FEBỤWARỊ 10, 2023 | NKE KACHA ỌHỤRỤ: FEBỤWARỊ 17, 2023.
TỌKI
NKE KACHA ỌHỤRỤ—Nnukwu Ala Ọma Jijiji Mere na Tọki Akpaala Ọtụtụ Puku Mmadụ Aka Ọjọọ
N’ụtụtụ Mọnde, abalị isii n’ọnwa Febụwarị afọ 2023, nnukwu ala ọma jijiji mere n’ebe ndịda Tọki. Mgbe, e mechara, nnukwu ala ọma jijiji ọzọ mekwara ná mpaghara ahụ. Kemgbe ahụ, ala ọma jijiji ndị ọzọ na-erughị ka ndị mbụ a emeekwala ugboro ugboro. Ala ọma jijiji a egbuola ihe karịrị puku mmadụ iri atọ na asatọ (38,000), merụọkwa ihe karịrị otu narị puku mmadụ na puku asatọ (108,000) ahụ́.
Otú O Si Kpaa Ụmụnna Anyị Bi na Tọki Aka Ọjọọ
O wutere anyị na o gburu otu nwanna anyị nwaanyị merela agadi bi n’Adana, gbuokwa otu nwanna anyị nwoke, nwunye ya, ụmụaka ha abụọ, nakwa onye ikwu ha n’obodo a na-akpọ Adiyaman
Ụlọ atọ dakasịrị kpamkpam
E nwere ụlọ iri na asaa nnukwu ihe mebiri na ha
E nwere ụlọ iri abụọ na abụọ obere ihe mebiri na ha
E nwere otu Ụlọ Nzukọ Alaeze nnukwu ihe mebiri na ya
E nwere Ụlọ Nzukọ Alaeze abụọ obere ihe mebiri na ha
Otú Anyị Si Gbatara Ụmụnna Anyị Ọsọ Enyemaka
Ụfọdụ ụmụnna na-agba mbọ na-akasi ndị ọdachi a dakwasịrị obi, jirikwa Okwu Chineke na-agba ha ume
Anyị họpụtara Kọmitii abụọ Na-ahụ Maka Ịgbatara Ndị Ọdachi Dakwasịrị Ọsọ Enyemaka ka ha hụ na e nyeere ndị a ọdachi dakwasịrị aka
N’agbanyeghị otú ala ọma jijiji a si dị egwu, ihe na-akasi ụmụnna anyị obi bụ na ha ma na Jehova bụ “ebe mgbaba anyị na ike anyị. Ọ dị njikere inyere anyị aka n’oge nsogbu.”—Abụ Ọma 46:1.