Gaa n'Isiokwu

NỌVEMBA 3, 2017
RỌSHỊA

Ụlọikpe Dị na Rọshịa Ga-ekpegharị Ikpe E Ji Machie Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

Ụlọikpe Dị na Rọshịa Ga-ekpegharị Ikpe E Ji Machie Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ

Otu ụlọikpe dị na Rọshịa kpebiri na a ga-amachi Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ dị n’asụsụ Rọshịan iwu. Ndịàmà Jehova wepụrụ okwu ahụ n’ụlọikpe dị na Leningrad ka e kpegharịa ya. A ga-ekpegharị ya n’abalị isii nke ọnwa Disemba, afọ 2017.

N’Ọgọst 2017, ụlọikpe dị na Vyborg nabatara ihe ọkàikpe na-ekpechite ọnụ gọọmenti ndị Rọshịa kwuru gbasara Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ. O kwuru na ọ bụghị Baịbụl, n’ihi na ihe ha ji dochie mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ ahụ nọchiri anya aha Chineke na ya bụ “Jehova.” Ihe ahụ ọkàikpe ahụ kwuru mere ka a ghara ịsị na ọ dara iwu ndị Rọshịa nke bụ na e kwesịghị ịkpọ akwụkwọ nsọ ọ bụla ihe na-agba gọọmenti mgba okpuru.

Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-ebipụta Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ n’asụsụ Rọshịan, ekwetaghị na Baịbụl ahụ “na-agba gọọmentị mgba okpuru” otú ahụ ụlọikpe Vyborg kwuru. E nwere Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ ma ndị bụ́ naanị Akwụkwọ Nsọ Grik ma ndị bụ́ Akwụkwọ Nsọ Hibru na Grik n’asụsụ otu narị na iri isii na otu. Ndị mmadụ ji ya kpọrọ ihe. Ihe ndị dị na ya ziri ezi, ọ dịkwa mfe nghọta. E kesaakwala Baịbụl a ihe karịrị narị nde abụọ.