Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Ị gụọ akwụkwọ a, ị ga-ahụ ihe niile mere ná ndụ Jizọs e dere na Baịbụl.

OKWU MMALITE

Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Ihe ndị Jizọs kụziri na ihe ndị o mere nke dị́ n’akwụkwọ Matiu, Mak, Luk, na Jọn nwere ike ịgbanwe ndụ gị.

ISI NKE 1

Ozi Abụọ Si n’Aka Chineke

Mmụọ ozi Gebriel ezite ozi ndị siri ike nkweta.

ISI NKE 2

A Kwanyeere Jizọs Ùgwù Tupu A Mụọ Ya

Olee otú Elizabet na nwa o bu n’afọ si kwanyere Jizọs ùgwù?

ISI NKE 3

A Mụọ Onye Ga-akwadebe Ụzọ

Ozugbo Zekaraya malitere ikwu okwu, o buru otu amụma dị mkpa.

ISI NKE 4

Meri Dị Ime Ma Ọ Lụbeghị Di

Josef ò kwere ihe Meri gwara ya mgbe o kwuru na ọ bụghị nwoke ọzọ tụwara ya ime, kama na ọ bụ n’ike mmụọ nsọ ka ya dị ime?

ISI NKE 5

Olee Ebe A Mụrụ Jizọs, Oleekwa Mgbe A Mụrụ Ya?

Olee otú anyị si mara na a mụghị Jizọs na Disemba 25?

ISI NKE 6

Nwa ahụ E Kwere ná Nkwa

Mgbe Josef na Meri ku Jizọs bịa n’ụlọ nsọ, ndị Izrel abụọ merela agadi buru amụma banyere ihe Jizọs ga-eme n’ọdịnihu.

ISI NKE 7

Ndị Na-agụ Kpakpando Abịa Leta Jizọs

Gịnị mere kpakpando ahụ ha hụrụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ ji bu ụzọ duru ha gaa na nke Eze Herọd chọrọ igbu Jizọs, kama iduga ha ozugbo n’ebe Jizọs nọ?

ISI NKE 8

Ha Gbapụrụ Ka Eze Obi Tara Mmiri Ghara Igbu Nwa Ha

Amụma atọ e buru na Baịbụl gbasara Mesaya ahụ mezuru mgbe Jizọs ka bụ nwata.

ISI NKE 9

Mgbe Jizọs Na-etolite na Nazaret

Ụmụnne ndị nwoke na ndị nwaanyị ole ka Jizọs nwere?

ISI NKE 10

Jizọs na Ezinụlọ Ya Agaa Jeruselem

Josef na Meri chị obi n’aka n’ihi na ha ahụghị Jizọs. O jukwaranụ Jizọs anya na ha amaghị ebe ha ga-achọta ya.

ISI NKE 11

Jọn Onye Na-eme Baptizim Akwadebe Ụzọ

Mgbe ndị Farisii na ndị Sadusii bịakwutere Jọn, ọ katọrọ ha. N’ihi gịnị?

ISI NKE 12

E Mee Jizọs Baptizim

Gịnị mere e ji mee Jizọs baptizim ebe ọ bụ na o meghị mmehie ọ bụla?

ISI NKE 13

Mụta Ihe n’Ihe Jizọs Mere Mgbe A Nwara Ya Ọnwụnwa

E nwere ihe abụọ ọnwụnwa a nwara Jizọs na-egosi banyere Ekwensu.

ISI NKE 14

Jizọs Amalite Ịchọ Ndị Ga-abụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya

Gịnị mere ka mmadụ isii mbụ ghọrọ ndị na-eso ụzọ kweta na ha ahụla Mesaya ahụ?

ISI NKE 15

Jizọs Arụọ Ọrụ Ebube Mbụ Ya

Jizọs gosiri nne ya na ọ bụzi Nna ya nke eluigwe ga na-agwa ya ihe ọ ga-eme, ọ bụghị yanwa.

ISI NKE 16

Jizọs Egosi na Ofufe Chineke Na-anụ Ya Ọkụ n’Obi

Ebe ọ bụ na Iwu Chineke nyere ohere ka a na-azụ anụmanụ e ji achụ àjà na Jeruselem, gịnị mere iwe ji bịa Jizọs n’ihi ndị na-ere ahịa n’ụlọ nsọ?

ISI NKE 17

Jizọs Akụziere Nikọdimọs Ihe n’Abalị

Gịnị ka ‘ịmụ mmadụ ọzọ’ pụtara?

ISI NKE 18

Jizọs Na-eto Eto, Jọn Ana-atalata Atalata

Ndị na-eso ụzọ Jọn Onye Na-eme Baptizim na-eme anyaụfụ, ma Jọn adịghị eme.

ISI NKE 19

Jizọs Akụziere Nwaanyị Sameria Ihe

Jizọs agwa ya ihe ọ ga-abụ na ọ gwatụbeghị ya onye ọzọ.

