Gaa n'Isiokwu

Si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Ụmụnne abụọ, Nwanna Eldor na Nwanna Sanjarbek Saburov

ỌGỌST 7, 2020
TỌKMENESTAN

Ụlọikpe Dị ná Mba Tọkmen Atụọ Ụmụnna Abụọ Bụ́ Eldor na Sanjarbek Saburov Mkpọrọ Afọ Abụọ

Ụlọikpe Dị ná Mba Tọkmen Atụọ Ụmụnna Abụọ Bụ́ Eldor na Sanjarbek Saburov Mkpọrọ Afọ Abụọ

N’abalị isii n’ọnwa Ọgọst, afọ 2020, otu ụlọikpe dị ná mba Tọkmen kwuru ka a tụọ Nwanna Eldor na Nwanna Sanjarbek Saburov mkpọrọ afọ abụọ n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha deba aha ha n’ọrụ agha. Ha bụ ụmụnne abụọ nne ji, otu gbara iri afọ abụọ na otu, onye nke ọzọ adịrị iri afọ abụọ na ise. Ụlọikpe ahụ ekweghị ka ụmụnna ahụ gbaa akwụkwọ ka e lebagharịa anya n’ikpe ahụ. Nke a bụ nke ugboro abụọ ya a na-ama ụmụnne abụọ a ikpe n’ihi na ha jụrụ ịrụ ọrụ agha.

N’afọ 2016, Nwanna Sanjarbek Saburov ji nwayọọ kọwaara ndị ọchịchị na ya agaghị edeba aha ya ịbụ onye agha. E ji maka nke a maa ya ikpe na ọ daala iwu ma kwuzie na kama ịtụ ya mkpọrọ, a ga e ji afọ abụọ lee àgwà ya ka a mara ma ọ̀ ga-ada iwu ọzọ.

N’afọ na-esonụ, Eldor, nwanne Sanjarbek nke nta, jụkwara ịba ọrụ agha. Ha jikwa maka nke a maa ya ikpe ma gwa ya ka ọ gaa rụwa ọrụ n’ebe a na-edebe ndị dara iwu, ma ọ bụ ndị ọchịchị na-ewere otu ụzọ n’ụzọ ise nke ego a na-akwụ ya n’ọrụ ahụ.

Iwu mba Tọkmen kwuru na ọ bụrụ na mmadụ jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ya anabataghị ya, e nwere ike ịma onye ahụ ikpe ka onye omekome nke ugboro abụọ ya ma ọ bụrụ na onye ahụ ka nọkwa na-ajụ ịga ọrụ agha. N’ọnwa Eprel afọ 2020, ọfis na-ahụ maka ideba aha ndị mmadụ n’ọrụ agha gwakwara ụmụnne abụọ a ka ha bịa deba aha ha n’ọrụ agha. Ha abụọ jụrụ. E kpere ha ikpe ozugbo ma kpebie na ha dara iwu, nke mere ka a tụọ ha mkpọrọ.

E wezụga mwute mkpọrọ a a tụrụ ụmụnne abụọ a na-ewute ndị mụrụ ha, nsogbu ọzọ bụ na mkpọrọ a ga-eme ka ndị mụrụ ha taa ahụhụ gabiga ókè. Papa ha na-arịa ọrịa azụ mgbu nke na-anaghị ekwe ya rụọ ọrụ. Ọ bụ ụmụ ya nwoke abụọ a na-akpa afọ ezinụlọ ha. Ha na-akọ ogho. Ugbu a a tụrụ ha mkpọrọ, ndị mụrụ ha agaghịzi enwe onye na-akpata ego ha ga-eji na-egbo mkpa ha. Kama, ọ ga-abụzi ndị mụrụ ha ga na-elekọta ụmụ ha n’ụlọ mkpọrọ.

Mba Tọkmenestan anaghị ekwe ka mmadụ rụọ ọrụ ọzọ ma ọ bụrụ na ọ chọghị ịrụ ọrụ agha. Nke a emeekwala ka a na-atụ ụmụnna anyị ndị nwoke ka na-eto eto mkpọrọ si n’otu afọ ruo afọ anọ n’ihi na ha jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ha ekweghị ha mee ya. E wezụga ụmụnne abụọ a, e nwere Ndịàmà Jehova iri ndị ọzọ ka na-eto eto nọ n’ụlọ mkpọrọ ndị dị na Tọkmenestan n’ihi na ha jụrụ ịrụ ọrụ agha.

Obi siri anyị ike na Jehova ga-agozi ụmụnna anyị ndị a nọ na Tọkmenestan n’ihi otú ha si nwee obi ike ime ihe dị mma. Ka anyị niile na-echeta ihe Jehova gwara Eze Esa: “Unu onwe unu, nweenụ obi ike, unu enwela nkụda aka, n’ihi na unu ga-enweta ụgwọ ọrụ maka ọrụ unu.”​—⁠2 Ihe E Mere 15:⁠7.