Gaa n'Isiokwu

FEBỤWARỊ 19, 2020
AKỤKỌ SI MBA DỊ ICHE ICHE

E Nweela Baịbụl Mbụ Zuru Ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi

E Nweela Baịbụl Mbụ Zuru Ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi

N’abalị iri na ise n’ọnwa Febụwarị afọ 2020, Nwanna Geoffrey Jackson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, wepụtara akwụkwọ Baịbụl nke ikpeazụ ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka (ASL). Ọ bụ ya bụ Baịbụl mbụ zuru ezu e nwere n’asụsụ ndị ogbi n’ụwa niile. Ọ bụ mgbe a na-enyefe Jehova Ọfis Ndị Nsụgharị nke Ndị Ogbi Amerịka dị na Fọt Lọdadel dị na Flọrịda, dị n’Amerịka, ka a mara ọkwa a a na-agaghị echefu echefu. O sokwa n’ihe ndị kacha tọọ ụmụnna ụtọ n’ihe omume ahụ. Ebe a nọ nyefee Jehova Ọfis Ndị Nsụgharị ahụ bụ n’ebe Ndịàmà Jehova na-anọ enwe mgbakọ na West Palm Beach, dị na Flọrịda.

Ihe karịrị puku mmadụ abụọ na narị mmadụ ise nọ ya mgbe e nyefere Jehova Ọfis Ndị Nsụgharị ahụ, ebe puku mmadụ iri na ise ọzọ na narị isii na iri atọ na ise kiriri ya n’otu mgbe ahụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị n’Amerịka, Beliiz, Dọminikan Ripọblik, Heiti, Kanada, nakwa na Trinidad na Tobego. A gụkọta ndị niile kiriri ihe omume a, ha karịrị puku mmadụ iri na asatọ.

Mgbe Nwanna Geoffrey Jackson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, na-agba ndị mmadụ ajụjụ ọnụ n’oge a na-eme ihe omume ahụ

Mgbe Nwanna Jackson kwuchara okwu e ji nyefee Jehova Ọfis Ndị Nsụgharị ahụ, ọ mara ọkwa na e wepụtala akwụkwọ ikpeazụ ọ fọrọ ka ọ bụrụ na e nweela Baịbụl zuru ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. Mgbe ọ na-achọ imechi okwu ya, ọ sịrị: “O nwere ihe anyị chọrọ ịgwa unu. Ọ pụrụ nnọọ ezigbo iche. Ebe ọ bụ na ọ fọrọ akwụkwọ Job a anyị wepụtara taa ka ọ bụrụ na e nweela akwụkwọ Baịbụl niile ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Asụsụ Ndị Ogbi Amerịka, ọ pụtara na e nweela Baịbụl zuru ezu n’asụsụ ndị ogbi . . . O nweghị ndị ọzọ anyị ma wepụtarala akwụkwọ niile dị na Baịbụl n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka ma e wezuga anyịnwa bụ́ Ndịàmà Jehova. Ọ bụ anyịnwa gbara ndị mbụ. Ọ pụtakwara na ọ ga-abụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke asụsụ ndị ogbi a bụ Baịbụl ndị ogbi mbụ zuru ezu e nwetụrụla n’ụwa a.”

Ọ bụ akwụkwọ Job bụ akwụkwọ Baịbụl ikpeazụ e wepụtara ná Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. O wekwara afọ iri na ise iji sụgharịa akwụkwọ niile dị na Baịbụl a. Ọ bụ n’afọ 2004 ka Òtù Na-achị Isi kwadoro ka a sụgharịa Baịbụl n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka. Mgbe afọ abụọ gachara, e wepụtara akwụkwọ Matiu. E jikwa nwayọọ nwayọọ wepụta akwụkwọ Baịbụl ndị ọzọ so n’Akwụkwọ Nsọ Grik ruo n’afọ 2010. O were afọ iri iji sụgharịa akwụkwọ Baịbụl niile so n’Akwụkwọ Nsọ Hibru.

Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a e wepụtara n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, nke dị n’ụdị vidio, abaarala ndị ogbi niile na-ekiri ya uru. E nwere ihe otu onye nkwusa aha ya bụ Isias Eaton, bụ́ onye nọ mgbe a mara ọkwa na e wepụtala Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, kwuru. Ọ sịrị: “Ozugbo m lere vidio Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ahụ, m bidoro bewe ákwá. Mgbe m na-agụ Baịbụl Bekee, ihe m na-agụ anaghị eru m n’obi, ma ozugbo m bidoro lewe vidio Baịbụl ndị ogbi a, anya mmiri bidoro ịgba m.”

Nsụgharị Baịbụl a enyerela ọtụtụ ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ ndị na-eji asụsụ ndị ogbi amụ ihe aka ma ha nọrọ n’ozi ọma. Nwanna David Gonzalez, so ná ndị na-asụgharị ihe n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka n’Ọfis Ndị Nsụgharị, sịrị: “O nyerela m aka ịghọtakwu eziokwu Baịbụl, meekwa ka obi na-esikwu m ike ma m nọrọ n’ozi ọma. Tupu e wepụta Baịbụl n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, obi anaghị esicha m ike ma m nọrọ n’ozi ọma, m na-ekpekwa ekpere ka onye m gara izi ozi ọma ghara ịjụ m ajụjụ tara akpụ. Ma ugbu a e nwere Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ zuru ezu n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, m dị njikere ịza ajụjụ tara akpụ e nwere ike ịjụ m, obi na-esikwa m ike ma m nọrọ n’ozi ọma.”

Nwanna Nicholas Ahladis, bụ́ onye na-elekọta ọrụ Ngalaba Na-enyere Ndị Nsụgharị Aka n’isi ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Wọwik, dị na Niu Yọk, sịrị: “A ga-elere anya n’otú e si sụgharịa Baịbụl n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka sụgharịa ya n’asụsụ ndị ogbi ndị ọzọ. Ugbu a, a sụgharịala ebe ụfọdụ na Baịbụl n’asụsụ ndị ogbi iri na asaa, ndị ọzọ ka na-abịakwa.”

Anaghị agbagha ya agbagha na Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ a zuru ezu e nwere n’Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka ga-enyere ọtụtụ ndị ọzọ aka ka ha na Jehova dịkwuo ná mma, ebe ọ bụ na Okwu Jehova nke dị n’asụsụ ha, na-eru ha n’obi.​—⁠Ọrụ Ndịozi 2:⁠6.