ISI NKE 20

Ọrụ Ebube nke Abụọ Jizọs Nọ na Kena Rụọ

Jizọs nọ ihe karịrị kilomita iri abụọ na ise gwọọ otu nwata nwoke.

ISI NKE 21

N’Ụlọ Nzukọ Ndị Juu Dị na Nazaret

Gịnị ka Jizọs kwuru nke mere ndị obodo ya ji chọwa igbu ya

ISI NKE 22

Jizọs Akpọọ Mmadụ Anọ Ka Ha Bụrụ Ndị Na-akụta Mmadụ

Ọ kpọrọ ha ka ha hapụ ịkụ azụ̀, kụtawazie mmadụ.

ISI NKE 23

Jizọs Arụọ Ọtụtụ Ọrụ Ebube na Kapaniọm

Ọ bụrụ na Jizọs achụpụ mmụọ ọjọọ n’ahụ́ mmadụ, ọ na-egbochi ndị mmụọ ọjọọ ahụ ịgwa ndị mmadụ na ya bụ Ọkpara Chineke. Maka gịnị?

ISI NKE 24

Jizọs Ezisakwuo Ozi Ọma na Galili

Ndị mmadụ bịakwutere Jizọs ka ọ gwọọ ha, ma Jizọs kọwaara ha na e nwere ihe ka ịgwọ ọrịa mkpa ya kwo na-eje ozi.

ISI NKE 25

Ọmịiko O Nwere Emee Ka Ọ Gwọọ Otu Onye Ekpenta

Ihe Jizọs gwara onye ekpenta na-emetụ n’ahụ́. Ihe ahụ o kwuru gosiri na ihe gbasara ndị ọ gwọrọ ọrịa na-emetụ ya n’ahụ́.

ISI NKE 26

“A Gbagharawo Gị Mmehie Gị”

N’ihe ahụ Jizọs kwuru, olee ihe jikọrọ mmehie na ọrịa?

ISI NKE 27

Jizọs Akpọọ Matiu

Gịnị mere Jizọs na ndị a ma na ha bụ ndị mmehie ji na-erikọ ihe?

ISI NKE 28

Gịnị Mere Ndị Na-eso Ụzọ Jizọs Ebughị Ọnụ?

Jizọs ji ihe atụ gbasara karama akpụkpọ mmanya zaa ha ihe ha jụrụ ya.

ISI NKE 29

Mmadụ Ò Nwere Ike Ịrụ Ọrụ Ọma n’Ụbọchị Izu Ike?

Gịnị mere ndị Juu ji megide Jizọs n’ihi na ọ gwọrọ nwoke ahụ́ na-adịghị kemgbe afọ iri atọ na asatọ?

ISI NKE 30

Jizọs Bụ Ọkpara Chineke

Ndị Juu chere na Jizọs na-eme ka ya na Chineke hà, ma Jizọs kwuru hoo haa na Chineke ka ya.

ISI NKE 31

Ịghọrọ Ọka n’Ụbọchị Izu Ike

Gịnị mere Jizọs ji kpọọ onwe ya “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike”?

ISI NKE 32

Olee Ihe Iwu Kwadoro na E Nwere Ike Ime n’Ụbọchị Izu Ike?

Ndị Sadusii na ndị Farisii bụ́ ndị iro gbakọrọ aka ime otu ihe.

ISI NKE 33

Imezu Amụma Aịzaya

Gịnị mere Jizọs ji nye ndị ọ gwọrọ iwu ka ha ghara ịgwa ndị ọzọ onye ya bụ ma ọ bụ ihe o mere?

ISI NKE 34

Jizọs Ahọrọ Ndịozi Iri na Abụọ

Gịnị dị iche n’onyeozi na onye na-eso ụzọ?

ISI NKE 35

Ozizi Elu Ugwu Ahụ A Ma Ama

Gụọ ihe a ka ị mata ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ Jizọs kụziri n’ozizi ya.

ISI NKE 36

Otu Onyeisi Ndị Agha Rom Egosi na Ya Nwere Okwukwe Dị Ukwuu

Olee ihe onyeisi ndị agha a mere nke tụrụ Jizọs n’anya?

ISI NKE 37

Jizọs Akpọlite Nwa Otu Nwaanyị Di Ya Nwụrụ

Ndị hụrụ ọrụ ebube a Jizọs rụrụ ghọtara nnọọ ihe ọ pụtara.

ISI NKE 38

Jọn Chọrọ Ịnụ n’Ọnụ Jizọs ma Ọ̀ Bụ Yanwa Bụ Mesaya Ahụ

Gịnị mere Jọn Onye Na-eme Baptizim ji ajụ ma ọ̀ bụ Jizọs bụ Mesaya ahụ? Jọn ò nwere obi abụọ?

ISI NKE 39

Ahụhụ Ga-adịrị Ọgbọ Na-anaghị Anabata Ozi Ọma

Jizọs sịrị na n’Ụbọchị Ikpe, ọ ga-adịrị obodo Sọdọm mfe karịa Kapaniọm, bụ́ obodo o biri mgbe ọ nọ n’ụwa.

