MEE 11, 2018
AKỤKỌ SI MBA DỊ ICHE ICHE
Ezigbo Ịhụnanya Mere Ka Anyị Gbatara Ndị Nọ n’Agwaetiti Dị Iche Iche Ọsọ Enyemaka
Ihe ụfọdụ ị ga-ahụ na vidio a bụ otú ọrụ si aga n’ọsọ enyemaka anyị na-agbatara ndị ajọ ifufe a na-akpọ Ịma na Marịa kpara aka ọjọọ. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ anyị ndị dị na Babedọs, Frans, na Amerịka na-elekọta obodo ndị ajọ ifufe ndị a kpara mkpamkpa na ha. Ihe ndị ọzọ ị ga-ahụ na vidio a bụ otú ọtụtụ ụmụnna anyị si gbaa mbọ wepụta onwe ha nyere ụmụnna ha ọdachi ndị a bibiri ihe ha aka. Ị ga-ahụkwa mgbe Nwanna Mark Sanderson, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, na Nwanna Gary Breaux, bụ́ onye na-enyere Kọmitii Ije Ozi Aka, gara leta ụfọdụ ndị ọdachi a dakwasịrị.