Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!

Obi eruola ọtụtụ nde mmadụ ala taa, ha ana-enwekwa ezigbo obi ụtọ n’ihi na Chineke na-achị ha. Ị̀ chọrọ ka Chineke chịa gị?

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Olee otú okwu ahụ na-atọ ụtọ Nwanna C.T. Russell gwara ndị Betel n’abalị abụọ n’ọnwa Ọktoba, afọ 1914, sirila bụrụ eziokwu?

ISI NKE 1

“Ka Alaeze Gị Bịa”

Ihe Jizọs kacha kụziere ndị mmadụ bụ gbasara Alaeze Chineke. Olee otú anyị ga-esi na-ege Ọkpara Chineke ntị?

ISI NKE 2

Alaeze Chineke Amalitela Ịchị n’Eluigwe

Olee ndị nyeere ezigbo ndị na-eso ụzọ Kraịst aka ịkwadebe maka Alaeze Chineke? Olee ihe ndị na-egosi na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị n’eziokwu?

ISI NKE 3

Jehova Na-eme Ka A Mata Ihe O Zubere

Mgbe Chineke kere ụwa, Alaeze Mesaya ò so n’ihe ndị o zubere ime? Olee otú Jizọs si mee ka anyị ghọtakwuo ihe gbasara Alaeze Chineke?

ISI NKE 4

Jehova Na-eme Ka E Too Aha Ya

Gịnị ka Alaeze Chineke merela gbasara aha Chineke? Olee otú i nwere ike isi mee ka e doo aha Chineke bụ́ Jehova nsọ?

ISI NKE 5

Eze Alaeze Chineke Emeela Ka A Ghọtakwuo Ihe Gbasara Alaeze Ahụ

Gụọ ebe a ka ị ghọtakwuo ihe gbasara Alaeze Chineke, ndị ga-achị na ya, ndị ha ga-achị, na otú ha ga-esi gosi na ha na-akwadosi Alaeze ahụ ike.

ISI NKE ISII

Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma​—⁠Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Na-eji Obi Ha Niile Ewepụta Onwe Ha

Gịnị mere obi ji sie Jizọs ike na a ga-enwe ndị ji obi ha na-ezisa ozi ọma n’oge ikpeazụ a? Olee otú ị ga-esi egosi na i bu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke?

ISI NKE 7

Otú Anyị Si Ezi Ozi Ọma​—⁠Anyị Na-esi Ụzọ Dị Iche Iche Ezi Ndị Mmadụ Ozi Ọma

Gụọ ihe ọhụrụ ndị Chineke ji na-ezi ọtụtụ mmadụ ozi ọma tupu ọgwụgwụ eruo.

ISI NKE 8

Ihe Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma​—⁠Anyị Na-ebipụta Akwụkwọ Ndị Anyị Ji Ezi Ozi Ọma n’Ụwa Niile

Olee ihe ndị na-egosi na Eze anyị na-akwado akwụkwọ ndị anyị na-asụgharị? Olee uru akwụkwọ anyị barala nke na-egosi na Alaeze Chineke bụ ọchichị dị adị?

ISI NKE 9

Uru Ozi Ọma A Na-ezi Bara​—⁠‘Ihe A Kụrụ n’Ubi Achaala Maka Owuwe Ihe Ubi’

Jizọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ihe abụọ dị mkpa gbasara ime ka ndị mmadụ bata n’ọgbakọ. Olee otú ihe ndị ahụ si gbasa anyị taa?

ISI NKE 10

Eze Alaeze Chineke Na-eme Ka Ndị Ya Dị Ọcha

Olee ihe jikọtara Krismas na obe?

ISI NKE 11

Otú E Si Na-eme Ka Ndị Chineke Na-akpakwu Àgwà Ọma​—⁠Ka Ha Na-adị Nsọ Ka Chineke

N’ọhụụ Ezikiel hụrụ, ọ hụrụ ọnụ ụzọ ámá ndị e si abanye n’ụlọ nsọ Chineke, hụkwa ụlọ ndị nche a rụrụ. Kemgbe 1914, ihe anyị ghọtara ọhụụ a pụtara abaarala anyị ezigbo uru.

ISI NKE 12

Ndị A Haziri Ijere “Chineke nke Udo” Ozi

O nwere ebe Baịbụl kpọrọ Chineke Chineke nke udo, kama ịkpọ ya Chineke nke na-ahazi ihe ahazi. Maka gịnị? Oleekwa otú o si gbasa Ndị Kraịst taa?

ISI NKE 13

Okwu Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke Wepụrụ n’Ụlọikpe

Ụfọdụ ndị ọkàikpe e nwere n’oge a na-eme ihe Gameliel, onye na-akụzi Iwu, mere n’oge ndịozi Jizọs.

ISI NKE 14

Iji Obi Anyị Niile Na-akwado Naanị Ọchịchị Chineke

Mgbe a na-emekpọ Ndịàmà Jehova ọnụ maka na ha jụrụ iso na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, ndị a na-echetụdịghị n’echiche na ha ga-agbatara ha ọsọ enyemaka gbataara ha ọsọ enyemaka.

ISI 15

Otú Anyị Si Mee Ihe Niile Anyị Nwere Ike Ime Ka E Kwe Anyị Ịna-efe Chineke Otú Ọ Chọrọ

Ndị Chineke emeela ihe niile ha nwere ike ime ka e kwe ha ịna-erubere Chineke isi.

ISI NKE 16

Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova

Olee otú anyị ga-esi eme ka ọmụmụ ihe ndị anyị na-aga efe Jehova baara anyị ezigbo uru?

ISI NKE 17

Otú E Si Azụ Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze Chineke

Olee otú ụlọ akwụkwọ ndị e nwere ná nzukọ Jehova sirila nyere anyị anyị aka ije ozi anyị nke ọma?

ISI NKE 18

Otú Anyị Si Enweta Ego Anyị Ji Arụ Ọrụ Ndị Gbasara Alaeze Chineke

Olee ebe anyị si enweta ego? Olee otú anyị si emefu ya?

ISI NKE 19

Ịrụ Ụlọ Ndị E Ji Na-eto Jehova

Ebe ndị a na-anọ efe Chineke na-eme ka a na-eto Chineke. Ma, e nwere ihe na-aka eme ya obi ụtọ.

ISI NKE 20

Ịgbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka

Olee otú anyị si mara na ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ụmụnna anyị so n’ozi dị nsọ anyị na-ejere Jehova?

ISI NKE 21

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Bibie Ndị Iro Ya

I nwere ike ijikere ugbu a maka agha Amagedọn.

ISI NKE 22

Chineke Ga-eji Alaeze Ya Mee Uche Ya n’Ụwa

Olee ihe ga-eme ka obi sie gị ike na Jehova ga-emezu nkwa niile o kwere?