ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jenụwarị 2014

Ụlọ Nche a ga-eme ka a ghọta na Jehova bụ Eze kemgbe ụwa. Ọ ga-emekwa ka anyị ghọtakwuo ihe Alaeze Mesaya bụ nakwa ihe ndị o merela.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji si Yurop kwaga n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka? Oleekwa uru ha ritere?

Fee Jehova, Bụ́ Eze Mgbe Ebighị Ebi

Ọ bụrụ na ị mụta otú Jehova si gosi na ya bụ Nna na Eze, gị na ya ga-adịkwu ná mma.

Olee Uru Otu Narị Afọ Jizọs Chịrịla Baara Gị?

Olee otú anyị ga-esi rite uru n’ọchịchị Jizọs? Tụlee otú Jizọs si mee ka ndị ohu Chineke nọ n’ụwa dị ọcha, na-akụziri ha ihe, haziekwa ha.

Mee Mkpebi Ziri Ezi Ugbu A Ị Na-eto Eto

Obi dị ọtụtụ Ndị Kraịst bụ́ ndị na-eto eto ụtọ iso na-enyere ndị ọzọ aka. Olee otú ị ga-esi jiri obi ụtọ na-ejekwuru Jehova ozi?

Ijere Jehova Ozi Tupu Oge Ọdachi Erute

Olee otú ụmụnna merela agadi nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi?

Olee Mgbe ‘Alaeze Chineke Ga-abịa’?

Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ọ gaghị adị anya Eze Chineke tere mmanụ emee ihe ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa?

Mkpebi M Mere Mgbe M Bụ Nwatakịrị

Otu nwatakịrị nwoke si Kolọmbọs, Ohayo, dị n’Amerịka kpebiri ịmụ asụsụ Kambodian. N’ihi gịnị? Olee otú ihe a o mere si mechaa baara ya uru?