Gaa n'Isiokwu

ỌKTOBA 1, 2013
South Korea

Ọtụtụ Mba Akatọọla Ikpe Na-ezighị Ezi A Na-ekpe na Saụt Koria

Ọtụtụ Mba Akatọọla Ikpe Na-ezighị Ezi A Na-ekpe na Saụt Koria

Ndị ọchịchị Saụt Koria atụọla ọtụtụ ụmụ nwoke aka ha dị ọcha mkpọrọ. Ihe mere ha ji tụọ ha mkpọrọ bụ na ha bụ Ndịàmà Jehova, nakwa na ha ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ha anabataghị ya. Ndị ọchịchị Koria ekweghịkwa na mmadụ nwere ike ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. N’ime afọ iri isii gara aga, a tụrụ Ndịàmà Jehova karịrị puku iri na asaa mkpọrọ maka na ha jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ha.

Iji mee ka ọhaneze mara ihe na-emenụ, ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Saụt Koria bipụtara broshọ a na-akpọ  Conscientious Objection to Military Service in Korea (ya bụ, Mmadụ Ịjụ Ịrụ Ọrụ Agha na Koria n’Ihi Akọnuche Ya). Broshọ a kwuru otú ndị ọchịchị Koria si jụ ime ihe ha na mba ndị ọzọ kwekọrịtara, ya bụ, ịhapụ ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha ka ha nọọrọ onwe ha. A kọkwara gbasara ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova a tụrụ mkpọrọ maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha. Maazị Dae-il Hong, onye na-ekwuchitere Ndịàmà Jehova nọ na Koria, na Philip Brumley, onyeisi ndị ọkàiwu Ndịàmà Jehova nọ na Niu Yọk, kwukwara ihe ndị ọzọ gbasara ikpe mkpegbu a e kpewere kemgbe.

Olee otú ikpe arụrụala a a na-ekpe na Saụt Koria dị mba ndị ọzọ?

Philip Brumley: E nweela mba ndị kwuru na ọjụjụ a ndị ọchịchị Koria jụrụ ịhapụ ndị na-ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị ha kweere adịghị mma. Na nso nso a, mgbe Òtù Mba Ụwa na-enwe nnọkọ ha na-adị enwe maka ileba anya n’iwu ndị ha tiri, mba Họngeri, Frans, Jamanị, Poland, Slovakịa, Spen, Amerịka, na Ọstrelia gwachara mba Koria ka ha kwụsị mmegbu ahụ ha na-emegbu ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị ha kweere ma chọọrọ ha ọrụ ọzọ ha ga na-arụ. a

Dae-il Hong: N’ikpe anọ e kpere gbasara narị mmadụ ise na otu na-ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ha anabataghị ya, Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ kwuru na ikpe ahụ ndị ọchịchị Koria kpere ndị ahụ ma tụọ ha mkpọrọ bụ ikpe mkpegbu. Kọmitii ahụ kwukwara na “ikike mmadụ nwere ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị o kweere na ikike mmadụ nwere iche ihe masịrị ya, ịjụ ihe akọnuche ya na-anabataghị, na ikpe okpukpe masịrị ya bụ otu. N’ihi ya, mmadụ nwere ikike ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na o megidere okpukpe ya ma ọ bụ ihe ndị o kweere. E kwesịghị ịnapụ mmadụ ikike a ma manye ya ka o mee ihe ọ na-achọghị ime.” b

Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ, bụ́ otu n’ime kọmitii ndị e nwere n’Òtù Mba Ụwa, kwukwara gbasara okwu a a kpụ n’ọnụ n’otu ihe o dere na nso nso a nke isiokwu ya bụ “Ihe odide gbasara mmadụ ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi na akọnuche ya anabataghị ya.” Ihe odide a kwuru na mba ụwa kwekọrịtara na mmadụ nwere ike ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị o kweere nakwa na e kwesịghị ịna-akpụpụgharị onye ahụ n’ụlọikpe ma ọ bụ na-ata ya ahụhụ iji manye ya ịrụ ọrụ agha. c

Olee ihe ndị ọchịchị Koria merela maka ihe Òtù Mba Ụwa kwuru?

