Gaa n'Isiokwu

ỌGỌST 6, 2020
AMERỊKA

Ajọ Ifufe A Na-akpọ Hanna Mebiri Ihe n’Ebe Ndịda Teksas

Ajọ Ifufe A Na-akpọ Hanna Mebiri Ihe n’Ebe Ndịda Teksas

Ebe ihe a mere

Teksas, nke dị n’Amerịka

Ọdachi

  • Ajọ ifufe a na-akpọ Hanna kpara mkpamkpa dị egwu n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Julaị n’afọ 2020. O mere ka idei mmiri sọba n’osimiri Teksas, nke mere ka o tojuo karịa ka ọ dị na mbụ

  • Nke a bụ nke mbụ ifufe ọjọọ na-akpa ike na Teksas n’afọ a n’osimiri Atlantik

Otú ifufe ọjọọ a si kpaa ụmụnna anyị aka ọjọọ

  • Ụmụnna anyị abụọ merụtụrụ ahụ́

  • Ajọ ifufe a mere ka ụmụnna anyị dị otu narị na iri itoolu na atọ hapụ ụlọ ha gaa biri n’ebe ọzọ

O mebiri ọtụtụ ụlọ

  • O mebitụrụ ụlọ ụmụnna anyị dị narị atọ iri anọ na asaa

  • O bibiri ụlọ ụmụnna anyị dị iri atọ na otu

A gbataara ha ọsọ enyemaka

  • Ndị nlekọta na ndị okenye ọgbakọ ụmụnna ndị a gbakọrọ aka gbaa ha ume ma kasie ha obi n’oge a ọdachi a mere

Obi dị anyị ụtọ na Jehova, bụ́ “Chineke nke nkasi obi niile,” ka na-elekọta ụmụnna anyị ndị a bi na Teksas n’oge a ihe gbata gbata ọjọọ a mere.—2 Ndị Kọrịnt 1:3, 4.