ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Disemba 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Jenụwarị 29 ruo Febụwarị 25, 2018.

“Amaara M na Ọ Ga-ebili”

Olee otú obi nwere ike isi sie anyị ike na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ?

‘Enwere M Olileanya n’Ebe Chineke Nọ’

Gịnị mere mbilite n’ọnwụ ji bụrụ ozizi gbara ọkpụkpụrụ Ndị Kraịst kweere?

Ì Chetara?

Ì wetuola obi gụọ Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Legodị ma ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a e nwere ike iji Baịbụl zaa.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’Izrel oge ochie, ọ̀ bụ iwu na ọ bụ onye e nyere ihe ruuru ọkpara ka a ga-esi n’ezinụlọ ya mụta Mesaya?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ndị Kraịst lụrụ di na nwunye hà nwere ike ikpebi iji ihe a na-akpọ IUD gbochie afọ ime?

Ndị Nne na Nna, Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha “Mara Ihe Iji Nweta Nzọpụta”

Ọtụtụ ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst na-echegbu onwe ha mgbe nwa ha chọrọ inyefe Jehova onwe ya, e meekwa ya baptizim. Olee otú ha nwere ike isi nyere ụmụ ha aka ka a zọpụta ha?

Ndị Na-eto Eto, ‘Na-emenụ Ihe Ga-ewetara Unu Nzọpụta’

Baptizim dị ezigbo mkpa, ma ndị na-eto eto ekwesịghị ịtụ ya ụjọ.

AKỤKỌ NDỤ

Ahapụrụ M Ihe Niile Soro Kraịst

Felix Fajardo di afọ iri na isii mgbe o kpebiri iso Kraịst. Mgbe ihe karịrị afọ iri asaa gachara, ọ naghị akwa mmakwaara iso Kraịst ebe ọ bụla ọ na-aga.

Isiokwu Ndị E Bipụtara n’Ụlọ Nche n’Afọ 2017

Ihe a e depụtara ga-enyere gị aka ịchọta isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche n’afọ 2017.