Gaa n'Isiokwu

ỌKTOBA 04, 2012
Ukraine

E Kpere Ikpe Ziri Ezi na Yukren

E Kpere Ikpe Ziri Ezi na Yukren

N’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Septemba afọ 2012, Ụlọikpe Kacha Elu na Yukren kagburu akwụkwọ a gbara Ndịàmà Jehova iji nara ha ebe ụfọdụ n’ala ha rụrụ alaka ụlọ ọrụ ha na Yukren.

Ndịàmà Jehova zụrụ ala ahụ n’afọ 1998. Ha zụkwara ya otú iwu kwuru. Ma, n’afọ 2008, onye nwebu ala ahụ gara resị ya ndị ọzọ. O resịrị ya òtù na-ahụ maka egwuregwu nke a na-akpọ Sport Development Center LLC (SDC). Na Yukren, e weere ihe a o mere ka ịnara mmadụ ihe ya na nzuzo.

Ụlọikpe dị n’ógbè ahụ na-ahụ maka azụmahịa kwuru na iwu kwadoro nresị ahụ onye nwebu ala ahụ resịrị ya ndị SDC. Mgbe Ndịàmà Jehova tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, ha ekweghị.

Ma, e mechara kpee ikpe ziri ezi. N’ọnwa Disemba afọ 2011, ụlọikpe dị elu na-ahụ maka azụmahịa kpelaara Ndịàmà Jehova. N’ọnwa Eprel afọ 2012, ndị SDC tinyere akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ, ma ụlọikpe ahụ ekweghị. Nke a gosiri na ọ bụ Ndịàmà Jehova nwe ala ahụ n’eziokwu. Mgbe ọnwa atọ gachara, ụlọikpe mkpegharị ikpe n’okwu gbasara azụmahịa na Luvif kagburu ihe ahụ ụlọikpe nke mbụ kpere, nke bụ́ na ọ bụ ndị SDC nwe ala ahụ.

Ndị SDC gbaziri mbọ ikpeazụ iji nweta ala ahụ. Ha tinyere akwụkwọ ka Ụlọikpe Kacha Elu na Yukren kpegharịa ikpe ahụ e kpere n’ọnwa Eprel. Ma, n’abalị iri abụọ na isii n’ọnwa Septemba, ụlọikpe ahụ jụrụ ikpegharị ikpe ahụ. Ha si otú a bie ikpe ahụ.

Ọ bụrụ na ikpe ahụ laara ndị SDC, ihe ọ pụtara bụ na a ga-anara Ndịàmà Jehova otu ụlọ dị n’alaka ụlọ ọrụ ahụ, nakwa ebe buru ibu n’ala ha. Ọ ga-emezi ka ọrụ ha ghara ịna-aga aga n’alaka ụlọ ọrụ ha dị na Yukren.