Gaa n'Isiokwu

DISEMBA 9, 2013
South Korea

Gọọmenti Saụt Koria Akpọpụtala Ọtụtụ Ndị Jụrụ Ịrụ Ọrụ Agha n’Ihi Akọnuche Ha n’Ụlọ Mkpọrọ A Na-atụba Ndị Omekome

Gọọmenti Saụt Koria Akpọpụtala Ọtụtụ Ndị Jụrụ Ịrụ Ọrụ Agha n’Ihi Akọnuche Ha n’Ụlọ Mkpọrọ A Na-atụba Ndị Omekome

Gọọmenti Saụt Koria emeela ka ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ kurutụ ume ndụ. Olee otú ha si mee ya? Otú ha si mee ya bụ na ha kpọpụtara Ndịàmà Jehova a a tụrụ mkpọrọ maka na akọnuche ha ekweghị ha rụọ ọrụ agha n’ebe a na-edowe ndị mkpọrọ ndị ọzọ.

Ihe mere e ji mee ihe a bụ n’ihi ihe ndị na-anọchite anya Ndịàmà Jehova na Koria na ndị a ma ama na-ahụ maka ụlọ mkpọrọ niile dị na Koria kwubiri ná nnọkọ ha nwere na Disemba afọ 2012. Ndị a na-anọchite anya Ndịàmà Jehova kwuru na obi adịghị ha mma na a na-atụbakọta ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova na ndị omekome n’otu ụlọ mkpọrọ. Nwa otu n’ime ndị a na-anọchite anya Ndịàmà Jehova so ná ndị a nọ n’ụlọ mkpọrọ. N’ime ọnwa ise ha nwechara nnọkọ a, a kpọpụtara ọtụtụ n’ime Ndịàmà Jehova ahụ a tụbakọtara ha na ndị omekome n’otu ụlọ mkpọrọ, kpọgazie ha n’ụlọ mkpọrọ ebe ha na Ndịàmà Jehova ibe ha nọ.

O teela gọọmenti Saụt Koria tụwara ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ha mkpọrọ. Ọ bụghị taa ka gọọmenti Saụt Koria bidoro tụwa Ndịàmà Jehova mkpọrọ maka na ha ekweghị aga agha n’ihi ihe ha mụtara na Baịbụl. N’oge a na-ede ihe a, ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ narị Ndịàmà Jehova isii nọ n’ụlọ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ha. A gbakọta Ndịàmà Jehova ole ha tụrụla mkpọrọ n’ime afọ iri isii gara aga maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha, ha akarịala puku mmadụ iri na asaa. Gọọmenti Saụt Koria mere ya ka ọ bụrụ iwu na nwoke ọ bụla nọ n’agbata afọ iri na itoolu na afọ iri atọ na ise ga-arụrịrị ọrụ agha a.

E nweela ọtụtụ Ndịàmà Jehova a mara ikpe ma tụọ mkpọrọ, e mechaakwa mee ụmụ ha otu ihe ahụ, meekwa ya ụmụ ụmụ ha. Otu nwoke aha ya bụ Seungkuk Noh kwuru, sị: “A tụbara m n’otu ụlọ mkpọrọ ahụ a tụbara nna m mgbe ọ ka bụ nwa okorobịa. Otú e si eme ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ a n’oge ahụ ka bụkwa otú e si eme ndị nọ ya ugbu a.” Seungkuk Noh nọzuru mkpọrọ afọ atọ ya n’afọ 2000. Taa, ọ bụzi mkpọrọ otu afọ na ọnwa isii ka a na-atụkarị ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha. Gọọmenti Saụt Koria enwebeghịkwa ọrụ nkịtị ha wepụtara maka ndị na-achọghị ịrụ ọrụ agha.

Ho Gyu Kang dị afọ iri abụọ na otu mgbe a tụrụ ya mkpọrọ maka na o kweghị abụ onye agha. Nke ahụ bụ nke mbụ a na-akpọpụ ya n’ebe ndị ezinụlọ ha bi. Kang kwuru, sị: “Ụjọ nọ na-atụ m, ahụ́ nọkwa na-ama m ririri.” A tụrụ ya na nwa okorobịa ọzọ bụ́ Onyeàmà Jehova mkpọrọ n’ebe a tụbara ndị mkpọrọ e weere na ha enwekwaghị mmekwata. Ụfọdụ n’ime ndị a ha na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ bụ ndị gburu ọchụ na ndị nọ n’òtù ọjọọ.

N’oge niile ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova nọ n’ụlọ mkpọrọ, ndị mkpọrọ ibe ha na-emesikarị ha ike ma na-akpaso ha àgwà ọjọọ ebe ọ bụ ha na-abụkarị ndị kacha bụrụ nwata n’ụlọ mkpọrọ ha nọ. Ọ na-abụkarị ha ka ndị ha na ha nọ n’ụlọ mkpọrọ na-enwe mmasị ịchọ okwu, ya emezie ka ọ na-esiri ha ike ikpe ekpere, ịmụ Baịbụl na ime ihe ndị ọzọ ha ji efe Chineke. Ọ bụ ihe a ka ọtụtụ ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova na-edi site n’afọ ruo n’afọ n’ihi na a tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ a tụbara ndị omekome.

