ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Julaị 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọgọst 28 ruo Septemba 24, 2017.

Ha Ji Obi Ha Wepụta Onwe Ha na Tọki

N’afọ 2014, e kwusara ozi ọma pụrụ iche na Tọki. Gịnị mere e ji hazie ya? Olee uru ọ bara?

Na-achọ Ezigbo Akụ̀

Olee otú ị ga-esi jiri ihe ndị i nwere mee ka gị na Jehova dịkwuo ná mma?

“Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”

Olee otú onye na-eru uju ga-esi kara obi? Olee otú ị ga-esi nyere ya aka?

Gịnị Mere Ị Ga-eji ‘Too Jaa’?

Abụ Ọma nke 147 kwuru ọtụtụ ihe mere anyị ji kwesị ịna-ekele Onye kere anyị.

‘Ka O Mezuo Ebumnobi Gị Niile’

Ndị na-eto eto kwesịrị ikpebi ihe ha ga-eji ndụ ha niile mee. Ọ na-atụ ụjọ, ma Jehova ga-agọzi ndị na-ege ntị ná ndụmọdụ ya.

Otú Ị Ga-esi Emeri n’Ọgụ A Na-alụso Uche Gị

Setan ji ụgha na-alụso gị ọgụ. Gịnị ka ị ga-eme ka ọ ghara iji ya nweta gị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onye Kraịst ò kwesịrị inwe ụdị égbè ọ bụla ọ ga-eji na-echebe onwe ya maka ndị ọjọọ?