ISI NKE 40

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgbaghara Mmehie

Mgbe Jizọs gwara nwaanyị ahụ yiri ka ọ̀ bụ onye akwụna na a gbagharala ya mmehie ya, ọ̀ na-egosi na ọ dị mma mmadụ imebi iwu Chineke?

ISI NKE 41

Ikike Ònye Ka Jizọs Ji Na-arụ Ọrụ Ebube?

Ụmụnne Jizọs chere na isi emebiela Jizọs.

ISI NKE 42

Jizọs Abaara Ndị Farisii Mba

Gịnị bụ “ihe ịrịba ama nke Jona onye amụma”?

ISI NKE 43

Ihe Atụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

Jizọs mere ihe atụ asatọ iji kọwaa ihe dị iche iche gbasara Alaeze eluigwe.

ISI NKE 44

Jizọs Emee Ka Ebili Mmiri Dajụọ

Mgbe Jizọs mere ka ifufe na ebili mmiri dajụọ, o ji ya kụziere anyị otú ihe ga-adị mgbe Alaeze ya ga-achịwa.

ISI NKE 45

Jizọs Egosi na Ya Ka Ndị Mmụọ Ọjọọ Ike

Ihe karịrị otu mmụọ ọjọọ ò nwere ike iji otu onye?

ISI NKE 46

Ọ Gbakere Mgbe O Metụrụ Uwe Jizọs Aka

N’ihe a merenụ, Jizọs gosiri na ya nwere ikike na ọmịiko.

ISI NKE 47

Otu Nwata Nwaanyị Adịghachi Ndụ

Ndị mmadụ chịrị Jizọs ọchị mgbe o kwuru na nwatakịrị ahụ nwụrụ anwụ na-ehi ụra. Olee ihe ọ ma nke ha na-amaghị?

ISI NKE 48

Ọ Rụrụ Ọrụ Ebube, Ma A Jụrụ Ya Ma na Nazaret

O nwere ihe ọzọ mere ndị Nazaret ji jụ Jizọs, ọ bụghị n’ihi ihe ndị ọ kụziri ma ọ bụ ọrụ ebube ndị ọ rụrụ.

ISI NKE 49

Jizọs Ekwusaa Ozi Ọma na Galili, Nyekwa Ndịozi Ya Ọzụzụ

Gịnị ka okwu ahụ bụ́ ‘Alaeze eluigwe eruwo nso’ pụtara?

ISI NKE 50

A Zụrụ Ha Otú Ha Ga-enwe Ike Ịna-ekwusa Ozi Ọma Ọ Bụrụgodị na A Kpagbuwe Ha

Ọ bụrụ na ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwesịghị ịtụ ụjọ ọnwụ, gịnị mere Jizọs ji gwa ha ka ha gbaga ebe ọzọ ma ọ bụrụ na a kpagbuwe ha?

ISI NKE 51

E Gburu Mmadụ n’Otu Ememme Ncheta Ọmụmụ

Egwú Salomi gbara tọrọ Herọd ụtọ nke na o kwere ya nkwa inye ya ihe ọ bụla ọ ga-arịọ. Gịnị ka ọ rịọrọ nke na-awụ akpata oyi n’ahụ́?

ISI NKE 52

Iji Ogbe Achịcha Ole na Ole na Azụ̀ Nyejuo Ọtụtụ Puku Mmadụ Afọ

Ọrụ ebube a Jizọs rụrụ dị oké mkpa nke na ndị niile dere Oziọma anọ ahụ dechara banyere ya.

ISI NKE 53

Onye Ọchịchị nke Nwere Ikike Ime Ka Ebili Mmiri na Oké Ifufe Dajụọ

Gịnị ka ndịozi Jizọs mụtara mgbe Jizọs gara ije n’elu mmiri, meekwa ka oké ifufe dajụọ?

ISI NKE 54

Jizọs Bụ “Achịcha Na-enye Ndụ”

Gịnị mere Jizọs ji baara ndị mmadụ mba n’agbanyeghị na ha gbara ezigbo mbọ chọrọ ya bịa?

ISI NKE 55

Jizọs Ekwuo Ihe Wụrụ Ọtụtụ Ndị Akpata Oyi n’Ahụ́

Jizọs kwuru ihe wụrụ ndị mmadụ akpata oyi n’ahụ́ nke na ọtụtụ ndị na-eso ụzọ ya kwụsịrị iso ya.

ISI NKE 56

Gịnị n’Eziokwu Na-emerụ Mmadụ?

Ọ̀ bụ ihe na-abanye mmadụ n’ọnụ ka ọ̀ bụ ihe na-esi na ya apụta?

ISI NKE 57

Jizọs Agwọọ Otu Nwata Nwaanyị na Nwoke Ntị Chiri

Gịnị mere iwe eweghị otu nwaanyị mgbe Jizọs ji ndị obodo ya tụnyere ụmụ nkịta?

