Gaa n'Isiokwu

MACH 11, 2013
TỌKI

Òtù Mba Ụwa Agwala Mba Tọki Amanyezila Ụmụ Amaala Ha Ka Ha Mee Ihe Akọnuche Ha Na-anabataghị

Òtù Mba Ụwa Agwala Mba Tọki Amanyezila Ụmụ Amaala Ha Ka Ha Mee Ihe Akọnuche Ha Na-anabataghị

Ọtụtụ nde Ndị Kraịst anaghị ekwe aga agha, ọtụtụ mba anaghịkwa amanye ha ime otú ahụ. Kọmitii Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ihe Ndị Ruuru Mmadụ ekwuola na ọ bụkwa otú ahụ ka o kwesịrị ịdị ná mba Tọki.

N’ikpe Kọmitii ahụ biri n’abalị iri abụọ na itoolu n’ọnwa Mach afọ 2012, ha kpelaara ụmụ amaala Tọki abụọ aha ha bụ Cenk Atasoy na Arda Sarkut. Ha abụọ bụ Ndịàmà Jehova na-ekweghị arụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị ha kweere.

Maazị Atasoy na Maazị Sarkut edegarala gọọmenti akwụkwọ ugboro ugboro iji kọwaara ha ihe ha kpebiri n’ihi akọnuche ha. Ha kwukwara ka e nye ha ọrụ na-abụghị ọrụ agha ka ha rụọ. Ma, a nọgidere na-enye ha nsogbu ka ha ghọọ ndị agha. Mgbe ndị agha yichara mahadum Maazị Sarkut na-akụzi nkụzi na ya egwu na ha ga-agba ha akwụkwọ na ha bụ ndị omempụ, ha chụrụ Maazị Sarkut n’ọrụ.

Mgbe Kọmitii ahụ na-ebi ikpe, ha kwuru na ikike mmadụ nwere ịjụ ịrụ ọrụ agha n’ihi ihe ndị o kweere na “ikike mmadụ nwere iche ihe masịrị ya, ịjụ ihe akọnuche ya na-anabataghị, na ikpe okpukpe masịrị ya bụ otu.” Nkebi nke 18 nke Ihe Mba Dị Iche Iche Kwekọrịtara na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ kwadokwara ihe a ha kwuru. Kọmitii ahụ kwukwara na “mmadụ nwere ikike ịjụ ịrụ ọrụ agha ma ọ bụrụ na o megidere okpukpe ya ma ọ bụ ihe ndị o kweere.”

E biri ikpe a obere oge Ụlọikpe Na-ahụ Maka Ihe Ruuru Mmadụ na Yurop bichara ikpe abụọ yiri ya. N’otu n’ime ikpe ndị ahụ ha biri, Ụlọikpe ahụ kwuru na “ebe ọ bụ na Tọki enweghị ọrụ nkịtị ha wepụtara maka ndị jụrụ ịrụ ọrụ agha n’ihi akọnuche ha, ha dara iwu kwuru na mmadụ nweere onwe ya ịjụ ịrụ ọrụ agha,” bụ́ nke dị n’Ihe Ndị Yurop Kwekọrịtara na Ọ Bụ Ihe Ruuru Mmadụ.

Malite n’oge gboo, Ndị Kraịst anaghị ekwe aga agha. Otu nwoke aha ya bụ E. W. Barnes, kwuru n’akwụkwọ ya a na-akpọ The Rise of Christianity, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ewetuo obi tụlee ihe niile e dere n’oge gara aga, ọ ga-ahụ na ruo n’oge Marcus Aurelius [ya bụ, eze ukwu chịrị Rom malite n’afọ 161 ruo n’afọ 180], e nweghị Onye Kraịst ghọrọ onye agha, e nweghịkwa onye agha ka bụ onye agha mgbe ọ ghọchara Onye Kraịst.”