Ole Ndị Ka Ndịàmà Jehova Bụ?
Anyị si n’agbụrụ dị iche iche, na-asụkwa asụsụ dị iche iche. Ma anyị dị n’otu n’ihi na anyị na-eme otu ihe. Ihe anyị na-eme karịchaa bụ ịsọpụrụ Jehova, bụ́ Chineke e kwuru gbasara ya na Baịbụl nakwa Onye kere ihe niile. Anyị na-eme ike anyị niile ime ka Jizọs Kraịst. Obi dịkwa anyị ụtọ na anyị bụ Ndị Kraịst. Onye ọ bụla n’ime anyị na-ewepụta oge na-akụziri ndị mmadụ gbasara Baịbụl na Alaeze Chineke. Ebe ọ bụ na anyị na-agbara Jehova Chineke àmà ma ọ bụ na-agwa ndị mmadụ gbasara ya na Alaeze ya, a na-akpọ anyị Ndịàmà Jehova.
Gaa ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet. Nọrọ n’Ịntanet gụọ Baịbụl. Matakwuo gbasara anyị na ihe ndị anyị kweere.