ISI NKE 58

Ọ Mụbara Achịcha, Kwuokwa Ka E Lezie Anya Maka Ihe Iko Achịcha

Ndị na-eso ụzọ Jizọs mechara mata ihe iko achịcha nke Jizọs na-ekwu okwu ya.

ISI NKE 59

Ònye Ka Nwa nke Mmadụ Bụ?

Gịnị ka mkpịsị ugodi nke Alaeze bụ? Ònye ji ha rụọ ọrụ, oleekwa ihe o ji ha rụọ?

ISI NKE 60

Nnwogha Kraịst Gosiri Otú Ebube Ya Ga-adị n’Ọdịnihu

Gịnị ka nnwogha ahụ bụ? Gịnịkwa ka ọ na-egosi?

ISI NKE 61

Jizọs Agwọọ Nwata Nwoke Mmụọ Ọjọọ Ji

Jizọs kwuru na ihe mere ndị na-eso ụzọ ya agwọlighị otu nwata nwoke mmụọ ọjọọ ji bụ n’ihi enweghị okwukwe. Ma, olee onye na-enweghị okwukwe? Ọ̀ bụ nwata nwoke ahụ, nna ya, ka ọ̀ bụ ndị na-eso ụzọ Jizọs?

ISI NKE 62

Jizọs Akụzie Gbasara Ịdị Umeala n’Obi

Ndị torola eto si n’aka nwatakịrị mụta otu ihe dị mkpa.

ISI NKE 63

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịkpata Ihe Ịsụ Ngọngọ na Ime Mmehie

Jizọs kwuru ihe atọ a ga-eme iji dozie nsogbu dị n’etiti nwanna na nwanna.

ISI NKE 64

Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịgbaghara Mmejọ

Jizọs mere atụ gbasara otu ajọ ohu. O ji ihe atụ ahụ mee ka anyị mata na Chineke chọrọ ka anyị na-agbaghara ndị mejọrọ anyị.

ISI NKE 65

Jizọs Ana-akụzi Ihe Ka Ha Na-aga Jeruselem

Jizọs ji ihe ya na ụmụ nwoke atọ kparịtara mee ka a mata ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ ghara ịbụ onye na-eso ụzọ ya.

ISI NKE 66

Jizọs Erute Jeruselem Maka Ememme Ụlọ Ndò

Gịnị mere ndị nọ na-ege Jizọs ntị ji chee na mmụọ ọjọọ ji ya?

ISI NKE 67

“Ọ Dịtụbeghị Onye Ọzọ Si Otú A Kwuo Okwu”

Ndị niile nọ n’ụlọikpe kacha elu nke ndị Juu na-emegide Jizọs, ma otu onye n’ime ha katara obi gbachitere ya.

ISI NKE 68

Ọkpara Chineke Bụ “Ìhè nke Ụwa”

Jizọs kwuru na ‘eziokwu ahụ ga-eme ka i nwere onwe gị.’ Ma, gịnị ka ị ga-enwere onwe gị na ya?

ISI NKE 69

Nna Ha Ọ̀ Bụ Ebreham Ka Ọ̀ Bụ Ekwensu

Jizọs kwuru otú a ga-esi mara ndị bụ ezigbo ụmụ Ebreham, kwuokwa onye bụ Nna ya.

ISI NKE 70

Jizọs Agwọọ Otu Nwoke Kpuru Ìsì Malite Mgbe A Mụrụ Ya

Ndị na-eso ụzọ Jizọs jụrụ ya ihe mere nwoke a ji kpuo ìsì. Ò mehiere? Ndị mụrụ ya hà mehiere? Ihe ndị mmadụ kwuru mgbe Jizọs gwọrọ nwoke a dị iche iche.

ISI NKE 71

Ndị Farisii Agbaa Nwoke Kpuburu Ìsì Ajụjụ

Ihe nwoke ahụ kpuburu ìsì kwuru were ndị Farisii iwe. Ha chụpụrụ ya n’ụlọ nzukọ, bụ́ ihe ndị mụrụ ya tụrụ ụjọ ya.

ISI NKE 72

Jizọs Ezipụ Ndị Na-eso Ụzọ Ya Iri Asaa Ka Ha Gaa Kwusaa Ozi Ọma

Mgbe Jizọs nọ na Judia, o zipụrụ ndị na-eso ụzọ ya iri asaa ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke. Olee ebe ha gara kwusaa ozi ọma? Ọ̀ bụ n’ụlọ nzukọ ndị Juu ka ọ̀ bụ n’ụlọ ndị mmadụ?

ISI NKE 73

Onye Sameria Emee Ihe Gosiri na Ọ Bụ Ezigbo Onye Agbata Obi

Olee otú Jizọs si jiri akụkọ banyere onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi kụziere anyị ihe?

