Akwụkwọ Mgbaafọ Ndịàmà Jehova nke Afọ 2014

Gụọ gbasara otú ọrụ anyị si aga na Siera Lion na Gini. Ị ga-ahụkwa akụkọ ndị si ebe dị iche iche n’ụwa nke ga-agba gị ume.

Isiokwu Afọ 2014

Ihe Ndịàmà Jehova jiri mere isiokwu afọ 2014 bụ “Ka Alaeze Gị Bịa.”​—⁠Matiu 6:10

Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Òtù Na-achị Isi

Ị gụọ akwụkwọ ozi Òtù Na-achị Isi detaara anyị, ọ ga-agba gị ume.

Ọgbakọ Jehova Na-aga n’Ihu

O doro anya na Jehova kwadoro ka e bupụ isi ụlọ ọrụ anyị na Niu Yọk Siti gaa Wọwik.

E Ji JW.ORG Ezi “Mba Niile” Ozi Ọma

Ihe dị n’ebe anyị na-edebe ihe n’Ịntanet na-enyere anyị aka izi “mba niile” ozi ọma.

Obi Dị Ha Ụtọ Maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET

Ọtụtụ ndị detara akwụkwọ ozi ekele maka Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N’ỊNTANET.

Katuun Anyị Na-atọ Ụmụaka Ezigbo Ụtọ

Gụọ gbasara otú vidio a si na-enyere ezinụlọ dị iche iche aka, na-emekwa ka ụmụaka na-akpa ezigbo àgwà.

Ile Ihe Ndị Ga-eme Gị Obi Ụtọ

Gụọ banyere ihe ndị merela n’ọgbakọ Jehova kemgbe afọ 33.

Ikpe Gbasara Ndịàmà Jehova

Okwu ndị a gbasara Ndịàmà Jehova nọ ná mba iri na abụọ ka dị n’ụlọikpe. Ha na-egosikwa na a ka nwere ike ịna-emegide Ndịàmà Jehova maka ihe ha kweere.

Ihe Ndị Mere n’Ebe Dị Iche Iche n’Ụwa

Ndịàmà Jehova na-agba mbọ arụ ebe mara mma ha na-anọ efe Chineke.

Alaka Ụlọ Ọrụ Ndị E Nyefere Jehova

Gụọ banyere alaka ụlọ ọrụ ndị e nyefere Jehova.

Afrịka

Ndị nọ n’Afrịka na-ege ntị n’ozi ọma, ọ na-emekwa ka ha gbanwee àgwà ọjọọ ha. Gụọ banyere otu onye bụbu onye aṅụrụma na-aṅụcha mkpụrụ sịga iri isii kwa ụbọchị.

Amerịka na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Akụkọ ndị a kọrọ ebe a ga-eme ka ị mata na ịhụ ndị ọzọ n’anya na ịkụziri ha Baịbụl na-aba uru.

Eshia, Izrel na Mba Ndị Gbara Ya Gburugburu

Mbọ a na-agba n’ikwusa ozi ọma na-aba uru. Gụọ otú e si nyere otu nwoke kpuru ìsì, daakwa ogbi aka ịmata na ọnọdụ ya na-emetụ Chineke n’obi.

Yurop

Mmadụ nwere ike ịkpọ ndị ọzọ asị n’ihi ihe ọjọọ ọ nụrụ banyere ha. Gụọ otú otu ihe omume redio si mee ka e lewe Ndịàmà Jehova anya ọma.

Mba Ndị Dị n’Oké Osimiri Pasifik

O nwere ndị e ji akwụkwọ ozi akụziri Baịbụl n’obodo Kraịstchọọchị dị na Niu Ziland. Gịnị mere ụfọdụ ji akpọ ya “Akwụkwọ Ozi Si n’Aka Chineke?”

Ihe Ndị Ị Ga-eburu n’Uche Gbasara Siera Lion na Gini

Gụọ ihe gbasara ndị Siera Lion na ndị Gini. Gụọkwa gbasara okpukpe ha, na asụsụ ha.

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Mbụ)

N’afọ 1915, otu Onyeàmà Jehova bịara biri na Fritaụn. Ọ bụ ya bụ Onyeàmà Jehova mbụ bịara ebe ahụ. Ọtụtụ ndị chọrọ ịmụ Baịbụl.

1915-​1947 Mgbe A Malitere Ikwusa Ozi Ọma na Siera Lion Nakwa na Gini (Agba nke Abụọ)

Ndị ụkọchukwu kpara nkata ka ha mechie ndị Chineke ọnụ, ma Jehova ‘ji ọdachi nke ha laa ha n’iyi.’

“Ị Gaghị Agaru Ya Otu Afọ Nwụfuo”

Zachaeus Martyn na-arị ugwu, na-arịda ugboro abụọ n’izu iji gaa ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ọ na-aga kilomita asatọ n’ụkwụ. Olee ihe kara ya obi o ji kweta na ya amatala eziokwu dị na Baịbụl?

Ha Na-akpọ Ya “Bible” Brown

William R. Brown kwusara ozi ọma n’ọtụtụ ebe n’agwaetiti Karịbian nakwa n’obodo ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka. Gụọ ka ị mata ihe mere o ji kwere na o nweghị ihe karịrị mmadụ iji ndụ ya jeere Jehova ozi.

