Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?

Akwụkwọ a ga-eme ka ị mara ihe Baịbụl kwuru mere anyị ji ata ahụhụ, ihe na-eme mmadụ ma ọ nwụọ, otú ezinụlọ ga-esi na-ebi n’udo na ihe ndị ọzọ.

Olee Otú Chineke Chọrọ Ka Ihe Dịrị Anyị?

I nwere ike ịna-eche ihe mere nsogbu ji ju ebe niile n’ụwa a. Baịbụl kwuru na Chineke ga-ewepụrụ anyị ahụhụ, ọrịa, na ọnwụ n’oge na-adịghị anya.

ISI NKE 1

Ònye Bụ Chineke?

Ì chere na Chineke na-eche banyere gị? Mụta banyere àgwà Chineke na otú ị ga-esi bụrụ enyi ya.

ISI NKE 2

Baịbụl Bụ Akwụkwọ Si n’Aka Chineke

Olee otú Baịbụl ga-esi nyere gị aka idi nsogbu na-abịara gị? Gịnị mere ị ga-eji tụkwasị amụma ndị dị́ na ya obi?

ISI NKE 3

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụmụ Mmadụ?

Olee otú ndụ ga-adị n’ụwa ọhụrụ mgbe ọ ga-aghọ paradaịs?

ISI NKE 4

Ònye Bụ Jizọs Kraịst?

Mụta ihe mere Jizọs ji bụrụ Mesaya ahụ e kwere ná nkwa, ebe o si bia, na ihe mere o ji bụrụ Ọkpara Jehova a mụrụ naanị ya.

ISI NKE 5

Ihe Mgbapụta Bụ Onyinye Kachanụ Chineke Nyere Anyị

Gịnị bụ ihe mgbapụta? Olee otú ọ ga-esi baara gị uru?

ISI NKE 6

Ò Nwere Ebe Mmadụ Na-aga ma Ọ Nwụọ?

Ị ga-amụta ihe Baịbụl kwuru banyere ndị nwụrụ anwụ na ihe mere ndị mmadụ ji anwụ anwụ.

ISI NKE 7

A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ n’Ọnwụ

Ò nwetụla mgbe onye ị hụrụ n’anya nwụrụ? Ì nwere ike ịhụ ya anya ọzọ? Ị gụọ isiokwu a, ị ga-amụta ihe Baịbụl na-akụzi gbasara ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ.

ISI NKE 8

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Ọtụtụ ndị maara Ekpere Onyenwe Anyị. Ma, olee ihe okwu ahụ bụ́ “Ka alaeze gị bịa” pụtara?

ISI NKE 9

Ọgwụgwụ Ụwa Ọ̀ Dịla Nso?

Tụlee otú àgwà ndị mmadụ na-akpa si egosi na anyị bi n’oge ọgwụgwụ otú ahụ Baịbụl buru n’amụma.

ISI NKE 10

Ihe I Kwesịrị Ịma Gbasara Ndị Mmụọ Ozi na Ndị Mmụọ Ọjọọ

Baịbụl kwuru banyere ndị mmụọ ozi na ndị mmụọ ọjọọ. Hà dị adị? Ha nwere ike inyere anyị aka ma ọ bụ merụọ anyị ahụ́?

ISI NKE 11

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Na-atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?

Ọtụtụ ndị chere na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata. Gịnị ka gịnwa chere? Mụta ihe Chineke kwuru mere ndị mmadụ ji ata ahụhụ.

ISI NKE 12

Olee Otú Ị Ga-esi Bụrụ Enyi Chineke?

mmadụ ọ̀ ga-emeli ihe dị Jehova mma? Nke bụ́ eziokwu bụ na i nwere ike ịbụ enyi Chineke.

ISI NKE 13

Jiri Ndụ Kpọrọ Ihe

Olee otú Chineke si ele ite ime, mmịnye ọbara, na ndụ ụmụ anụmanụ, anya?

ISI NKE 14

Ezinụlọ Unu Ga-enweli Obi Ụtọ

Ndị bụ́ di, ndị nwunye, ndị nne na nna, na ndị bụ́ ụmụ kwesịrị iṅomi otú Jizọs si hụ ndị ọzọ n’anya. Olee ihe anyị mụtara n’aka ya?

ISI NKE 15

Otú E Kwesịrị Isi Na-efe Chineke

Gụọ ihe isii e ji amata ndị na-efe Chineke otú o si chọọ.

ISI NKE 16

Kpebie Ife Chineke Otú Ọ Chọrọ

Olee nsogbu ndị i nwere ike inwe ma ị kọwawara ndị ọzọ ihe i kweere? Olee otú ị ga-esi eme ya n’akpasughị ha iwe?

ISI NKE 17

Chineke Meere Anyị Ihe Ọma Kwe Ka Anyị Na-ekpegara Ya Ekpere

Chineke ọ̀ na-anụ ekpere gị? Ihe ga-enyere gị aka ịmata azịza ajụjụ a bụ ịghọta ihe Baịbụl kwuru gbasara ekpere.

ISI NKE 18

Èkwesịrị M Inyefe Chineke Onwe M, E Meekwa M Baptizim?

Gịnị ka mmadụ ga-eme tupu ya eruo ime baptizim n’ọgbakọ Ndị Kraịst? Gụọ ihe a ka ị mata ihe baptizim nọchiri anya ya na otú e kwesịrị isi eme ya.

ISI NKE 19

Nọrọ Jehova Nso

Olee otú anyị ga-esi ekele Chineke ma gosi ya na anyị hụrụ ya n’anya maka ihe ọma niile o meere anyị?

Ihe E Dere ná Ngwụcha Akwụkwọ A

Ebe a kọwara okwu ụfọdụ dị́ n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?