ISI NKE 74

Jizọs Akụzie Gbasara Ile Ọbịa na Ikpe Ekpere

Jizọs letara Meri na Mata n’ụlọ ha. Gịnị ka ọ kụziiri ha gbasara ile ọbịa? Olee otú o si mechaa kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga na-ekpe n’ekpere?

ISI NKE 75

Jizọs Ekwuo Ihe Ga-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ

Jizọs gwara ndị na-akatọ ya banyere ‘mkpịsị aka Chineke’ na otú ‘Alaeze Chineke si kwaa ha.’ O kwukwara ihe ga-eme ka mmadụ nwee ezigbo obi ụtọ.

ISI NKE 76

Jizọs Esoro Onye Farisii Rie Ihe

Jizọs agbaa ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ n’anwụ na ha bụ ndị ihu abụọ. Olee ibu arọ ha bokwasịrị ndị mmadụ?

ISI NKE 77

Jizọs Enye Ndụmọdụ Gbasara Ịba Ọgaranya

Jizọs mere ihe atụ banyere otu nwoke bara ọgaranya nke wusakwuru ụlọ nkwakọba ihe ya. Olee nsogbu Jizọs kwughachiri dị na mmadụ ịchọ akụnụba?

ISI NKE 78

Onye Ahụ Na-elekọta Ụlọ, Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi, Kwesịrị Ịdị Njikere

Jizọs chọrọ ka a na-akụziri ndị na-eso ụzọ ya okwu Chineke. Gịnị bụ ọrụ ohu ahụ? Jizọs kwuru ka ndị na-eso ụzọ ya dịrị njikere. Gịnị mere ihe a o kwuru ji dị mkpa?

ISI NKE 79

Ihe Mere A Ga-eji Bibie Ndị Juu Na-ekweghị na Jizọs

Jizọs kwuru na a ga-ebibi ndị ọ na-achọ inyere aka ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. Hà ga-amụta ihe Jizọs na-akụziri ha banyere otú Chineke si ele ha anya?

ISI NKE 80

Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma na Ogige Atụrụ

Ihe atụ Jizọs mere gbasara onye ọzụzụ atụrụ na atụrụ ya gosiri otú Jizọs si were ndị na-eso ụzọ ya. Hà ga-ege ya ntị ma mee ihe ọ gwara ha mee?

ISI NKE 81

Jizọs na Nna Ya Bụ Otu, Ma Ọ Bụghị Chineke

Ụfọdụ ndị na-akatọ Jizọs boro ya ebubo na ọ na-eme ka ya na Chineke hara. Olee otú Jizọs si gbaghaa ebubo ụgha ha?

ISI NKE 82

Ozi Jizọs Jere na Peria

Jizọs kwuru ihe mmadụ ga-eme ka a zọpụta ya. Ihe o kwuru baara ndị mmadụ uru n’oge ahụ. Ọ̀ bakwara uru taa?

ISI NKE 83

Ole Ndị Chineke Na-akpọ Ka Ha Bịa Oriri?

Mgbe Jizọs bịara oriri n’ụlọ otu onye Farisii, o mere ihe atụ gbasara nri anyasị. O ji ya kụziere ndị Chineke ihe ha kwesịrị ịna-eme. Gịnị bụ ihe ahụ ọ chọrọ ka ha na-eme?

ISI NKE 84

Ihe A Chọrọ n’Aka Onye Chọrọ Ịbụ Onye Na-eso Ụzọ Jizọs

A chọrọ ọtụtụ ihe n’aka ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ Jizọs. Jizọs kwuru ihe ịbụ onye na-eso ụzọ ya pụtara. Ihe o kwuru nwere ike ịwụ ụfọdụ ndị chọrọ ịbụ ndị na-eso ụzọ ya akpata oyi n’ahụ́.

ISI NKE 85

Ịṅụrị Ọṅụ n’Ihi Onye Mmehie Chegharịrịnụ

Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii katọrọ Jizọs maka na ya na ndị nkịtị na-emekọ ihe. Ma, Jizọs meere ha ihe atụ abụọ gosiri otú Chineke si were ndị mmehie.

ISI 86

Nwa Furu Efu Alọta

Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe atụ Jizọs mere banyere nwa mmefu?

ISI NKE 87

Jiri Amamihe Kwadebe Maka Ọdịnihu

Jizọs ji ihe atụ o mere gbasara otu nwoke na-elekọta ụlọ nke ghọrọ nna ya ukwu aghụghọ kụziere ndị na-eso ụzọ ya ihe dị ezigbo mkpa.

ISI NKE 88

Ọnọdụ Ọgaranya ahụ na Lazarọs Agbanwee

Ihe ga-enye aka ịghọta ihe atụ ahụ Jizọs mere bụ ịmata ndị ọgaranya ahụ na Lazarọs nọchiri anya ha.

ISI NKE 89

Jizọs Akụzie Ihe na Peria Tupu Ya Abanye Judia

Jizọs kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịgbaghara ndị mejọrọ anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ha mejọrọ anyị ugboro ugboro.

