Gaa n'Isiokwu

NỌVEMBA 5, 2013
Armenia

Gọọmenti Aminia Ewepụtala Ọrụ Ọzọ Maka Ndị Akọnuche Ha Na-ekweghị Ha Rụọ Ọrụ Agha

Gọọmenti Aminia Ewepụtala Ọrụ Ọzọ Maka Ndị Akọnuche Ha Na-ekweghị Ha Rụọ Ọrụ Agha

Ọ dị ka gọọmenti Aminia emechaala kweta na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, Ụlọ Ọrụ Aminia Na-ahụ Maka Inye Ndị Na-achọghị Ịrụ Ọrụ Agha Ọrụ Ọzọ nyere Ndịàmà Jehova iri ise na otu ọrụ ọzọ ha ga-arụwa. Ma, ọ ka fọrọ Ndịàmà Jehova karịrị iri atọ na itoolu ha ka ga-eleba anya n’akwụkwọ ha tinyere ka e nye ha ọrụ ọzọ. Ụlọ ọrụ a gakwara n’ụlọ mkpọrọ dị n’Erebuni nye Ndịàmà Jehova isii nọ ebe ahụ ọrụ ọzọ ha ga-arụwa, ya afọzie Ndịàmà Jehova iri na anọ n’ebe ahụ. A hapụrụ mmadụ isii ahụ e nyere ọrụ ọzọ n’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2013. Ụlọ ọrụ a ka ga-eleba anya n’akwụkwọ Ndịàmà Jehova iri na anọ ahụ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ tinyere ka e nye ha ọrụ ọzọ. A na-atụkwa anya na a ga-akpọpụta ha n’ụlọ mkpọrọ ma nye ha ọrụ ọzọ.

Ihe Ọhụrụ

Ihe a niile bidoro n’abalị asatọ n’ọnwa Jun afọ 2013 mgbe gọọmenti Aminia degharịrị iwu obodo ha ka ọ daba n’ihe mba ndị ọzọ dị na Yurop kpebiri gbasara mmadụ ịrụ ọrụ na-abụghị ọrụ agha. N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị afọ ahụ, ha tikwara iwu gbasara otú a ga na-esi enye ndị mmadụ ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ agha. Onyeisi ala Aminia kwutere okwu iwu a ha degharịrị mgbe ọ na-ekwu okwu ná Nzukọ Ndị Omeiwu nke Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop nke e nwere n’abalị abụọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2013. Ọ sịrị: “Anyị ekwesịghị iwere ya na ndị akọnuche ha na-ekweghị ha rụọ ọrụ agha bụ ndị omempụ.” N’abalị atọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, gọọmenti Aminia tiri iwu kwuru na e wepụla ọnwa isii n’oge ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha na-anọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ihi iwu ọhụrụ a, a hapụziri Ndịàmà Jehova asatọ na-agaghịzi anọru ọnwa isii n’ụlọ mkpọrọ ka ha laa n’abalị asatọ nakwa n’abalị itoolu n’ọnwa Ọktoba afọ 2013.

Ọrụ ọzọ a a na-enye ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ agha emeela ka ndị a na-arụ ọrụ ga-abara ọhaneze uru nke na-agaghịkwa enye akọnuche ha e ji Baịbụl zụọ nsogbu. Ọ bụghị ndị agha Aminia na-ahụ maka ọrụ nke a, kama ọ bụ ndị nkịtị. A sịrị na ndị na-achọghị ịrụ ọrụ agha ga-eji afọ atọ rụọrọ obodo ha ọrụ ọzọ. Ha ga na-eji awa iri anọ na asatọ arụ ọrụ kwa izu, a ga na-enyekwa ha abalị iri iji zuo ike n’afọ ọ bụla. A ga-enye ha ọrụ n’ebe dị nso n’ụlọ ha. Ihe ha ga na-arụ agaghịkwa abụ ihe gbasara agha.

Ihe Mere Ndị Aminia Ji Degharịa Iwu Ha

Mgbe mba Aminia sonyeere Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop n’afọ 2001, o kwetara na ya ga-eme ihe a gwara mba ndị batara ọhụrụ n’òtù ahụ ka ha mee, ya bụ, ka ha tie iwu na ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ agha nwere ike ịrụ ọrụ ọzọ, nakwa na ha ga-akpọpụta ndị niile a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha. N’agbanyeghị na gọọmenti Aminia bịanyere aka na ha ga-eme ihe a e kwuru, ha akwụsịghị ịkpụpụ ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova n’ụlọikpe, ha akwụsịghịkwa ịtụ ha mkpọrọ.

