Gaa n'Isiokwu

FEBỤWARỊ 11, 2013
RỌSHỊA

“Anyị Anọghị n’Afọ 1937”

“Anyị Anọghị n’Afọ 1937”

N’abalị iri na isii n’ọnwa Eprel afọ 2012, n’obodo Pam dị n’ebe etiti Rọshịa, e kpere Onyeàmà Jehova a na-akpọ Aleksandr Solovyov ikpe ma gwa ya na ọ ga-akwụ 1,000 rọbụl (ya bụ, ihe dị ka ₦4,650) maka na ọ kpọkọtara ndị mmadụ, ha ana-efe Chineke n’otu ụlọ ezumezu ha kwuru ụgwọ ya. Ha sịrị na iwu akwadoghị ihe a o mere.

Mgbe ọkàikpe e nwere n’ógbè ahụ gechara ihe ha sịrị na ọ bụ ya gosiri na Solovyov dara iwu, ọ kagburu ihe ụlọikpe kpeburu ikpe ahụ kpebiri, kagbuokwa ụgwọ ahụ a sịrị ya kwụọ.

Ọkàikpe ahụ gụpụtara ihe ụlọikpe kpebiri, tụgharịzie gwa Onyeàmà Jehova ahụ ikpe laara, sị: “N’agbanyeghị na ọ na-abụ iwu anyị kwuo otu ihe ebe a, ya ekwuo ihe ọzọ n’ebe ọzọ, n’agbanyeghịkwa na e nwere ndị kpọrọ ihe unu na-eme asị, anyị anọghị n’afọ 1937 bụ́ mgbe ọ na-abụ anyị hụchaa eziokwu anyị ekpuchie ya. Ekpere m bụ ka ihe ndị unu na-akụzi, na ihe ndị unu na-eme mee ka e nwekwuo ndị ezigbo mmadụ na ndị na-akpa àgwà ọma n’obodo anyị.”

N’ọnwa Julaị afọ 1937, onye ọchịchị Sọviet Yuniọn aha ya bụ Stalin nyere iwu a na-akpọ Iwu 00447. Iwu ahụ mere ka egwu dị n’oge ahụ. A na-ejide ndị e weere na ha kweere n’ihe dị iche ma kpee ihe ikpe na-enweghị isi na ọdụ. Akwụkwọ ndị gọọmenti gosiri na e si otú ahụ mee ka ọtụtụ puku mmadụ gaa rụwa ọrụ n’ogige ịta ahụhụ, sikwa otú ahụ maa ihe karịrị narị puku mmadụ atọ ikpe ọnwụ ma gbuo ha.