ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2013

Ụlọ Nche a kwuru otú anyị ga-esi na-eme mkpebi ziri ezi, mee ka anyị na Jehova Chineke dịkwuo ná mma, na otú ihe Jehova na-echetara anyị ga-esi baara anyị uru.

Otú Ihe Abụọ Dị Iche Nwere Ike Isi Baara Gị Uru

Jizọs na-eji ihe abụọ dị iche akụzi ihe. Mụta otú i nwere ike isi jiri ihe abụọ dị iche kụziere ndị mmadụ Baịbụl.

Anyị Kwesịrị Ịtụkwasị Ihe Jehova Na-echetara Anyị Obi

Kemgbe ụwa, otú Jehova si eduzi ndị ya bụ ichetara ha ihe. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ihe Chineke na-echetara anyị ga-abara anyị uru?

Mee Ka Ihe Jehova Na-echetara Anyị Na-eme Gị Obi Ụtọ

Obi ọ̀ na-adị gị ụtọ irubere Jehova isi, ka ị̀ na-eche mgbe ụfọdụ na ị gaghị edebeli iwu Chineke? Gịnị ga-enyere anyị aka ịna-eme ihe Jehova na-echetara anyị?

Ị̀ Gbanweela?

Gịnị mere Ndị Kraịst niile ji kwesị ‘ịgbanwe’? Olee ihe anyị kwesịrị ịgbanwe, oleekwa otú anyị nwere ike isi gbanwee?

Na-eme Mkpebi Ziri Ezi

Olee otú anyị ga-esi na-eme mkpebi otú Chineke chọrọ? Gịnị ga-enyere anyị aka ime ihe anyị kpebiri?

Ịsụ Ụzọ Na-eme Ka Anyị na Chineke Dịkwuo ná Mma

Tụlee ụzọ asatọ ịsụ ụzọ nwere ike isi mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma. Gịnị ga-enyere gị aka ịnọsi ike n’ozi gị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Jọn 11:35 kwuru na anya mmiri gbara Jizọs tupu ya akpọlite Lazarọs n’ọnwụ. Gịnị mere anya mmiri ji gbaa ya?