Gaa n'Isiokwu

NỌVEMBA 24, 2017
RỌSHỊA

Ụlọikpe Oryol Agbatịkwuo Mkpọrọ A Tụrụ Dennis Christensen

Ụlọikpe Oryol Agbatịkwuo Mkpọrọ A Tụrụ Dennis Christensen

Mgbe e kpechara ikpe were awa atọ n’ụlọikpe Sovietsky dị na Oryol, dị na Rọshịa n’abalị iri abụọ n’ọnwa Nọvemba afọ 2017, ụlọikpe ahụ kwuru na otu nwoke aha ya bụ Dennis Christensen ka ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe a ga-eleba anya n’ikpe ya ọzọ n’abalị iri abụọ na atọ n’ọnwa Febụwarị, afọ 2018. Nke a bụ nke ugboro abụọ ụlọikpe a tinyekwuru ọnwa atọ na mkpọrọ a tụrụ ya. Ọ ka nọ n’ụlọ mkpọrọ kemgbe ndị uwe ojii gara n’ebe Ndịàmà Jehova na-amụ ihe kpụrụ ya n’ọnwa Mee n’afọ 2017.

Maazi Christensen bụ onye Denmak. Ọ bụkwa Onyeàmà Jehova. Tupu a nwuchie ya, ụlọikpe kacha elu na Rọshịa machiri ọrụ Ndịàmà Jehova iwu si na ha bụ ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru. Ụlọikpe ahụ yigharịrị ikpe ya ka ndị na-eleba anya na ya nwee ike inwetakwu “ihe akaebe” ga-egosi na ọ dara iwu. Ụlọikpe ahụ ekweghị ka a tụọ ya mkpọrọ n’ụlọ ya ruo mgbe ndị na-eleba anya n’okwu ya ga-elebacha ya anya. Ha jụkwara ige ntị n’ihe gọọmentị Denmak gwara ha na ha agaghị enye ya akwụkwọ ikike ịga mba ọzọ ruo mgbe e lebachara anya n’okwu ya.

Mgbe a nwụchiri Maazi Christensen, ya na nwunye ya bụ́ onye Rọshịa nọ n’ọmụmụ ihe, bụ́kwanụ ihe mmadụ nweere onwe ya ime. Ụlọikpe ahụ nwere ike ikwu ka a hapụ ya n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe e kpechara ikpe ya. Ikpe ahụ nwere ike iwe ihe dị ka afọ abụọ. Ọ bụrụ na ha ama ya ikpe, a ga-atụ ya mkpọrọ ihe ga-eru malite n’afọ isii ruo afọ iri.