Gaa n'Isiokwu

Ihe a bụ foto ụmụnna ndị ahụ gara Rọshịa, si n’aka ekpe gaa n’aka nri: Alberto Rovira (Spen), Peter Hamadej (Slovakịa), Andrejs Gevla (Latvia), Chong Ho (Koria), Yaroslav Sivulskiy (Rọshịa), Johann Zimmermann (Ọstria), Stefan Steiner (Swizaland), Vasiliy Kalin (Rọshịa), Tommi Kauko (Finland), Mark Sanderson (Amerịka), Robert Delahaije (Nedalandz), Marc Hansen (Beljọm), Paul Gillies (Briten), Lars-Erik Eriksson (Swidin), Tommy Jensen (Denmak), Jørgen Pedersen (Nọọwee), Manfred Steffensdorfer (Jamanị), Teemu Konsti (Lituenia), Babis Andreopoulos (Gris), Tambet Ernits (Estonia), Jean-Claude Pons (Frans)

JULAỊ 21, 2017
RỌSHỊA

E Zigara Ụmụnna Si Obodo Dị Iche Iche Rọshịa Ka Ha Gaa Kwadoo Ụmụnna Ha n’Ikpe E kpegharịrị n’Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa

E Zigara Ụmụnna Si Obodo Dị Iche Iche Rọshịa Ka Ha Gaa Kwadoo Ụmụnna Ha n’Ikpe E kpegharịrị n’Ụlọikpe Kacha Elu na Rọshịa

NIU YỌK—Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova haziri ka ụmụnna anyị sị mpaghara ụwa atọ gaa Mọsko iji gosi na ụmụnna anyị nọ n’ụwa niile na-akwado ụmụnna ha ndị nọ na Rọshịa.

Mgbe ụmụnna ndị ahụ rutere Rọshịa, ụmụnna anyị nọ na Rọshịa ji ihu ọchị nabata ha. Ụfọdụ n’ime ụmụnna ndị a bịara izute ha si Saịberịa bụ́ ebe dị ezigbo anya bịa Mọsko. Ụmụnna anyị ndị ahụ e zigara Rọshịa gwara ụmụnna anyị ndị nọ na Rọshịa na ihe gbasara ha na-emetụ ha n’obi, nakwa na ụmụnna nọ n’ụwa niile na-echeta ha n’ekpere. Otu n’ime ụmụnna anyị ndị ahụ gara Rọshịa kwuru, sị: “Obi tọgburu m atọgbu ịhụ otú ụmụnna anyị nọ na Rọshịa si nwee obi ike, karịchaa ebe ha ma na ọ ga-esi ike ka ụlọikpe ahụ gbanwee obi ha ná mkpebi ha mere ịmachi ọrụ Ndịàmà Jehova na-arụ n’obodo ahụ.”

N’agbanyeghị na ndị ọkàikpe atọ kpere ikpe ahụ kpelaara gọọmenti Rọshịa ikpe, ụmụnna anyị nọ n’ụlọikpe ahụ gosiri na ha hụrụ ụmụnna ha n’anya nakwa na ha dị n’otu. O wutere ha ịhụ otú e si na-akọcha aha Jehova n’ihu ọha nakwa ịmara na ihe na-aga isiri ụmụnna anyị nọ na Rọshịa ike n’oge na-adịghị anya. Ma, otú ụmụnna anyị si nọrọ nwayọọ ma gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya gosiri n’eziokwu na anyị abụghị “ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru” dị ka ndị ọkàikpe ahụ kwuru.

Ọ bụ Nwanna Mark Sanderson, onye so n’Òtù Na-achị Isi, du ụmụnna anyị ndị ahụ gaa Rọshịa. Ọ gbara ụmụnna nọ na Rọshịa ume ka ha ‘nwee obi ike, dịkwa ike’ maka ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ka ụmụnna anyị ndị ahụ gara Rọshịa si n’ụlọikpe ahụ na-apụ, ndị nke nọ Rọshịa makụrụ ha iji gosi ha na obi dị ha ụtọ maka ịbịa gbaa ha ume n’oge a tara akpụ ná ndụ ha.

Ụmụnna ndị a gara n’ụlọ ọrụ ndị na-anọchite anya mba dị iche iche dị iri abụọ na otu nọ na Mọsko iji kọwaara ha ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara Ndịàmà Jehova, nakwa otú ihe ndị Rọshịa na-eme ụmụnna anyị si akpa ha aka ọjọọ. Ha gwara ha gbasara ụmụnna anyị ndị a gbara ụlọ ha ọkụ, ndị a chụrụ n’ọrụ, ụmụaka ndị a na-emekpọ ọnụ n’ụlọ akwụkwọ, nakwa ikpe a mara ndị okenye ọgbakọ maka ịhazi ọmụmụ ihe, dị ka nke ha mara Nwanna Dennis Christensen, onye ka nọ n’ụlọ mkpọrọ ruo mgbe a ga-ekpecha ikpe ya. Vidio were nkeji abụọ ụmụnna anyị ji kọwaara ha ihe ndị ahụ metụrụ ọtụtụ ndị ahụ na-anọchite anya mba n’obi. Ihe ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ ndị ahụ na-ajụkarị bụ, ‘Olee ihe mere o ji bụrụ Ndịàmà Jehova ka ụdị ihe a ga-eme?’ Ụmụnna anyị na-ejizi ohere ahụ ezi ha ozi ọma. Ụmụnna anyị na-agwa ha ihe mere na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa otú ozi ọma anyị na-ezi sirila baara ọtụtụ ndị bi na Rọshịa uru. Otu onye na-arụ n’ụlọ ọrụ ndị na-anọchite anya mba dị iche iche kwuru, sị: “Obi adịghị ndị chọọchị ọtọdọks mma n’ihi na ha chere na unu na-akpọghara ndị òtù ha.” Ihe karịrị ụlọ ọrụ iri na-anọchite anya mba zitere ndị nọchitere anya ha n’ụlọikpe n’okwu ikpe ahụ were awa asatọ.

Okwukwe ụmụnna anyị ndị ahụ gara Rọshịa sikwuru ike mgbe ha na-ala n’ihi na ha ziri ndị na-arụ n’ụlọ ọrụ ndị na-anọchite anya mba ozi ọma, nakwa n’ihi na ụmụnna ha nọ na Rọshịa kpebisiri ike na ha ga-anọgide na-efe Chineke n’agbanyeghị ihe a ga-eme ha.

Onye E Nwere Ike Ịkpọtụrụ:

David A. Semonian, Office of Public Information, +1-845-524-3000