Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE NDỊ E JI ONYINYE I NYERE EME

Ịsụgharị Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020

Ịsụgharị Usoro Ihe Omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020

Julaị 10, 2020

 N’ọnwa Julaị na Ọgọst afọ 2020, ụmụnna anyị n’ụwa niile ga-ekiri ihe omume mgbakọ ukwu anyị n’otu oge ahụ. Nke a bụ nke mbụ ya anyị na-enwekọ mgbakọ ukwu anyị ọnụ n’otu oge. Ka nke a wee kwe omume, a ga-asụgharị ma rekọdụọ ihe omume mgbakọ ukwu ahụ niile n’ihe karịrị narị asụsụ ise. Ụdị ọrụ a kwesịrị iwe otu afọ ma ọ bụ ihe karịrị ya tupu a rụchaa ihe niile dị na ya. Ma n’ihi nsogbu ọrịa koronavaịrọs kpatara, ndị na-asụgharị ihe omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020 enwerughị ihe ruru ọnwa anọ iji rụchaa ọrụ a.

 Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka na Ngalaba Na-azụtara Alaka Ụlọ Ọrụ Dị Iche Iche Ihe, bụ́ ngalaba abụọ dị n’Isi Ụlọ Ọrụ anyị, nyere nnọọ aka hụ na a rụchara ọrụ a buru ibu. Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka chọpụtara na ọtụtụ ndị nsụgharị enweghị maịkrofon ga-ezuru ha, ha ga-eji rekọdụọ ihe omume mgbakọ ahụ. Ọ dịkwa mkpa ka ha nwee maịkrofon ndị bụ́ ọkpọka ha ga-eji arụ ọrụ a. Ngalaba Na-azụtara Alaka Ụlọ Ọrụ Dị Iche Iche Ihe meziri atụmatụ ịzụta maịkrofon dị otu puku ma ziga ya n’ebe ndị a chọrọ ya n’ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị ebe abụọ.

 Ha zụkọrọ maịkrofon ndị ahụ ọnụ, ka ndị na-ere ya nwee ike iwetu ọnụ ego ya. A gwakwara ndị na-ere ya ka ha buga ha niile otu ebe. E sizi ebe ahụ e bugara ya kwadebe ha ma bugazie ha n’ebe ndị a chọrọ ha. Ebe ọ bụ na a zụtara ya ọtụtụ, ọnụ ego maịkrofon nke ọ bụla gbara ihe dị ka puku naịra iri isii na isii, ma e tinye ego e ji ziga ya ebe a chọrọ. Nke a mere ka enwee ihe dị ka puku naịra iri na atọ e sepụrụ n’isi maịkrofon nke ọ bụla karịa ihe a gaara eji azụta ya ma ọ bụrụ na a zụrụ ha otu otu.

 Ọ bụ n’ọnwa Eprel na Mee 2020, mgbe ahụ ọtụtụ ụlọ ahịa mechiri emechi n’ihi ọrịa koronavaịrọs ka Ngalaba Na-azụtara Alaka Ụlọ Ọrụ Dị Iche Iche Ihe zụtara ihe ndị a ma ziga ha ebe ndị a chọrọ ha. Ma ka ọ na-erula ná ngwụcha ọnwa Mee, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná ndị nsụgharị nọ n’ebe dị iche iche, ma n’ọfis ndị nsụgharị, ma n’alaka ụlọ ọrụ nakwa n’ebe ndị ọzọ, enwetala ngwá ọrụ ndị ahụ.

 Nwanna Jay Swinney, onye na-elekọta Ngalaba Na-azụtara Alaka Ụlọ Ọrụ Dị Iche Iche Ihe, sịrị: “Ngalaba dị iche iche na Betel na ndị na-ere ihe ndị a gbakọrọ nnọọ aka rụọ ọrụ a. Ọ bụ naanị mmụọ Jehova nwere ike ime ka ụdị ihe a kwe omume, ebe onye ọ bụla jikọrọ aka rụọ ọrụ a ngwa ngwa, a gharakwa imefu ego buru ibu iji kwadoo ọrụ alaeze.”

 Nwanna Nicholas Ahladis, onye na-arụ ná Ngalaba Ndị Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka, sịrị: “Ndị nsụgharị ndị nọ n’ebe e tiri iwu ònye apụla èzí n’oge ahụ nwere nnọọ obi ụtọ mgbe ha natara ngwá ọrụ ahụ. Ọ bụ eziokwu na ha na ndị nsụgharị ibe ha anọkọtaghị ọnụ, ha niile rụkọrọ ọrụ ka e nwee ike ịsụgharị ma rekọdụọ okwu niile, ihe nkiri niile na abụ ndị a ga-eji mee mgbakọ ahụ, bụ́ nke a ga-asụgharị n’ihe karịrị narị asụsụ ise.”

 Nke a so n’otu n’ime ọtụtụ ihe ndị ọzọ e mere iji hụ na e wepụtara ihe omume Mgbakọ Ukwu “Na-aṅụrịnụ Ọṅụ Mgbe Niile” nke Afọ 2020 maka ụmụnna anyị n’ụwa niile. Ọ bụ onyinye ndị unu si n’obi unu na-enye na donate.pr418.com nakwa n’ụzọ ndị ọzọ ka e si enweta ego e ji zụta ihe ndị ahụ dị mkpa e ji rụọ ọrụ.