Gaa n'Isiokwu

SEPTEMBA 15, 2015
RỌSHỊA

Olee Mgbe Ikpe Arụrụala A Na-ekpe Ndịàmà Jehova n’Obodo Taganrọg Ga-akwụsị?

Olee Mgbe Ikpe Arụrụala A Na-ekpe Ndịàmà Jehova n’Obodo Taganrọg Ga-akwụsị?

O ruwela mgbe a ga-ekpecha ikpe a na-ekpegharị Ndịàmà Jehova na Taganrọg. Ọ karịala afọ abụọ e kpewere ha ikpe ka ndị mere mpụ. Ihe mere e ji ekpe ha ikpe a bụ n’ihi ihe ha kweere. A na-aga ịma ụfọdụ n’ime ha ikpe ịga mkpọrọ, rie ndị ọzọ nha karịrị akarị. Olee ihe ikpe a e kpewere kemgbe merela Ndịàmà Jehova ndị a? Olee ihe ịma ha ikpe ga-apụta?