Gaa n'Isiokwu

EPREL 20, 2017
RỌSHỊA

Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa Amaa Ndịàmà Jehova Ikpe

Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa Amaa Ndịàmà Jehova Ikpe

NIU YỌK​—⁠N’ime izu abụọ gara aga e kpere ikpe were ụbọchị isii, Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa kwetara ihe Ministri Okwu Ikpe dị n’aka kwuru gbasara ijichi Alaka Ụlọ Ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Rọshịa, nakwa ụlọ ndị ọzọ dị narị atọ na iri itoolu na ise ọgbakọ Ndịàmà Jehova nwere na Rọshịa. A malitekwara ijichi ihe ndị ahụ ozugbo.

Onye na-ekwuchitere Ndịàmà Jehova ọnụ ha na Rọshịa, aha ya bụ Yaroslav Sivulskiy, kwuru sị: “Otu ha si kpee ikpe a wutere anyị. Ihe kacha ewute anyị bụ otú ihe a ga-esi akpa ọrụ Ndịàmà Jehova aka ọjọọ. Anyị ga-agba akwụkwọ ka e kpegharịa ikpe ahụ. Anyị na-atụkwa anya na n’oge na-adịghị anya, a ga-ahapụ anyị ka anyị fewe Chineke otú ọ chọrọ n’ihi na anyị abụghị ndị okwu na ụka.”

E nyere Ndịàmà Jehova nọ na Rọshịa abalị iri atọ iji gbaa akwụkwọ ka ndị ọkàikpe atọ lebagharịa okwu ahụ anya.

Ndị E Nwere Ike Ịkpọtụrụ:

N’obodo ndị ọzọ: David A. Semonian, Office of Public Information, +1-845-524-3000

Na Rọshịa: Yaroslav Sivulskiy, +7-911-087-8009