Gaa n'Isiokwu

JENỤWARỊ 1, 2013
AMERỊKA

Ndịàmà Jehova Ereela Ebe A Na-akpọbu Hotel Bossert

Ndịàmà Jehova Ereela Ebe A Na-akpọbu Hotel Bossert

AKỤKỌ a si Bruklin dị na Niu Yọk. Ndịàmà Jehova ereela ebe a na-akpọbu Hotel Bossert dị na 98 Montague Street, dị na Bruklin Haịts a ma ama, na Niu Yọk Siti. Ha resịrị ya David Bistricer, onye na-arụ n’ụlọ ọrụ a na-akpọ Clipper Equity na Chetrit Group. A rụrụ Bossert n’afọ 1909, ọ bụkwa n’afọ ahụ ka Ndịàmà Jehova bufere isi ụlọ ọrụ ha na Bruklin Haịts.

Ndịàmà Jehova bidoro ịnọ n’ụlọ ahụ n’afọ 1983. Ha mechaziri zụọ ya na 1988. Ha bidoro ozugbo rụzigharịwa ụlọ ahụ otú ụlọ ọrụ Landmarks Preservation Commission chọrọ ka ụlọ ndị a rụrụ n’ógbè ahụ dị. E nyekwara ha ihe nrite maka mbọ ha gbara rụzigharịa ụlọ ahụ ya adị otú ọ dịbu.

Na nso nso a, Ndịàmà Jehova bukọtara ebe ụfọdụ ha na-anọ arụ ọrụ na Bruklin. O mere ka ọnụ ọgụgụ ndị na-arụ ọrụ n’ebe ndị ahụ belata, meekwa ka e nwekwuo ụlọ obibi. Ha reziri ụlọ ahụ a na-akpọbu Hotel Bossert.

Onye na-ekwuchitere Ndịàmà Jehova aha ya bụ David Semonian, kwuru, sị: “Anyị ji obi anyị niile lekọta ọmarịcha ụlọ ahụ anya nke ọma n’ime afọ iri abụọ na ise a gara aga. Obi dịkwa anyị ụtọ maka otú o sirila baara anyị uru.”

Onye E Nwere Ike Ịkpọtụrụ:

David Semonian, Office of Public Information, tel. +1 718 560 5000