Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

E dere akwụkwọ a e ji amụ Baịbụl ka o nyere gị aka ịmụta ihe Baịbụl kwuru n’ọtụtụ isiokwu dị ka, gịnị mere ụmụ mmadụ ji ata ahụhụ, gịnị na-eme ma mmadụ nwụọ, otú ezinụlọ anyị ga-esi na-enwe obi ụtọ, na ihe ndị ọzọ.

Nke A Ọ̀ Bụ Ihe Chineke Zubere?

I nwere ike ịna-eche ihe mere nsogbu ji ju ebe niile n’ụwa taa. Ị̀ ma na Baịbụl kwuru na a ga-enwe ezigbo mgbanwe nakwa na ị ga-erite uru na ya?

ISI NKE MBỤ

Olee Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Chineke?

Ị̀ chere na Chineke na-eche banyere gị onwe gị? Mụta ụdị onye Chineke bụ na otú ị ga-esi abụ enyi ya.

ISI NKE ABỤỌ

Bible—Akwụkwọ Sitere n’Aka Chineke

Olee otú Bible nwere ike isi nyere gị aka idi nsogbu ndị i na-enwe? Gịnị mere ị ga-eji tụkwasị obi n’amụma ndị e buru na ya?

ISI NKE ATỌ

Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?

Ò nwere mgbe a ga-emecha mezuo nzube Chineke maka ụwa? Ọ bụrụ na a ga-enwe, olee mgbe ọ ga-abụ?

ISI NKE ANỌ

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Mụta ihe mere Jizọs ji bụrụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ebe o si bịa n’ụwa, nakwa ihe mere o ji bụrụ Ọkpara Jehova mụrụ naanị ya.

ISI NKE ISE

Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere

Gịnị bụ ihe mgbapụta ahụ? Olee otú ọ ga-esi baara gị uru?

ISI NKE ISII

Ebee Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Gara?

Mụta ihe Baịbụl kwuru gbasara ebe ndị nwụrụ anwụ na-aga, nakwa ihe mere ụmụ mmadụ ji anwụ anwụ.

ISI NKE ASAA

Ezigbo Olileanya nke Dịịrị Ndị Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ Anwụ

Ò nweela onye ị hụrụ n’anya nwụnahụrụ gị? Ì nwere ike ịhụ ya ọzọ? Mụta ihe Baịbụl kwuru banyere mbilite n’ọnwụ.

ISI NKE ASATỌ

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ọtụtụ ndị maara Ekpere Onyenwe Anyị. Ma, olee ihe okwu ahụ bụ́: “Ka alaeze gị bịa” pụtara?

ISI NKE ITOOLU

Ànyị Na-ebi “n’Ụbọchị Ikpeazụ”?

Lee otú ihe ndị na-eme gburugburu anyị na àgwà ndị mmadụ si na-egosi na anyị bị nnọọ “n’ụbọchị ikpeazụ” Baịbụl kwuru okwu ya.

ISI NKE IRI

Ndị Mmụọ E Kere Eke—Otú Ha Si Emetụta Anyị

Baịbụl kwuru gbasara ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ. Ndị mmụọ e kere eke hà dị adị? Ha nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́?

ISI NKE IRI NA OTU

N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?

Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ Chineke ka e kwesịrị ịta ụta maka ahụhụ ndị mmadụ na-ata n’ụwa a. Gịnị ka i chere? Mụta ihe Chineke kwuru mere nhụjuanya ji dịrị.

ISI NKE IRI NA ABỤỌ

Ibi Ndụ n’Ụzọ Na-amasị Chineke

Ọ ga-ekwe omume ka mmadụ bie ndụ otú dị Jehova mma. Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwere ike ịbụ enyi ya.

ISI NKE IRI NA ATỌ

Ile Ndụ Anya Otú Chineke Si Ele Ya

Olee otú Chineke si ele ite ime, ịmịnye ọbara, na ndụ anụmanụ anya?

ISI NKE IRI NA ANỌ

Ụzọ Isi Mee Ka Ndụ Ezinụlọ Gị Na-enye Obi Ụtọ

Ndị di, nwunye, nne na nna, nakwa ụmụaka nwere ọtụtụ ihe ha ga-amụta n’ịhụnanya Jizọs gosiri. Gịnị ka anyị na-amụta n’aka ya?

ISI NKE IRI NA ISE

Ofufe Chineke Na-anakwere

Tụlee ihe isii e ji amata ndị na-ekpe ezi okpukpe.

