Gaa n'Isiokwu

NỌVEMBA 16, 2022
Ukraine

IHE ỌHỤRỤ NKE 13 | Ụmụnna Anyị Na-ahụkwu Ibe Ha n’Anya n’Agbanyeghị Agha A Na-alụ na Yukren

Ha Maliteghachiri Ịga Ozi Ọma Ụlọ n’Ụlọ

IHE ỌHỤRỤ NKE 13 | Ụmụnna Anyị Na-ahụkwu Ibe Ha n’Anya n’Agbanyeghị Agha A Na-alụ na Yukren

N’Ọgọst afọ 2022, a mara ọkwa na a ga-amaliteghachi ịga ozi ọma ụlọ n’ụlọ n’ebe ndị ihe ọ bụla na-agaghị eme ụmụnna anyị na Yukren. Ọ dị ụmụnna anyị ka ha gawa agawa. Ha chọpụtara na ọtụtụ ndị na-anabatazi ozi ọma anyị. Otu n’ime ndị kwetara ka a mụwara ya Baịbụl kwuru, sị: “Ihe ọjọọ ndị m hụrụ mere ndị mmadụ na ahụhụ ha na-ata n’ihi agha ahụ a na-alụ gosiri n’eziokwu na ọ bụ naanị Chineke ga-akwụsịli ihe niile bụ́ nsogbu ndị mmadụ.” Akụkọ ndị a na-egosi otú ozi ọma si aga ebe ahụ.

Nwanna Ruslan, onye nọ n’ọgbakọ Lanivtsi tụtụrụ ụjọ mgbe e kwuru ka a maliteghachi ịga ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ya na nwunye ya kpere ekpere, rịọ Jehova ka o mee ka ha nwee obi ike nakwa ka o mee ka ha nweta ndị na-atụ anya mgbe ihe ga-adị mma n’ọdịnihu. O juru ha anya na naanị awa abụọ ha malitechara ozi ọma, mmadụ asatọ ha ziri ozi ọma kwetara ka ha bịa na-amụrụ ha Baịbụl.

Mgbe Nwanna Nwaanyị Olha, onye nọ n’ọgbakọ Kremenets, na onye ya na ya so nọ n’ozi ọma, otu nwoke gbaara ọsọ bịakwute ha ma jụọ ha ma hà na-akụziri ndị mmadụ Okwu Chineke. Ọ gwaziri ha, sị: “M na-aṅụ sịga, na-aṅụbigakwa mmaya na-aba n’anya ókè. Ama m na Chineke ga-ekpe m ikpe n’oge na-adịghị anya. M chọrọ ịgbanwe tupu mgbe ahụ.” Ka ọ dị ugbu a, a haziela ka ụmụnna ndị bi ebe ahụ mụwara nwoke a Baịbụl.

Mgbe Nwanna Vasyl, onye nọ n’ọgbakọ Lviv-Riasne-Skhidnyi, na ụmụnna ndị ọzọ nọ n’ozi ọma, o chetara ụlọ otu nwaanyị ya na ya kwuru okwu ọtụtụ afọ gara aga. O chetakwara na nwaanyị ahụ anaghị eji anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ma Nwanna Vasyl kpebiri ịkụ aka n’ọnụ ụzọ ahụ ma gwa onye ga-apụta ka ha mụwa Baịbụl. Ọ tụrụ ya n’anya na ọ bụ nwaanyị ahụ pụtara ma kwuo na ọ chọrọ ịghọta ihe dị n’Akwụkwọ Nsọ nke ọma. O kwetara ka a mụwara ya Baịbụl, a hazikwara otú a ga-esi mụwara ya ihe.

Serhii, onye nọ n’ọgbakọ Illintsi, mere baptizim n’afọ 2021. Kemgbe ahụ, ọ gatụbeghị ozi ọma ụlọ n’ụlọ. Ụjọ ịga ozi ụlọ n’ụlọ nọkwa na-atụ ya. N’ihi ya, o wepụtara ezigbo oge kwadebe akwadebe. Serhii kwuru, sị: “M lere vidio ndị na-egosi otú e nwere ike isi ezi ozi ọma ọtụtụ ugboro. Mgbe m mechara gaa ozi ọma, o doro m anya na naanị ihe dị m mkpa bụ inwe obi ike.” Obi dị anyị ụtọ na Serhii kwuru na ụjọ kwụsịrị ịtụ ya, obi abụrụzie ya sọ aṅụrị mgbe o mechara gaa zie ndị mmadụ ozi ọma.

Akụkọ Nikol yikwara nke Serhii. Nikol nọ n’ọgbakọ Rozdil. Ọ ghọrọ onye nkwusa a na emebeghị baptizim n’Ọgọst 2022. O kwuru, sị: “M na-echegbu onwe m, ụjọ na-atụkwa m ikwusa ozi ọma ihu na ihu. Ma mgbe m malitere ya, m hụrụ na e nweghị ihe na-atọ ụtọ ka ịgwa mmadụ banyere Jehova ihu na ihu.”

Ebe ụmụnna nwaanyị abụọ na-aga ozi ụlọ n’ụlọ

Ka ọ na-erula Nọvemba 11, 2022, ihe dị n’okpuru ebe a bụ otú ihe si kwụrụ n’ihe gbasara ụmụnna anyị na Yukren. E si n’aka ụmụnna anyị nọ ebe ahụ nweta ha, e jikwa ha n’aka. Ma, ebe ọ bụ na e nwere ebe ndị anyị na-anaghị enwetali ozi n’aka ụmụnna anyị, o nwere ike a gụnye ndị nọ ebe ndị ahụ, ọnụ ogụgụ ihe dị iche iche akarịa ole e dere ha ebe a.

Otú Ihe Si Dịrị Ụmụnna Anyị Ebe Ahụ

  • Ndị nkwusa 46 anwụọla

  • Ndị nkwusa 97 emerụọla ahụ́

  • Ndị nkwusa 12,569 ahapụla ụlọ ha

  • A laala ụlọ 590 n’iyi

  • E mebiela nnukwu ihe n’ụlọ 645

  • E mebiela ihe ole na ole n’ụlọ 1,722

  • A laala Ụlọ Nzukọ Alaeze 6 n’iyi

  • E mebiela nnukwu ihe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze 19

  • E mebiela ihe ole na ole n’Ụlọ Nzukọ Alaeze 63

Ịgbata Ọsọ Enyemaka

  • E hiwela Kọmitii 27 Na-agbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka na Yukren

  • Kọmitii a enyerela mmadụ 53,948 aka ha enweta ebe dị mma ha bi

  • Ndị nkwusa 25,983 agbagala mba ndị ọzọ, ụmụnna anyị nọ ebe ndị ahụ na-enyekwara ha aka