ISI NKE 90

“Mbilite n’Ọnwụ na Ndụ”

Jizọs sịrị na ndị nwere okwukwe n’ebe ọ nọ “agaghị anwụ ma ọlị.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

ISI NKE 91

Jizọs Akpọlite Lazarọs n’Ọnwụ

O nwere ihe abụọ mere ndị iro Jizọs na-enweghị ike ikwu na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ.

ISI NKE 92

Jizọs Gwọrọ Ndị Ekpenta Iri, ma Naanị Otu n’Ime Ha Bịara Kelee Ya

Nwoke Jizọs gwọrọ ekpenta bịara kelee ya. Ma, o nwekwara onye ọzọ o kelere.

ISI NKE 93

A Ga-ekpughe Nwa nke Mmadụ

Olee otú ọnụnọ Kraịst ga-esi adị ka àmụ̀mà?

ISI NKE 94

Ekpere na Ịdị Umeala n’Obi Dị Ezigbo Mkpa

N’ihe atụ Jizọs mere banyere otu ọkàikpe na otu nwaanyị di ya nwụrụ, o mere ka anyị mata otu ihe dị mkpa anyị kwesịrị ịna-eme.

ISI NKE 95

Jizọs Akụzie Gbasara Ịgba Alụkwaghịm na Ịhụ Ụmụntakịrị n’Anya

Otú Jizọs si were ụmụntakịrị dị nnọọ iche n’otú ndị na-eso ụzọ ya si were ha. Gịnị kpatara ya?

ISI NKE 96

Jizọs Azaa Otu Onye Ọchịchị Ajụjụ Ọ Jụrụ Ya

Gịnị mere Jizọs ji sị na ọ dịịrị kamel mfe isi n’anya agịga e ji akwa ákwà gafere karịa ọgaranya ịba n’alaeze Chineke?

ISI NKE 97

Ihe Atụ Ndị Na-arụ Ọrụ n’Ubi Vaịn

Olee otú ndị mbụ ga-esi bụrụ ndị ikpeazụ, ndị ikpeazụ abụrụzie ndị mbụ?

ISI NKE 98

Ndịozi Ahụ Achọwakwa Ịbụ Ndị A Ma Ama Ọzọ

Jems na Jọn rịọrọ Jizọs ka ha nọrọ n’ọkwá ukwu n’Alaeze ya. Ma, ọ bụghị sọọsọ ha ka ọ na-agụ.

ISI NKE 99

Jizọs Agwọọ Ndị Ìsì, Nyerekwa Zakịọs Aka

Matiu, Mak, na Luk dere banyere nwoke onye ìsì Jizọs gwọrọ n’ebe dị nso na Jeriko. Olee otú e nwere ike isi kọwaa na ihe ha dere anaghị emegiderịta onwe ha?

ISI NKE 100

Ihe Atụ Maịna Iri

Jizọs kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke nwere ka a ga-enyekwu; ma onye nke na-enweghị, a ga-anapụ ya ọbụna ihe o nwere.” Gịnị ka ihe a o kwuru pụtara?

ISI NKE 101

Jizọs Agaa Betani Rie Nri n’Ụlọ Saịmọn

Meri nwanne Lazarọs mere otu ihe kpatara nsogbu, ma, Jizọs gbachiteere ya.

ISI NKE 102

Eze Jizọs Ejiri Nwa Ịnyịnya Ibu Banye na Jeruselem

Jizọs mezuru amụma e buru narị afọ ise tupu oge ọ banyere Jeruselem dị ka eze.

ISI NKE 103

Jizọs Emee Ka Ụlọ Nsọ Dị Ọcha Ọzọ

Gịnị mere Jizọs ji kpọọ ndị na-ere ahịa na Jeruselem ndị na-apụnara mmadụ ihe ebe ọ bụ ahịa ka ha na-ere?

ISI NKE 104

Ndị Juu Anụ Olu Chineke, ma Hà Ga-enwenụ Okwukwe?

È nwere ihe dị iche n’inwe okwukwe na Jizọs na ime ihe ndị gosiri na i nwere okwukwe na ya?

ISI NKE 105

Jizọs Ejiri Osisi Fig Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Inwe Okwukwe

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya uru inwe okwukwe bara nakwa ihe mere Chineke ji jụ mba Izrel.

ISI NKE 106

Jizọs Emee Ihe Atụ Abụọ Gbasara Ubi Vaịn

Chọpụta ihe ihe atụ abụọ Jizọs mere pụtara. Nke mbụ bụ gbasara otu nwoke gwara ụmụ ya nwoke abụọ ka ha gaa rụọ ọrụ n’ubi vaịn ya. Nke abụọ abụrụ otu nwoke nke nyere ndị ọjọọ ubi vaịn ya ka ha na-arụ ọrụ na ya.