ISI NKE IRI NA ISII

Guzosie Ike n’Ezi Ofufe

Olee nsogbu ndị i nwere ike inwe mgbe ị na-agwa ndị ọzọ ihe ndị i kweere? Olee otú i nwere ike isi kwuo ya n’akpasughị ha iwe?

ISI NKE IRI NA ASAA

Bịaruo Chineke Nso n’Ekpere

Chineke ọ̀ na-ege ntị mgbe ị na-ekpe ekpere? Tupu ị mata azịza ya, ọ dị mkpa ka ị ghọtagodị ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere.

ISI NKE IRI NA ASATỌ

Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke

Gịnị ka mmadụ ga-eme tupu ya eruo ime baptizim n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Mụta ihe baptizim nọchiri anya ya na otú e kwesịrị isi eme ya.

ISI NKE IRI NA ITOOLU

Nọgide n’Ịhụnanya Chineke

Olee otú anyị ga-esi gosị ịhụnanya na ekele n’ihe ọma niile Chineke meere anyị?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Aha Chineke—Otú E Si Eji Ya Eme Ihe na Ihe Ọ Pụtara

E wepụla aha Chineke n’ọtụtụ Baịbụl. N’ihi gịnị? Ọ̀ dị mkpa ka anyị na-akpọ Chineke aha ya?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Otú Amụma Daniel Si Gosi Mgbe Mezaịa Ga-abịa

Ihe karịrị narị afọ ise tupu o mee, Chineke mere ka a mata kpọmkwem oge Mesaya ga-abịa. Mụọ ihe gbasara amụma a na-atọ ụtọ!

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Jizọs Kraịst—Mezaịa ahụ E Kwere ná Nkwa

Jizọs mezuru amụma niile e buru na Baịbụl banyere Mesaya ahụ. Jiri Baịbụl chọpụta otú amụma ndị a si mezuruo n’isi.

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ihe Ndị Bụ́ Eziokwu Banyere Nna ahụ, Ọkpara ahụ, na Mmụọ Nsọ

Ọtụtụ ndị chere na Baịbụl na-akụzi ozizi Atọ n’Ime Otu. Ma nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ihe Mere Ezi Ndị Kraịst Adịghị Eji Obe Efe Ofufe

Ọ̀ bụ n’obe ka a kpọgidere Jizọs? Gụọ ihe Baịbụl zara.

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị—Ihe Omume nke Na-ewetara Chineke Nsọpụrụ

E nyere Ndị Kraịst iwu ka ha na-eme Ncheta Ọnwụ Kraịst. Olee mgbe e kwesịrị ime ya, oleekwa otú e kwesịrị isi na-eme ya?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

“Mkpụrụ Obi” na “Mmụọ”—Gịnị n’Ezie Ka Okwu Ndị A Pụtara?

Ọtụtụ ndị chere na mmadụ nwụọ na o nwere ihe a na-adịghị ahụ anya na-esi n’ahụ́ ya pụọ dịwakwa ndụ. Gịnị ka Okwu Chineke gwara anyị?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Gịnị Bụ Shiol na Hedis?

Ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ, a sụgharịrị okwu ndị ahụ bụ́ Shiol na Hedis ka ha bụrụ “ili” ma ọ bụ “hel.” Gịnị ka okwu ndị a pụtara?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?

Mụta otú Ụbọchị Ikpe ga-esi ewetara ụmụ mmadụ ndị na-erube isi ngọzi.

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

1914—Afọ Dị Ịrịba Ama n’Amụma Bible

Olee ihe ndị Baịbụl kwuru gosiri na 1914 bụ afọ dị ịrịba ama?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ònye Bụ Maịkel Onyeisi Ndị Mmụọ Ozi?

Baịbụl mere ka anyị mata onye bụ onyeisi ndị mmụọ ozi a siri ezigbo ike. Mụtakwuo ihe gbasara ya na ihe ọ na-eme ugbu a.

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ

Akwụkwọ Mkpughe kwuru okwu otu nwaanyị a kpọrọ “Babilọn Ukwu ahụ.” Ọ̀ bụ nwaanyị nkịtị? Gịnị ka Baịbụl kwuru gbasara ya?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

À Mụrụ Jizọs Na December?

Oge a mụrụ Jizọs ọ̀ bụ oge okpomọkụ ka ọ̀ bụ oge oké oyi? Gịnị ka nke ahụ na-agwa anyị?

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ànyị Kwesịrị Ime Ememe Okpukpe?

Olee otú ememe okpukpe ndị na-ewu ewu a na-eme n’ebe i bi si bido? Azịza ya nwere ike iju gị anya.