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Mbụ)

A ga-aga ọtụtụ ebe zie ndị mmadụ ozi ọma. E zigara ndị ozi ala ọzọ ka ha gaa nyere ndị mmadụ aka ịmụta eziokwu dị na Baịbụl.

Ha Chọrọ Ile Ya

N’afọ 1956, ụmụnna nọ na Fritaụn dị na Siera Lion lere fim a na-akpọ The New World Society in Action. È nwere ndị ọzọ ga-ekwe ịbịa lee ya?

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Atọ)

Gịnị mere ndị òtù Poro so ná Ndị Omeiwu ji kwuo ka a machie Ndịàmà Jehova ịna-ekwusa ozi ọma?

Òtù Nzuzo

Olee otú òtù nzuzo ndị dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Afrịka si emetụta ndụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị nọ n’òtù ndị ahụ?

‘Ime Ka Ọtụtụ Mmadụ Bụrụ Ndị Ezi Omume’ n’Afọ 1945 Ruo n’Afọ 1990​—⁠Dan. 12:⁠3. (Agba nke Anọ)

Ọgbakọ haziri klas a na-amụ otú e si agụ maka inyere ndị ọzọ aka ịmụtakwu Baịbụl. Ka ọtụtụ na-amụtakwu ka e si agụ, ọ bịara dị mkpa ka a sụgharịa akwụkwọ anyị n’asụsụ ha.

Baajị Mgbakọ Ha Bụ “Akwụkwọ Ikike” Ha Ji Gafere

Olee otú ndị si mba ọzọ gaa mgbakọ na Gini si bata Gini n’ejighị akwụkwọ ikike?

Jehova Enyerela M Ezigbo Aka

Jay Campbell, onye ọrịa polio kpọnwụrụ ụkwụ, chọrọ ịga Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ. Ọ sịrị na ya ga-eji ihe ya ji aga ije gaa ọmụmụ ihe ahụ. Ọ̀ garuru agaru?

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Mbụ)

N’agbanyeghị na a na-alụ agha, Ndịàmà Jehova nọ na-enye ụmụnna ha na ndị ọzọ ihe e ji ebi ndụ, na-ejikwa Baịbụl akasi ha obi. Gịnị nyeere ha aka ịkata obi n’oge ahụ ihe siiri ha ike?

‘Ihe Isi Ike Kpụ Ọkụ n’Ọnụ’ n’Afọ 1991 Ruo n’Afọ 2001​—⁠Aịza. 48:10 (Agba nke Abụọ)

N’agbanyeghị agha a nọ na-alụ, Ndịàmà Jehova “nọ na-akụzi ihe n’akwụsịghị akwụsị, [na-ezisakwa] ozi ọma.”

Esi M na Nwata Bụrụ Onye Agha, Ma Ugbu A, Abụ M Ọsụ Ụzọ Oge Niile

Otu nwa okorobịa bụ́ onye agha nnupụisi chetara otú Ndịàmà Jehova si nabata ya nke ọma mgbe ọ gara ọmụmụ ihe ha. Gịnị mere o ji gbanwee ndụ ya?

Anyị Gbanahụrụ Ndị Agha Nnupụisi

N’afọ 1991, mgbe agha biiri ọkụ, ala ana-agba ghara ghara na Pendembu, ana-egbukwa ndị mmadụ n’ike n’ike, gịnị mere e gbughị Ndịàmà Jehova ụfọdụ?

Nwoke Ụlọ Nche

N’oge a na-alụ agha, otu nwoke Onyeàmà Jehova na-esi Fritaụn ewega akwụkwọ ozi na Kọnakrị dị na Gini. Ọ na-esikwa na Kọnakrị buru akwụkwọ anyị lọta Fritaụn. Olee otú o si eme ya?

Ihe Ka Dayamọnd Mma

Tamba Josiah rụrụ ọrụ n’ebe a na-egwute dayamọnd tupu ya abụrụ Onyeàmà Jehova. Gịnị mere o ji chee na ya achọtala ihe ka dayamọnd mma?

Otú Ihe Si Kwụrụ Malite n’Afọ 2002 Ruo n’Afọ 2013 (Agba nke Mbụ)

Mgbe agha biri, a malitere ọtụtụ ọgbakọ ọhụrụ, na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze n’ebe dị iche iche, na-ezigakwa ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ebe e nwere Ndịàmà Jehova ole na ole.

Otú Ihe Si Kwụrụ Malite n’Afọ 2002 Ruo n’Afọ 2013 (Agba nke Abụọ)

Obi siri Ndịàmà Jehova nọ na Siera Lion na Gini taa ike na ọtụtụ ndị obodo ha ka ga-abata n’ọgbakọ.

Ekpebisiri M Ike Ife Jehova

Philip Tengbeh na nwunye ya gbara ọsọ ndụ mgbe ndị agha nnupụisi batara n’obodo ha bụ́ Koindu. Ha nọ n’ogige ndị gbara ọsọ ndụ nyere ụmụnna ha aka ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ise.

Obodo Siera Lion Tọwara M Ụtọ

Cindy McIntire bụ onye ozi ala ọzọ kemgbe afọ 1992 n’Afrịka. O kwuru ihe mere izi ozi ọma na Siera Lion ji atọ ya ụtọ karịchaa.

Ihe Ndị Mere n’Afọ 1914

Afọ 1914 bụ afọ Ndị Mmụta Baịbụl nọ na-atụ anya ya kemgbe.