Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

E+/taseffski/via Getty Images (Stock photo. Posed by model.)

NA-ECHENỤ NCHE!

Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-eto Eto Isi Na-anaghịzi Akpakọcha Ọnụ Na-arị Elu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Ọnụ Ọgụgụ Ndị Na-eto Eto Isi Na-anaghịzi Akpakọcha Ọnụ Na-arị Elu—Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

 Na Mọnde, abalị iri na atọ n’ọnwa Febụwarị, 2023, Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa n’Amerịka kwuru okwu gbasara ahụ́ ike ndị na-eto eto nọ n’obodo ahụ. O kwuru na e kee ụmụ akwụkwọ niile nọ n’ụlọ akwụkwọ sekọndrị ụzọ abụọ, obi na-ajọkarị ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha njọ nakwa na ike ụwa agwụla ha.

 Onyeisi ngalaba na-ahụ maka ahụ́ ike ndị na-eto eto n’ụlọ ọrụ ahụ aha ya bụ Dr. Kathleen Ethier kwuru, sị: “Ọnụ ọgụgụ ndị na-eto eto isi na-anaghịzi akpakọcha ọnụ bịara na-arịzi elu kemgbe afọ iri gara aga. Ma, ọnụ ọgụgụ ụmụ agbọghọ isi na-anaghịzi akpakọcha ọnụ adịla nnọọ ọtụtụ otú ọ na-adịtụbeghị mbụ, ọtụtụ n’ime ha na-echekwa echiche igbu onwe ha.”

 Ụlọ ọrụ ahụ kwuru na:

  •   Ihe karịrị otu onye n’ime ụmụ agbọghọ iri ọ bụla kwuru na a manyere ha inwe mmekọahụ mgbe ha na-achọghị. Dr. Ethier kwuru, sị: “Ihe a na-awụ akpata oyi n’ahụ́. Ya bụ, n’ime ụmụ agbọghọ iri ọ bụla, e dinaala otu onye n’ime ha n’ike ma ọ dịkarịa ala.”

  •   Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na otu onye n’ime ụmụ agbọghọ atọ ọ bụla echesiela echiche ike igbu onwe ya.

  •   Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ na mmadụ atọ n’ime ụmụ agbọghọ ise ọ bụla kwuru na obi na-ajọ ha njọ mgbe niile nakwa na ike ụwa agwụla ha.

 Ọnụ ọgụgụ ndị a e kwuru na-agbawa obi. Oge mmadụ na-eto eto kwesịrị ịbụ oge ọ ga-eji na-aṅụrị ọṅụ ma na-ekpori ndụ. Gịnị ga-enyere ndị na-eto eto aka ka nsogbu ndị na-abịara ha ghara ime ka ike ụwa gwụ ha? Gịnị ka Baịbụl kwuru?

Baịbụl ga-enyeliri ndị na-eto eto ezigbo aka

 Baịbụl kwuru hoo haa na nsogbu ga-eju n’ụwa n’oge anyị a. Ọ sịrị na ọ bụ oge “ga-adị oké egwu, taakwa akpụ.” (2 Timoti 3:1-5) Ma, Baịbụl kwukwara ihe dị iche iche na-enyere ọtụtụ nde ndị na-eto eto aka n’ụwa niile n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara ha. Legodị isiokwu ụfọdụ ndị a si na Baịbụl.

 Ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ma ọ bụrụ na ha na-eche echiche igbu onwe ha

 Ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ma ọ bụrụ na obi na-ajọkarị ha njọ ma ọ bụ na ihe ọjọọ na-abatakarị ha n’obi

 Ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ma ọ bụrụ na a na-achọ ha okwu

 Ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ma ọ bụrụ na a na-amanye ha ịkwa iko ma ọ bụ na-egwusa ha egwuregwu iberiibe

Baịbụl kwuru ihe ndị nne na nna kwesịrị ịna-eme

 Baịbụl gwara ndị nne na nna otú ha ga-esi na-enyere ụmụ ha ndị na-eto eto aka ná nsogbu dị iche iche na-abịara ha. Legodị isiokwu ụfọdụ ndị a si na Baịbụl.