N’ime afọ iri abụọ gara aga, ihe karịrị narị Ndịàmà Jehova anọ na iri ise agaala mkpọrọ, nọteekwa aka ebe ahụ. A na-emesikarịkwa ha ike n’ụlọ mkpọrọ.

Mgbe e bidoro inye ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha ọrụ ọzọ n’abalị mbụ n’ọnwa Julaị afọ 2004, ndị a na-ekweghị arụ ọrụ agha nwere obi ụtọ na ihe akawala mma. Ma kemgbe e bidoro nyewe ha ọrụ ndị ahụ, ha chọpụtara na ọ ka bụkwa ndị agha na-ahụ maka ya, nakwa na a na-enye ha ọrụ ndị ahụ iji taa ha ahụhụ. Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop gwara gọọmenti Aminia ugboro ugboro na otú ha si eme nke ha abụghị otú mba ndị dị na Yurop kwekọrịtara ka e si na-eme ya. Dị ka ihe atụ, ná Mkpebi nke 1532 (2007), Nzukọ Ndị Omeiwu nke Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop kwuru na “ọ na-ewute ha na n’ihi enweghị ọrụ bụ́ ọrụ nkịtị n’eziokwu, a ka na-atụ ọtụtụ ndị mkpọrọ n’ihi na ha họọrọ ịga mkpọrọ kama ịrụ ọrụ na-abụghị ọrụ nkịtị n’eziokwu. Ihe ka ọtụtụ ná ndị a a na-atụ mkpọrọ bụkwanụ Ndịàmà Jehova.”

Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ kwukwara na ọ na-ewute ha na gọọmenti Aminia ka na-atụ Ndịàmà Jehova na-ekweghị arụ ọrụ agha mkpọrọ. Mgbe kọmitii a na-ekwu okwu mmechi gbasara ihe ndị ha chọpụtara mgbe ha nwere nnọkọ ha nke otu narị na ise n’afọ 2012, o kwuru, sị:

“Gọọmenti kwesịrị ịhụ na e nwere ezigbo ọrụ nkịtị e ji dochie ọrụ agha, nke bụkwanụ ọrụ nkịtị n’eziokwu, nke onye ọ bụla akọnuche ya na-ekweghị ya rụọ ọrụ agha ga-arụ, nke na-agaghịkwa abụ iji mesie mmadụ ike, iji megbuo mmadụ, nke mmadụ na-agaghị arụfe oge o kwesịrị ịrụru ya, nakwa nke na-agaghị efu mmadụ oké ego. Gọọmenti kwesịkwara ịhapụ ndị niile a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha nakwa ndị a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ a dị adị a sị na e ji dochie ọrụ agha.”

Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop Emeela Ka E Kurutụ Ume Ndụ

Ebe ọ bụ na ụlọikpe ndị e nwere n’Aminia enweghị ihe ha mere gbasara ikpe a mara Vahan Bayatyan na ụmụ okorobịa abụọ ọzọ bụkwa Ndịàmà Jehova, ha gbara gọọmenti Aminia akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop. Ihe gbanwere n’abalị asaa n’ọnwa Julaị afọ 2011, mgbe Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Yurop kpelaara Maazị Bayatyan ikpe. Nke ahụ bụ nke mbụ Ụlọikpe Yurop na-ekwu na ihe dị n’Ihe Ndị Yurop Kwekọrịtara na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ gosiri na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. Kemgbe e kpechara ikpe Maazị Bayatyan, e nweekwala ikpe anọ ọzọ Ụlọikpe Yurop kpere nke gosiri na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. a

Gọọmenti Aminia ekwetaghị ihe a Òtù Ikpe Kacha Elu kpebiri n’ikpe ha na Bayatyan. Ha kpụpụkwara Ndịàmà Jehova iri abụọ na itoolu na-ekweghị arụ ọrụ agha ụlọikpe ma tụọ mmadụ iri abụọ na atọ n’ime ha mkpọrọ. Malite n’ọnwa Julaị afọ 2011 ruo n’ọnwa Ọktoba afọ 2013, a tụrụ ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova iri asatọ na isii mkpọrọ n’Aminia. A gbakọta oge ha niile jirila nọọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ karịala otu narị afọ na iri afọ isii na asatọ. Ụfọdụ n’ime ụmụ okorobịa ndị a agbaala gọọmenti Aminia akwụkwọ n’Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop tụkwasị ná ndị nke a gbaburu gọọmenti Aminia, iji gosi na mkpọrọ na-ezighị ezi a tụrụ ha adịghị ha mma.

