ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọgọst 2013

Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi na-adị nsọ ma na-arụ ọrụ Chineke, otú anyị ga-esi zere ịta Chineke ụta maka nsogbu anyị, na ihe ga-eme ka anyị ghara ịda mbà n’obi.

E Doro Unu Nsọ

Tụlee ihe anọ ga-enyere anyị aka ịdị nsọ n’anya Chineke ma na-ejere ya ozi.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ dị mma ka nwatakịrị a chụrụ n’ọgbakọ na ndị mụrụ ya bụ́ Ndịàmà Jehova nọrọ ma a gaa ọmụmụ ihe?

AKỤKỌ NDỤ

Jehova ‘Na-eburu M Ibu M Kwa Ụbọchị’

Gịnị nyeere otu nwanna nwaanyị bụ́ onye Namibia aka iji obi ụtọ na-asụ ụzọ kemgbe ihe karịrị iri afọ abụọ n’agbanyeghị ọrịa ọ na-arịa?

‘Ewesola Jehova Oké Iwe’

Ụfọdụ ndị na-eweso Chineke iwe. Ha na-ata ya ụta maka nsogbu ha. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị ghara ime ụdị ihe a?

Ndị Nne na Nna, Malitenụ Mgbe Nwa Unu Bụ Nwa Ọhụrụ Kụziwere Ya Okwu Chineke

Olee mgbe ga-akacha mma ka ndị nne na nna malite ịkụziri ụmụ ha ihe? Oleekwa ihe ndị ha kwesịrị ịna-akụziri ha?

Ka Anyị Na-echebara Ibe Anyị Echiche, Na-agbarịtakwa Ibe Anyị Ume

Olee otú anyị ga-esi enyere ibe anyị aka ịna-ejere Chineke ozi ọ bụrụgodị na anyị nwere nsogbu?

Chebara Ụdị Mmadụ I Kwesịrị Ịbụ Echiche

Setan achọghị ka anyị na Chineke dịrị ná mma. Gịnị ka anyị ga-eme ka anyị na Jehova nwee ike ịna-adị ná mma?

Ị̀ Na-ahụ Ụgbọ Ịnyịnya Na-acha Ọkụ Ọkụ Ịlaịsha Hụrụ?

Ịlaịsha nwere okwukwe siri ike na Jehova ma tụkwasị ya obi ya niile. Gịnị ka anyị ga-amụta n’ihe ahụ o mere?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

Obi Tọrọ Eze Ezigbo Ụtọ

Gụọ otú eze ndị Swaziland si gosi na obi dị ya ụtọ maka eziokwu Baịbụl ọ mụtara.