Gaa n'Isiokwu

Onye a bụ Nwanna Gennady Shpakovskiy, nwunye ya, Tatiana, na nwa ya nwaanyị bụ́ Maria, mgbe o si nnọọ n’ụlọ mkpọrọ pụta

ỌGỌST 3, 2020
RỌSHỊA

A Tọhapụla Nwanna Gennady Shpakovskiy n’Ụlọ Mkpọrọ

A Tọhapụla Nwanna Gennady Shpakovskiy n’Ụlọ Mkpọrọ

Na Mọnde abalị atọ n’ọnwa Ọgọst, afọ 2020, Ụlọikpe Obodo Pskov kwuru ka a tọhapụ Nwanna Gennady Shpakovskiy n’ụlọ mkpọrọ. Ụlọikpe ahụ ka kwukwara na ikpe mara ya ma ha kwuziri na a gaghịzi atụ ya mkpọrọ afọ isii na ọkara kama ọ ga-ala, ma ha ga-eji otu oge ahụ na-ele ma ọ̀ ga na-erubekwa isi n’iwu. Ka awa ole na ole gachara ụlọikpe ahụ kwuru ihe a, a tọhapụrụ Nwanna Sphakovskiy. Ndị ọkaiwu gọọmenti ka nwekwara ike ịgba akwụkwọ ka a gbanwee mkpebi a.