gbapụ, n’ihi na Baịbụl kwere nkwa, sị: “Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ ala n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya. E nweghịkwa onye ga-emenye ha ụjọ, n’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuola ya.”​—Maịka 4:4.

 Ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-emeli ka ọsọ ndụ a ndị mmadụ na-agba taa kwụsị ruo mgbe ebighị ebi. Jehova ga-eji Alaeze ya wepụ nsogbu ndị na-eme ka ndị mmadụ gbaa ọsọ ndụ. Legodị ụfọdụ n’ime nsogbu ndị ahụ:

 Baịbụl ọ̀ ga-enyeliri ndị gbara ọsọ ndụ n’oge a aka?

 Ee. Ihe Baịbụl na-eme abụghị naanị ime ka ndị gbara ọsọ ndụ nwee ezigbo olileanya na ọdịnihu ga-aka mma, ọ na-enyekwara ha aka ịma ihe ha ga-eme ná nsogbu ndị na-abịara ha ugbu a.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Onye na-amaghị ihe na-ekweta ihe niile e kwuru, ma onye ma ihe na-echebara ihe ọ bụla ọ chọrọ ime echiche.”​—Ilu 14:15.

 Ihe ọ pụtara: Buru ụzọ chee ụdị nsogbu nwere ike ịbịara gị nakwa otú ị ga-esi chebe onwe gị. Kpachara anya maka ndị omekome na-achọ ịghọgbu ndị gbara ọsọ ndụ n’ihi na ha ma na ụjọ ji ndị a gbara ọsọ ndụ, nakwa na ha amabeghị ala.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Ihe oriri na uwe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.”​—1 Timoti 6:8.

 Ihe ọ pụtara: Ka uche gị ghara ịdị n’ihe gbasara akụnụba. Ọ bụrụ na ihe ndị dị mkpa i nwere eju gị afọ, obi ga na-adịkwu gị ụtọ.

 Ihe Baịbụl kwuru: “N’ihi ya, unu kwesịrị ịna-emere ndị mmadụ ihe niile unu chọrọ ka ha na-emere unu.”​—Matiu 7:12.

 Ihe ọ pụtara: Nwee ndidi na obiọma. Àgwà ndị a ga-eme ka ndị mmadụ na-akwanyere gị ùgwù, nabatakwa gị n’ebe ahụ ị gbagara.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.”​—Ndị Rom 12:17.

 Ihe ọ pụtara: Ekwela ka iwe mee ka i megwara ihe ọjọọ e mere gị. Ọ ga-eme ka ihe ka njọ.

 Ihe Baịbụl kwuru: “N’ihe niile, onye ahụ nke na-eme ka m dị ike na-enye m ike.”​—Ndị Filipaị 4:13.

 Ihe ọ pụtara: Mee ka ihe gbasara Chineke bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ gị. Na-ekpe ekpere. Chineke ga-eme ka i nwee ike idi nsogbu bịaara gị.

 Ihe Baịbụl kwuru: “Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu na echiche unu nche.”​—Ndị Filipaị 4:​6, 7.

 Ihe ọ pụtara: Rịọ Chineke ka o mee ka obi ruo gị ala n’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị. Gụọ isiokwu bụ́ “Philippians 4:​6, 7​—‘Do Not Be Anxious About Anything.’”

a Mgbe ndị Rọshịa bidoro ịlụso ndị Yukren agha, n’echi ya, Kọmishọna Ukwu nke Mba Ndị Dị n’Otu Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ (UNHCR) kwuru na nsogbu a abụghị obere ihe, na ọ bụ ihe gbata gbata kpụ ọkụ n’ọnụ. Naanị n’ime ụbọchị 12, ihe karịrị nde mmadụ abụọ si na Yukren gbaga ọsọ ndụ ná mba ndị dị ha nso. Ihe ruru otu nde ndị ọzọ sikwa n’ụlọ ha gbaga n’obodo ndị ọzọ dị na Yukren.

b Jehova bụ ezigbo aha Chineke. (Abụ Ọma 83:18) Gụọ isiokwu bụ́ “Ònye Bụ Jehova?