ISI NKE 107

Otu Eze Agwa Ohu Ya Ka Ọ Kpọọ Ndị Mmadụ Ka Ha Bịa Oriri Agbamakwụkwọ

Ihe atụ Jizọs mere bụ amụma ka o buru.

ISI NKE 108

Otú Jizọs Si Mee Ka Mbọ A Gbara Ijide Ya Kụọ Afọ n’Ala

O bu ụzọ mechie ndị Farisii ọnụ, mechazie mechie ndị Sadusii. N’ikpeazụ, o mechikọtara ndị abụọ a ọnụ.

ISI NKE 109

Jizọs Akatọọ Ndị Na-emegide Ya

Gịnị mere Jizọs anabataghị otú ndị okpukpe si eleghara ihe ndị ka mkpa n’iwu ahụ anya?

ISI NKE 110

Ụbọchị Ikpeazụ Jizọs Nọrọ n’Ụlọ Nsọ

Jizọs ji onyinye nwaanyị di ya nwụrụ, nke dara ogbenye nyere, kụzie ihe dị ezigbo mkpa.

ISI NKE 111

Ndịozi Jizọs Ajụọ Ya Ihe Ga-abụ Ihe Ịrịba Ama

Amụma ndị ahụ Jizọs buru mezuru na nke mbụ ya n’oge ndịozi. Ò nwekwara ike imezu nke ugboro abụọ n’ọdịnihu karịa nke mbụ o mezuru?

ISI NKE 112

Jizọs Ejiri Ihe Atụ Ụmụ Agbọghọ Na-amaghị Nwoke Kụzie Gbasara Ịmụrụ Anya

Jizọs ò kwuru na ndị na-eso ụzọ ya ụfọdụ bụ ndị nzuzu, ụfọdụ abụrụ ndị nwere uche?

ISI NKE 113

Jizọs Ejiri Ihe Atụ Talent Kụziere Ndị Na-eso Ụzọ Ya Ịdị Uchu n’Ọrụ

Ihe atụ Jizọs nyere mere ka a ghọta ihe ihe a o kwuru pụtara. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke nwere, a ga-enyekwu ya.”

ISI NKE 114

Kraịst Bụ́ Eze Abịa Ikpe Ndị Bụ́ Atụrụ Na Ndị Bụ́ Ewu Ikpe

Jizọs ji ihe atụ gosi ihe a ga-eji kpee ndị mmadụ ikpe.

ISI NKE 115

Ememme Ngabiga Ikpeazụ Jizọs Mere Eruo Nso

Gịnị mere anyị ji kwesị icheta na ọ bụ mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ ka ndị ndú okpukpe kwekọrịtara ịkwụ Judas ka ọ rara Jizọs nye ha?

ISI NKE 116

Jizọs Akụzie Ịdị Umeala n’Obi n’Ememme Ngabiga Ikpeazụ Ya

Jizọs mere ihe juru ndịozi ya anya mgbe ọ rụrụ ọrụ ohu na-arụ.

ISI NKE 117

Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị

Jizọs malitere Ncheta Ọnwụ ya nke ndị na-eso ụzọ ya ga na-eme kwa afọ n’abalị iri na anọ n’ọnwa Naịsan.

ISI NKE 118

Ndịozi Jizọs Arụọ Ụka Gbasara Onye Kacha Ukwuu n’Ime Ha

Ndịozi Jizọs chefuru ihe ọ kụziiri ha tupu ha amalite Ememme Ngabiga ná mgbede ụbọchị ahụ.

ISI NKE 119

Jizọs Bụ Ụzọ, Eziokwu, na Ndụ

Jizọs kụziri otú mmadụ ga-esi bịakwute Chineke.

ISI NKE 120

Ịbụ Alaka Na-amị Mkpụrụ na Ịbụ Ndị Enyi Jizọs

Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si “amị mkpụrụ”?

ISI NKE 121

“Nweenụ Obi Ike! Emeriwo M Ụwa”

Olee otú Jizọs si merie ụwa ebe ọ bụ na e gburu ya?

ISI NKE 122

Ekpere Mmechi Jizọs Kpere n’Ọnụ Ụlọ Dị n’Elu

Jizọs mere ka a ghọta ihe kacha mkpa karịa inweta ndụ ebighị ebi

ISI NKE 123

Ekpere Jizọs Kpere Mgbe Ihe Na-ewute Ya Nke Ukwuu

Gịnị mere Jizọs ji kpee ekpere, sị: “Wepụ iko a n’ebe m nọ”? Ọ̀ chọrọ ịgbara àjà Chineke chọrọ ka o jiri ndụ ya chụọ ọsọ, bụ́ ihe a ga-eji gbapụta ụmụ mmadụ?

ISI NKE 124

A Raara Kraịst Nye Ma Jide Ya

Judas chọtara Jizọs n’agbanyeghị na chi ejiela.

ISI NKE 126

Pita Agọnahụ Jizọs n’Ụlọ Keyafas

Olee otú Pita si gọnahụ Jizọs ozugbo ebe ọ bụ na okwukwe ya bụ a kwaa a kwụrụ?

