Gaa n'Isiokwu

Ụlọ Nche—E Nweghị Magazin Ọzọ Hụrụ Azụ ya Anya

Ụlọ Nche—E Nweghị Magazin Ọzọ Hụrụ Azụ ya Anya

Ọ bụ Ụlọ Nche bụ magazin a kacha ekesa n’ụwa niile. A na-ebipụta Ụlọ Nche nke ọnwa ọ bụla ihe karịrị nde iri anọ na abụọ. Magazin na-esote ya bụ Teta! A na-ebipụtakwa ya nde iri anọ na otu n’ọnwa ọ bụla. Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebipụta magazin abụọ a. A na-ekesakwa ha n’obodo dị narị abụọ na iri atọ na isii.

Oleekwanụ maka magazin ndị ọzọ ndị mmadụ na-ebipụta? Otu ụlọ ọrụ a na-akpọ The Association of Magazine Media kwuru na ọ bụ ụlọ ọrụ Amerịka a na-akpọ AARP na-ebipụta magazin a kacha ere n’Amerịka. Ndị e bu n’obi ebipụta ya bụ ndị gaferela afọ iri ise. A na-ekesa magazin a ihe karịrị nde iri abụọ na abụọ na narị puku anọ. A na-ekesa magazin ndị Jamanị a na-akpọ ADAC Motorwelt ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ nde iri na anọ. A na-ebipụtakwa magazin ndị Chaịna a na-akpọ Gushi Hui (nke kọrọ naanị akụkọ) nde ise na narị puku anọ.

A bịakwanụ n’akwụkwọ akụkọ, akwụkwọ akụkọ ndị Japan a na-akpọ Yomiuri Shimbun bụ ya ka a kacha ekesa. A na-ebipụta ya ihe karịrị nde iri.

Ọ bụkwa akwụkwọ Ndịàmà Jehova ka a kacha asụgharị. A na-asụgharị Ụlọ Nche n’ihe karịrị otu narị asụsụ na iri itoolu, na-asụgharịkwa Teta! n’ihe karịrị asụsụ iri asatọ. Ma, a na-ebipụta akwụkwọ a na-akpọ Reader’s Digest n’asụsụ iri abụọ na otu. Ihe a na-edekwa na nke e bipụtara n’otu obodo na-adị iche na nke e bipụtara n’obodo ọzọ.

Ụlọ Nche na Teta! adịghị ka magazin ndị ọzọ a kpọrọ aha ebe a n’ihi na ebe e si enweta ego e ji ebipụta ha bụ n’onyinye ndị mmadụ na-enye. Ihe ọzọ bụ na a naghị akpọsa ha na tiivi, n’Ịntanet, ma ọ bụ na redio. A naghịkwa ere ha ere.

Ihe mere e ji ebipụta Ụlọ Nche bụ ka e jiri ya kọwaa ihe dị na Baịbụl, nke ka nke, ihe Baịbụl kwuru gbasara Alaeze Chineke. A kwụsịtụbeghị ibipụta ya kemgbe afọ 1879 e bidoro ibipụta ya. Teta! na-ekwu gbasara ihe dị iche iche ndị mmadụ ma, dị ka ihe ndị e kere eke na ihe gbasara sayensị. Ihe mere o ji ekwu ha bụ ka ndị mmadụ nwee okwukwe n’ebe Onye kere ha nọ. Ọ na-ekwukwa otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi baara anyị uru ná ndụ.