ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Mee 2018

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Julaị 9 ruo Ọgọst 5, 2018.

AKỤKỌ NDỤ

Adara M Ogbenye ná Mmalite, ma Baa Ọgaranya n’Ikpeazụ

Samuel Herd dara ogbenye ná mmalite, ma ugbu a, ọ bụ ọgaranya n’ebe Chineke nọ karịa otú o nwere ike iche n’echiche.

Udo, Olee Otú Ị Ga-esi Enweta Ya?

Ebe ọ bụ na anyị bi n’ụwa nsogbu juru, anyị ga-agbalịsi ike ka anyị nwee udo. Olee otú Okwu Chineke ga-esi nyere anyị aka.

Jehova Hụrụ Ndị Ji “Ntachi Obi Na-amị Mkpụrụ” n’Anya

Anyị nwere ike ịda mbà n’obi mgbe anyị na-ezi ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anaghị egecha anyị ntị. N’agbanyeghị nke ahụ, anyị niile nwere ike inwe ihe ịga nke ọma n’ozi anyị.

Ihe Mere Anyị Ji “Na-amị Mkpụrụ Dị Ukwuu”

Ọ dị mkpa ka anyị buru ihe mere anyị ji na-ekwusa ozi ọma n’uche.

Mara Onye Iro Gị

Anyị ma otú Setan si eduhie ndị mmadụ ma ọ bụ nkata ọ na-akpa.

Ndị Na-eto Eto Guzogidenụ Ekwensu

Anyị na Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya na-alụ agha. O nwere ike iyi ka ndị na-eto eto karịchaa agaghị emerili n’agha a, ma ha ekeela ekike maka ịlụ agha.

Ihe Ubi Hiri Nne

N’otu ebe dị na Yukren, e kee ndị nọ n’obodo ahụ ụzọ anọ, otu ụzọ bụ Ndịàmà Jehova.