ISI NKE 127

Ndị Sanhedrin Ekpee Jizọs Ikpe, Mechaa Kpọgara Ya Paịlet

Ndị ndú okpukpe ndị Juu ekwupụta ihe bụ uche ha.

ISI NKE 128

Paịlet na Herọd Achọpụta na Aka Jizọs Dị Ọcha

Gịnị mere Paịlet ji ziga Jizọs na nke Herọd ka Herọd kpee ya ikpe? Ọ̀ bụ na Paịlet enweghị ikike ikpe Jizọs ikpe?

ISI NKE 129

Paịlet Agwa Ndị Juu, Sị: “Lee Nwoke Ahụ!”

Paịlet chọpụtadịrị na Jizọs dị nwayọọ ma jide onwe ya.

ISI NKE 130

Paịlet Akpọnye Ndị Juu Jizọs, Ha Akpọrọ Ya Gaa Igbu

Gịnị mere Jizọs ji gwa ụmụ nwaanyị na-ebere ya ákwá ka ha bewere onwe ha na ụmụ ha ákwá kama ibere ya ákwá?

ISI NKE 131

Eze Aka Ya Dị Ọcha Anọrọ n’Elu Osisi Na-ahụsi Anya

Jizọs ekwee otu n’ime ndị omekome a kpọgidere ya na ya n’osisi nkwa.

ISI NKE 132

“N’ezie, Nwoke A Bụ Ọkpara Chineke”

Ọchịchịrị ahụ dị egwu gbaranụ n’ehihie, oké ala ọma jijiji ahụ merenụ, na ákwà mgbochi ahụ nke kewara abụọ n’ụlọ nsọ gosiri na Jizọs bụ Ọkpara Chineke.

ISI NKE 133

A Kwadebere Ozu Jizọs ma Buru Ya Gaa Lie

Gịnị mere ndị Juu ji chọọ ka e lie Jizọs ngwa ngwa tupu anyanwụ adaa?

ISI NKE 134

Ili Jizọs Atọgbọrọ Chakoo n’Ihi na A Kpọlitela Ya n’Ọnwụ

Mgbe a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ, o bu ụzọ pụta n’ihu onye na-eso ụzọ ya nwaanyị kama ịpụta n’ihu ndịozi ya.

ISI NKE 135

Jizọs Apụta n’Ihu Ọtụtụ Ndị Mgbe A Kpọlitechara Ya n’Ọnwụ

Olee otú Jizọs si gosi ndị na-eso ụzọ ya na a kpọlitela ya n’ọnwụ?

ISI NKE 136

Mgbe Jizọs Nọ n’akụkụ Oké Osimiri Galili

Jizọs jụrụ Pita ajụjụ ugboro atọ iji chetara Pita otú ọ ga-esi gosi na ọ hụrụ ya n’anya.

ISI NKE 137

Ọtụtụ Narị Mmadụ Hụrụ Jizọs Tupu E Mee Ememme Pentikọst

N’oge a kpọlitechara Jizọs n’ọnwụ na tupu ya alaghachi eluigwe, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya ihe ha ga-enweta nakwa ihe ha ga-eji ya eme.

ISI NKE 138

Kraịst Anọrọ n’Aka Nri Chineke

Gịnị ka Jizọs ga-eme ka ọ na-eche oge ọ ga-ebibi ndị iro ya?

ISI NKE 139

Jizọs Emee Ka Ụwa Ghọọ Paradaịs ma Rụchaa Ọrụ Chineke Nyere Ya

Jizọs ka nwere ọtụtụ ihe ndị ọ ga-eme tupu ya enyefee Chineke bụ́ Nna ya Alaeze.

Ị Chọọ Iṅomi Jizọs, Bụrụ . . .

Jizọs kpara àgwà asatọ Chineke chọrọ ka anyị na-akpa ọtụtụ ugboro n’oge niile ọ nọ n’ụwa.

Amaokwu Baịbụl Ndị Dị n’Akwụkwọ A

Jiri ebe a e depụtasịrị amaokwu Baịbụl chọta ebe a kọwara amaokwu ndị dị na Matiu, Mak, Luk, na Jọn n’akwụkwọ a.

Ihe Atụ Ndị Jizọs Mere

Chọta ebe a tụlere nke ọ bụla n’akwụkwọ a.

Amụma Ụfọdụ E Buru Gbasara Mesaya

Jiri ihe a mata ihe ndị mere ná ndụ Jizọs, bụ́ ndị gosiri na ọ bụ ya bụ Mesaya ahụ, nakwa ebe ndị e buru ha n’amụma na Baịbụl. Ị ga-ahụkwa ebe ndị a kọwara ha n’akwụkwọ a.

Ebe Ndị Jizọs Biri na Ebe Ndị Ọ Kụziri Ihe

Ị ga-ahụ ebe ndị Jizọs jere ozi na map a.