Ole Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ?
Anyị si n’agbụrụ dị iche iche, na-asụkwa asụsụ dị iche iche. Ma, anyị niile na-ekwu otu ihe, na-emekwa otu ihe. Nke kachanụ bụ na anyị niile na-agba mbọ ime ihe Jehova chọrọ. Ọ bụ ya ka e dere uche ya na Baịbụl, ọ bụkwa ya kere ihe niile. Anyị na-agbalị ime otú Jizọs Kraịst mere, obi dịkwa anyị ụtọ na anyị bụ Ndị Kraịst. Onye ọ bụla n’ime anyị na-ewepụta oge ya na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl ma na-akọrọ ha gbasara Alaeze Chineke. A na-akpọ anyị Ndịàmà Jehova n’ihi na anyị na-akọrọ ndị mmadụ gbasara Jehova na Alaeze ya.
Leruo anya ebe a, ka ị hụ ihe ndị ọzọ anyị dewere. I nwere ike ịnọ ebe a gụọ Baịbụl. Ị ga-agụtakwa ihe ndị ga-enyere gị aka ịmatakwu ndị anyị bụ na ihe ndị anyị kweere.