Ihe Ndị Ọzọ Fọrọnụ

Ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha nọcharala oge mkpọrọ ha nakwa ndị nke ahụ a kpọpụtara n’ụlọ mkpọrọ n’ọnwa Ọktoba afọ 2013 na-atụ anya na a ga-ewepụ aha ha n’aha ndị omekome. Ọ bụ ihe a ka gọọmenti Aminia kwuru n’iwu ha dezigharịrị n’oge na-adịbeghị anya gbasara ndị omekome. Ihe ọzọ bụ ma gọọmenti Aminia ọ̀ ga-akwụ ndị a tụrụ mkpọrọ kemgbe e kpechara ikpe Bayatyan ụgwọ iji tie ha aka n’obi.

Gọọmenti Aminia emewebeghị ihe niile ha kwuru n’iwu ahụ ha degharịrị gbasara mmadụ ịrụ ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ agha. Ma, ihe ndị na-emenụ gosiri na ha ekwetawala na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya.

Ihe Ndị Merenụ Tupu E Mechaa Kweta Inye Ndị Jụrụ Ịrụ Ọrụ Agha Ọrụ Ọzọ

Afọ

Ihe Merenụ

2001

Gọọmenti Aminia sonyeere Òtù Na-ahụ Maka Udo na Yurop, a gwakwara ha ka mee iwu ka a na-enye ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha ọrụ ọzọ dị ha mma

2004

Gọọmenti Aminia mere iwu ka a na-enye ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha ọrụ ọzọ, ma ọ ka bụkwa ndị agha na-ahụ maka ọrụ a. N’ihi ya, Ndịàmà Jehova ekweghị arụ ya

2006

E denyere ahụhụ a ga-ata ndị jụrụ ịrụ ọrụ ọzọ n’iwu ahụ. Ma, ha emebeghị ọrụ a ka ọ bụrụ ezigbo ọrụ nkịtị Ndịàmà Jehova ga-arụ

2011

Mmadụ iri na asaa so n’Òtù Ikpe Kacha Elu nke Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop lebara anya n’ikpe Bayatyan na gọọmenti Aminia. Mmadụ iri na isii n’ime ha kpelaara Bayatyan. Òtù ikpe a mara gọọmenti Aminia ikpe maka ịtụ Bayatyan mkpọrọ maka na akọnuche ya ekweghị ya rụọ ọrụ agha. Ihe a òtù ikpe a mere gosiri na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya ekweghị ya

2012

Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop makwara gọọmenti Aminia ikpe n’ikpe abụọ ọzọ ha kpere gbasara mmadụ ịjụ ịrụ ọrụ agha. Ikpe abụọ ahụ bụ ikpe Bukharatyan na gọọmenti Aminia na ikpe Tsaturyan na gọọmenti Aminia

2013

N’abalị asatọ n’ọnwa Jun, e degharịkwuru ihe n’iwu ahụ. N’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị, ha tikwara iwu gbasara otú a ga na-esi enye ndị mmadụ ọrụ bụ́ ọrụ nkịtị n’eziokwu

N’abalị asatọ na n’abalị itoolu n’ọnwa Ọktoba, gọọmenti Aminia hapụrụ mmadụ asatọ a tụrụ mkpọrọ maka na akọnuche ha ekweghị ha rụọ ọrụ agha

N’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Ọktoba, Ụlọ Ọrụ Aminia Na-ahụ Maka Inye Ndị Na-achọghị Ịrụ Ọrụ Agha Ọrụ Ọzọ nabatara akwụkwọ Ndịàmà Jehova iri ise na asaa tinyere ma nye ha ọrụ ọzọ na-abụghị ọrụ agha. Mmadụ isii n’ime ndị a e nyere ọrụ ọzọ so ná Ndịàmà Jehova iri abụọ nọ n’ụlọ mkpọrọ n’Aminia

N’abalị iri abụọ na anọ n’ọnwa Ọktoba, gọọmenti Aminia tọhapụrụ Ndịàmà Jehova isii nọ n’ụlọ mkpọrọ dị n’Erebuni

a Gụọ ihe e dere na Erçep v. Turkey, no. 43965/04, 22 Nọvemba 2011; Bukharatyan v. Armenia, no. 37819/03, 10 Jenụwarị 2012; Tsaturyan v. Armenia, no. 37821/03, 10 Jenụwarị 2012; Feti Demirtaş v. Turkey, no. 5260/07, 17 Jenụwarị 2012.