Ihe a mba Saụt Koria bidoro ime bụ ihe mba ndị ọzọ na-eme. Mkpọpụta a gọọmenti Saụt Koria kpọpụtara ọtụtụ Ndịàmà Jehova n’ebe a tụbara ndị omekome dabara ná Nkebi nke 8 nke Otú Òtù Mba Ụwa Kwekọrịtara Ka E Si Na-emeso Ndị Mkpọrọ. Ihe a gọọmenti Saụt Koria bidoro ime bụ ihe mba Gris, so n’Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop, na-eme kemgbe ihe karịrị afọ iri abụọ. Mba Gris bidoro ime ya mgbe ndị na-arụ na Ministri Na-ahụ Maka Ichekwa Obodo kwadoro ka a kpọpụta Ndịàmà Jehova na-ekweghị aga agha n’ebe ndị mkpọrọ ndị ọzọ nọ ma tinye ha n’ụlọ mkpọrọ ọzọ. N’afọ 1992, Ministri a ji ụlọ ndị agha dị na Sindos, dị na Tesalonaịka merezie ụlọ mkpọrọ ebe a ga na-atụba naanị Ndịàmà Jehova. Otu ozi si n’aka ụlọ ọrụ gọọmenti kwuru na ihe mere Ministri a ji meere Ndịàmà Jehova ụlọ mkpọrọ nke ha iche bụ na ‘ha chebaara Ndịàmà Jehova echiche n’ihi ụdị ndị ha bụ.’ Mba Gris kwụsịrị ịtụ Ndịàmà Jehova na-ekweghị arụ ọrụ agha mkpọrọ n’afọ 1998.

Mkpọpụ a gọọmenti Saụt Koria kpọpụrụ ọtụtụ ndị mkpọrọ bụ́ Ndịàmà Jehova iche gosikwara na ha na-echebara ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova echiche, bụ́ ndị ha tụrụ mkpọrọ maka na ha kwenyesiri ike n’ihe ndị ha mụtara na Baịbụl. a E meekwala ihe a n’ọtụtụ ebe a na-akpọchi ndị mmadụ na n’ụlọ mkpọrọ ebe e nwere ọtụtụ Ndịàmà Jehova. Otu Onyeàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ n’ụlọ mkpọrọ dị na Gunsan kwuru uru ihe a e mere baarala ha. Ọ sịrị: “Anyị anaghịzi ahụ ndị nwere ike ime anyị ka anyị mewe omume rụrụ arụ ka ha, o nweghịzikwa ndị na-agwa anyị okwu ọjọọ. Anyị na ụmụnna anyị na-anọkọzi na-ekwu ihe ndị gbasara ofufe Jehova.”

‘Anyị anaghịzi ahụ ndị nwere ike ime anyị ka anyị mewe omume rụrụ arụ, anyị na-ekwurịtazi ihe ndị gbasara ofufe Jehova’

Ihe ndị ọzọ a na-emebeghị gbasara ndị akọnuche ha na-ekweghị ha rụọ ọrụ agha. Ọ bụ eziokwu na mbọ gọọmenti Saụt Koria gbara tinye Ndịàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ nke ha dị mma, ma ha emebeghị ihe mba ndị ọzọ merela kemgbe iji mee ka okwu gbasara mmadụ ịjụ ịrụ ọrụ agha bie. Dị ka ihe atụ, kemgbe 1997, mba Gris wepụtara ọrụ nkịtị ha ga na-enye ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha. Jamanị na-enyebu ndị na-achọghị ịrụ ọrụ agha ọrụ nkịtị. Ma, n’afọ 2011, ha mechaziri mechie ịkpọ ndị mmadụ ka ha bịa rụọ ọrụ agha. Mba Taịwan mere iwu n’afọ 2000 ka a na-enye ndị akọnuche ha na-ekweghị ha rụọ ọrụ agha ọrụ nkịtị.

Ụmụ okorobịa Saụt Koria bụ́ Ndịàmà Jehova na ndị ezinụlọ ha na-atụ anya na otu ụbọchị, mba ha ga-emekwa ihe ndị mba ndị ọzọ kwekọrịtara ịna-eme n’okwu gbasara mmadụ inwere onwe ya ịjụ ihe akọnuche ya na-anabataghị.

a Iwu na-achị mba niile kwuru na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. Iwu jikwa mba Saụt Koria ime ihe iwu a kwuru. Gụọ isiokwu bụ́ “Ọtụtụ Mba Akatọọla Ikpe Na-ezighị Ezi A Na-ekpe na Saụt Koria..”