Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỤLỌ NCHE Nke 4 n'Afọ 2016 | Olee Otú Baịbụl Si Dịgide?

OLEE IHE I CHERE?

Ebe Baịbụl bụ Okwu Chineke, í cheghị na mbọ ọ bụla a gbara ka ọ ghara ịdịgide ga-akụ afọ n’ala?

Baịbụl n’onwe ya kwuru, sị: “Ahịhịa ndụ akpọnwụwo, okooko ya achanwụwo; ma okwu Chineke anyị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.”Aịzaya 40:8.

Isiokwu ndị kọwara isiokwu Ụlọ Nche a kwuru otú Baịbụl si dịrị ruo taa n’agbanyeghị mbọ a gbarala ka ọ ghara ịdịgide.

 

ISIOKWU TETA! A

Akụkọ Dị́ Ezigbo Mkpa

N’akwụkwọ niile dịterela aka ka Baịbụl, o nweghị nke ọtụtụ ndị ka kweere ihe o kwuru otú ha si kwere n’ihe Baịbụl kwuru. Ma, Baịbụl ọ̀ gbanweela?

ISIOKWU TETA! A

Otú Baịbụl Si Ghara Irekasị

Ndị mbụ dere Baịbụl na ndị ji aka depụtaghachi ya n’oge ochie ji papaịrọs na akpụkpọ anụ e ji ede ihe dee ha. Olee otú ihe ndị a si dịgide?

ISIOKWU TETA! A

Baịbụl Dịgidere n’Agbanyeghị na A Gbara Mbọ Ibibi Ya

Mbọ niile ọtụtụ ndị ọchịchị na ndị isi okpukpe gbara ka ndị mmadụ ghara inweta Baịbụl, ibipụta ya ma ọ bụ ịsụgharị ya kụrụ afọ n’ala.

ISIOKWU TETA! A

Mbọ A Gbara Ịgbanwe Ihe Dị na Baịbụl Kụrụ Afọ n’Ala

Ụfọdụ ndị eziokwu na-agba agba ná ntị anwaala ịgbanwe ihe dị na Baịbụl. Olee otú mbọ niile ha gbara si kụọ afọ n’ala?

ISIOKWU TETA! A

Ihe Mere Baịbụl Ji Dịgide

Gịnị mere Baịbụl ji dị iche n’akwụkwọ ọ bụla ọzọ?

Ị̀ Maara?

Gịnị pụrụ iche n’otú Jizọs si meso ndị ekpenta? Olee ihe ndị isi okpukpe ndị Juu na-eji maka ya ekweta ka a gbaa alụkwaghịm?

Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?

E nweela ndị tigbuo zọgbuo e nyeere aka ha agbanwee. Gụọ ihe a ka ị mata ihe mere ha ji kpebie ịgbanwe ndụ ha kpamkpam.

BAỊBỤL NA-AGBANWE NDỤ NDỊ MMADỤ

Mbọ M Gbara Ibi Ndụ Dị Mma Kụrụ Afọ n’Ala Ọtụtụ Ugboro

Gụọ ihe a ka ị mata ihe nyeere Josef aka ịkwụsị ile ndị gba ọtọ, obi eruwezie ya ala.

Ihe Kacha Mkpa I Kwesịrị Ịchọpụta

Ihe chọọchị ndị sị na ha bụ Ndị Kraịst kweere dị iche iche. Jiri Baịbụl chọpụta ma ihe ndị chọọchị unu na-akụzi hà bụ eziokwu.

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?

Chineke ọ̀ malitere okpukpe iji mee ka ndị mmadụ bịaruo ya nso?

Ihe Ndị Ọzọ Anyị Nwere

Baịbụl Ọ̀ Bụ Okwu Chineke?

Ọtụtụ ndị dere Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke gwara ha ihe ha dere. Gịnị mere ha ji kwuo otú ahụ?