Gaa n'Isiokwu

JENỤWARỊ 28, 2016
Azerbaijan

A Tọhapụla Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova na Mkpọrọ Na-ekwesịghị Ekwesị A Tụrụ Ha

A Tọhapụla Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova na Mkpọrọ Na-ekwesịghị Ekwesị A Tụrụ Ha

N’abalị iri abụọ na asatọ n’ọnwa Jenụwarị afọ 2016, a kpọpụtara Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova n’ụlọ mkpọrọ. Ha anọọla n’ụlọ mkpọrọ a ruo ọnwa iri na otu. Ọkàikpe bụ́ Akram Gahramanov mara ha ikpe ma kwuo na ha ga-akwụ nnukwu ego (7,000 manat, ya bụ, ihe dị ka ₦851,132) naanị maka na ha na-enye ndị mmadụ broshọ e ji amụ Baịbụl. O mechara kagbuo ụgwọ ahụ n’ihi na ụmụ nwaanyị abụọ a anọọla n’ụlọ mkpọrọ kemgbe abalị iri na asaa n’ọnwa Febụwarị afọ 2015. Ọkàikpe a leghaara ihe Òtù Mba Ụwa gwara ha mee anya. Òtù Mba Ụwa gwara ha ka ha tie ụmụ nwaanyị abụọ a aka n’obi maka mkpọrọ na-ekwesịghị ekwesị ha tụrụ ha.

N’agbanyeghị na ezigbo ahụ́ adịghị Irina Zakharchenko na Valida Jabrayilova, obi dị ha ụtọ na a tọhapụrụ ha. Ha alọtala n’ụlọ ha, ha agbakewekwala.