Gaa n'Isiokwu

ỌGỌST 4, 2017
FILIPINZ

Nnukwu Mmiri Ozuzo Zoro na Naịjirịa

Nnukwu Mmiri Ozuzo Zoro na Naịjirịa

Malite n’abalị 6 ruo abalị 12 nke ọnwa Julaị, afọ 2017, nnukwu mmiri zoro n’ebe ọdịda anyanwụ Naịjirịa. Nnukwu mmiri ozuzo a mere ka e nwee idei mmiri na steeti atọ dị na Naịjirịa. Ha bụ Legọs, Naịja na Oyo. Ndị nta akụkọ kwuru na njinji ahụ jirinụ tara, ọ dịkarịa ala, isi mmadụ iri na asatọ.

Alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova nke dị na Naịjirịa kwuru na e nweghị Onyeàmà Jehova ọ bụla merụrụ ahụ́ ma ọ bụ nwụọ ná njinji a. Ma, e nwere mmadụ anọ n’ime ha idei mmiri ahụ mere ka ha gbapụ ebe ha bi. E nwekwara Ndịàmà Jehova abụọ ụlọ ha mebitụrụ, nweekwa otu onye ụlọ ya mebiri kpamkpam. Ndịàmà Jehova nọ na Naịjirịa na-agbatara ụmụnna ha ọdachi a dakwasịrị na ndị agbata obi ha na-abụghị Ndịàmà Jehova ọsọ enyemaka. Ọtụtụ n’ime ndị agbata obi ha ndị a bụ ndị idei mmiri ahụ mebisịrị ụlọ ha ma ọ bụ mee ka ha gbapụ n’ụlọ ha.

Media Contacts:

International: David A. Semonian, Office of Public Information, +1-845-524-3000

Nigeria: Paul Andrew, +234-7080-662-020