Ụlọikpe Kacha Elu

Philip Brumley: Ndị ọchịchị Koria emebeghị ihe Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ sịrị ha mee. Ihe ọ pụtara bụ na ha ajụla ime ihe ha na mba ndị ọzọ kwekọrịtara, jụkwa ikweta na mmadụ nwere ike ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na akọnuche ya anabataghị ya. Ihe ọzọ bụ na Ụlọikpe Kacha Elu na Saụt Koria na Ụlọikpe Na-eleba Anya n’Ihe Gbasara Iwu Obodo kagburu akwụkwọ ndị ahụ na-ekweghị arụ ọrụ agha tinyere ka e kpegharịa ikpe ha. Ihe a ha mere gosiri na ha anabataghị ihe ahụ Kọmitii Òtù Mba Ụwa kwuru. Ndị Ome Iwu Mba Koria ewepụtabeghị ọrụ ọzọ ha ga-achọ ka ndị na-achọghị ịrụ ọrụ agha rụwa, ha emebeghịkwa ihe ọ bụla iji hụ na a kwụsịrị inye ndị na-achọghị ịrụ ọrụ agha nsogbu.

Olee otú mkpọrọ a a tụrụ ụmụ okorobịa Ndịàmà Jehova si kpaa ha aka ọjọọ?

Dae-il Hong: Ha bụ ụmụ okorobịa obi siri ike. Ha na-aga ma ndị ọchịchị kpọọ ha ka ha bịa n’agbanyeghị na ha ma na a ga-ama ha ikpe ma tụọ ha mkpọrọ. Ha anaghị agba ọsọ. Ha bụ ezigbo ụmụ amaala tupu a tụọ ha mkpọrọ, ha akwụsịghịkwa ịkpa àgwà ọma mgbe ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ma, ọ dị mwute na mgbe ha gachara mkpọrọ pụta, e denyere aha ha ná ndị omempụ e nwere n’obodo. O meziri ka o siere ha ike inweta ọrụ. Mkpọrọ a a tụrụ ha mekwara ka otu afọ na ọnwa isii ha gaara eji eme ihe bara uru laa n’iyi. O nweghịkwa aka ha nyeliiri ndị ezinụlọ ha n’oge ahụ ha nọ n’ụlọ mkpọrọ. O nweghị ihe ndị a mere mere a ga-eji taa ha ahụhụ a.

È kwesịrị ịma Ndịàmà Jehova nọ na Koria ikpe ma tụọ ha mkpọrọ ka ndị omekome maka na ha ekweghị arụ ọrụ agha?

Dae-il Hong: Mba. Ụmụ okorobịa ndị a abụghị ndị omekome. A ma Ndịàmà Jehova ama na Saụt Koria na n’ụwa niile na ha bụ ndị udo, ndị na-erube isi n’iwu, na ndị na-ewepụta onwe ha enyere ndị obodo ha aka. Ha na-akwanyekwara ndị ọchịchị ùgwù, na-atụ ụtụ isi ha, sorokwa ndị ọchịchị na-eme ihe ga-abara ọhaneze uru. Na nso nso a, otu ọkàikpe Koria mara nwa okorobịa Onyeàmà Jehova ikpe ka ọ gaa mkpọrọ maka na akọnuche ya ekweghị ya rụọ ọrụ agha. Mgbe o kwuchara na o nweghị ihe ọzọ ya ma ya ga-eme ma ọ́ bụghị ịma ya ikpe, ọ gụpụtaziri ikpe a mara nwa okorobịa ahụ. Ozugbo ọ gụpụtachara ya, o ji akwụkwọ ahụ ọ gụpụtara kpuchie ihu ya ma bewe ákwá. Ọ ga-abụ na ihe mere o ji bewe ákwá bụ na ikpe arụrụala e kpere nwa okorobịa ahụ wutere ya nke ukwuu. Anya mmiri gbakwara ndị ọzọ bịara gere ikpe ahụ n’ihi na o doro ha anya na ihe ahụ bụ ikpe mkpegbu.

Philip Brumley: Ịgwa gị eziokwu, oge eruola ka ndị ọchịchị Koria mee ihe maka nsogbu a dịwara kemgbe, hụkwa na a kwụsịrị ịta ndị akọnuche ha na-ekweghị rụọ ọrụ agha ahụhụ.

a Gụọ ihe e dere na Human Rights Council “Report of the Working Group on the Universal Periodic Review,” 12 Disemba 2012, A/HRC/22/10, peeji nke 7 na nke 22, paragraf nke 44 na nke 124.53.

b Gụọ ihe e dere na Jong-nam Kim et al. v. The Republic of Korea, communication no. 1786/2008, Views adopted by the Committee on 25 October 2012, peeji nke 7, paragraf nke 7.4

c Gụọ ihe e dere na Human Rights Council “Analytical report on conscientious objection to military service,” 3 Jun 2013, A/HRC/23/22, peeji nke 3 ruo nke 8, paragraf 6-24; peeji nke 9 na nke 10, paragraf nke 32 na nke 33.