ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mach 2014

Ị ga-ahụ ihe ị ga-eme ka ị ghara ịna-achọ naanị ọdịmma onwe gị na otú ị ga-esi jiri obi ụtọ na-ejere Jehova ozi. Olee otú anyị ga-esi na-elekọta ndị agadi?

Otú Ị Ga-esi Nweta Obi Ndị Ikwu Gị Na-abụghị Ndịàmà Jehova

Olee ihe anyị ga-amụta n’otú Jizọs si mesoo ndị ikwu ya? Olee otú anyị ga-esi kọọrọ ndị ikwu anyị na-ekpe okpukpe ọzọ ma ọ bụdị ndị na-enweghị nke ha na-ekpe ihe anyị kweere?

Ihe Ị Ga-eme Ka Ị Ghara Ịna-achọ Naanị Ọdịmma Onwe Gị

E nwere onye iro nwere ike iji nke nta nke nta mee ka anyị chọwa naanị ọdịmma onwe anyị. Anyị ga-amata onye ọ bụ na otú anyị ga-esi jiri Baịbụl merie ya.

Otú Anyị Ga-esi Jiri Obi Ụtọ Na-ejere Jehova Ozi

Gịnị mere ọtụtụ ndị ji eche na ha abaghị uru? Isiokwu a ga-egosi otú Baịbụl nwere ike isi nyere anyị aka iji obi ụtọ na-ejere Jehova ozi.

Ofufe Ezinụlọ—Ì Nwere Ike Ime Ka Ọ Na-atọkwu Unu Ụtọ?

Leba anya n’otú ezinụlọ ụfọdụ si enwe ya ná mba dị iche iche ma mara ihe i nwere ike ime.

Na-asọpụrụ Ndị Agadi Nọ n’Ọgbakọ

Mara otú Chineke si ele ndị agadi anya. Gịnị ka Ndị Kraịst kwesịrị imere ndị mụrụ ha mere agadi? Olee otú ọgbakọ ga-esi gosi na ha na-asọpụrụ ụmụnna mere agadi?

Otú A Ga-esi Na-elekọta Ndị Agadi

Ndị agadi na ụmụ ha nwere ike ikwurịta otú a ga-esi elekọta ha ma kpebie ihe a ga-eme tupu ha enwee nsogbu ha na nká na-eso. Gịnị ka e nwere ike imere ha?

Okwu Gị Ọ̀ Bụ “Ee ma Bụrụ Ee e”?

Ezi Ndị Kraịst kwesịrị imezu nkwa ha, ee ha ekwesịghị ịbụ ee e. Ọ́ bụrụkwanụ na e nwere mgbe anyị ga-akagbu ihe anyị bu n’obi ime? Mụta ihe n’ihe Pọl onyeozi mere.