ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Jenụwarị 2019
Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Mach 4 ruo Eprel 7, 2019
“Elegharịla Anya n’Ụjọ, n’Ihi na Abụ M Chineke Gị.”
Tụlee ihe atọ mere na anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ma mgbe ọnwụnwa bịaara anyị.
Na-eto Jehova n’Ọgbakọ
Ọ̀ na-esiri gị ike ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe? Isiokwu a ga-enyere gị aka ịchọpụta ihe ndị kpatara ya, nakwa ihe i nwere ike ime gbasara ya.
Olee Otú Ị Ga-esi Chebe Obi Gị?
Olee otú Setan si agbalị imebi obi anyị, oleekwanụ otú anyị ga-esi chebe ya?
Gịnị Ka Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị A Na-ejighị Ọtụtụ Ihe Mee Na-akụziri Anyị Banyere Eze Eluigwe?
Olee ihe achịcha na mmanya ahụ e ji eme Ncheta Ọnwụ Jizọs na-akụziri anyị banyere ịdị umeala n’obi, obi ike, na ịhụnanya Jizọs nwere?
Àgwà Ndị Na-eme Ka Anyị Na-achọ Ịga Ọmụmụ Ihe
Olee otú ịhụnanya, ịdị umeala n’obi, na inwe obi ike si eme ka anyị na-aga ọmụmụ ihe?
Onye A Họpụtara Ọhụrụ Ka O Soro n’Òtù Na-achị Isi
Guọ gbasara Nwanna Kenneth Cook, Jr ka ị mata onye ọ bụ