Gịnị Ka Ịdị Nsọ Pụtara?
Ihe Baịbụl kwuru
Ihe na-agbata n’uche ma a nụ okwu bụ́ “ịdị nsọ” bụ ihe a na-emerụghị emerụ, ma ọ bụ ihe e dopụrụ iche. Okwu Hibru a sụgharịrị ka ọ bụrụ “ịdị nsọ” si n’okwu pụtara “ịnọpụ iche.” N’ihi ya, ihe dị nsọ bụ ihe e dopụrụ iche, ma ọ bụ ihe e ji kpọrọ ihe n’ihi na ọ dị ọcha, e merụghịkwa ya emerụ.
Chineke dị nsọ otú na-enweghị atụ. Baịbụl sịrị: “Ọ dịghị onye dị nsọ nke dị ka Jehova.” a (1 Samuel 2:2) Ọ bụ ya mere o ji bụrụ naanị Chineke ga-ekpebi ihe dị nsọ.
E nwere ike ikwu na ihe ọ bụla gbasara Chineke “dị nsọ,” karịchaa ihe ndị gbasara ofufe ya. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru gbasara:
Ebe ndị dị nsọ: Chineke gwara Mozis okwu ná nso osisi ahụ na-ere ọkụ, sị: “Ebe i guzo bụ ala nsọ.”—Ọpụpụ 3:2-5.
Ememme ndị dị nsọ: Ụmụ Izrel oge ochie fere Jehova n’ọtụtụ ememme ndị ha mere, ndị a kpọrọ “mgbakọ dị nsọ.”—Levitikọs 23:37.
Arịa ndị dị nsọ: A kpọrọ ihe ndị e ji fee Chineke n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem oge ochie ‘arịa ndị dị nsọ.’ (1 Ndị Eze 8:4) Ọ bụ eziokwu na e kwesịghị ife arịa ndị a dị nsọ ofufe, e kwesịghị iji ha egwu egwu. b
Onye na-ezughị okè ọ̀ ga-adịli nsọ?
Ee. Chineke nyere Ndị Kraịst iwu, sị: “Unu ga-adị nsọ, n’ihi na adị m nsọ.” (1 Pita 1:16) N’eziokwu, ụmụ mmadụ na-ezughị okè agaghị adịli nsọ otú ahụ Chineke dị. Ma, a ka nwere ike ịgụ ndị na-erubere Chineke isi ka ndị dị ‘nsọ, ndị dịkwa Chineke mma.’ (Ndị Rom 12:1) Onye na-agbalị ịdị nsọ na-egosi ya n’okwu ọnụ na n’omume. Dị ka ihe atụ, onye ahụ na-eme ihe Baịbụl kwuru ka anyị ‘doo onwe anyị nsọ ma zere ikwa iko’ nakwa ka anyị ‘dị nsọ n’omume anyị niile.’—1 Ndị Tesalonaịka 4:3; 1 Pita 1:15.
Mmadụ ò nwere ike ịdịgide nsọ kwụsị?
Ee. Ọ bụrụ na mmadụ akwụsi ime ihe ndị Chineke nyere n’iwu, Chineke ga-elezi onye ahụ anya ka onye na-adịghịzi nsọ. Dị ka ihe atụ, a kpọrọ ndị e degaara akwụkwọ Baịbụl bụ́ Hibru ‘ụmụnna ndị dị nsọ.’ Ma, n’agbanyeghi nke ahụ, a dọrọ ha aka ná ntị na ma ha akpacharaghị anya, ha nwere ike “inwe ajọ obi nke na-enweghị okwukwe site n’ịhapụ Chineke dị ndụ.”—Hibru 3:1, 12.
Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara ịdị nsọ
Ụgha: Naanị otú mmadụ ga-esi adị nsọ bụ ma ọ na-ata onwe ya ahụhụ.
Eziokwu: Baịbụl kwuru na mmadụ ‘ịta onwe ya ahụhụ’ enweghị ‘uru ọ bara n’anya Chineke.’ (Ndị Kọlọsi 2:23) Kama nke ahụ, Chineke chọrọ ka anyị jiri ihe ndị dị mma na-eme onwe anyị obi ụtọ. “Ka onye ọ bụla na-eri ihe, na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, na-ahụkwa ihe ọma n’ihi ịrụsi ọrụ ike ya niile. Ọ bụ onyinye Chineke.”—Ekliziastis 3:13.
Ụgha: Mmadụ ga-aka adị nsọ ma ọ bụrụ na ọ lụghị di ma ọ bụ nwunye.
Eziokwu: N’agbanyeghị na Onye Kraịst nwere ike ikpebi na ya agaghị alụ di ma ọ bụ nwunye, ọ bụghị ya ga-eme ka ọ dịrị nsọ n’anya Chineke. N’eziokwu, ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike iji obi ha niile na-efe Jehova n’enweghị ihe ga-adọpụ ha uche. (1 Ndị Kọrịnt 7:32-34) Ma, Baịbụl kwukwara na ndị lụrụ di ma ọ bụ nwunye nwere ike ịdị nsọ. Ma ọ́ dịghị ihe ọzọ, otu n’ime ndịozi Jizọs, ya bụ Pita, lụrụ nwaanyị.—Matiu 8:14; 1 Ndị Kọrịnt 9:5.
a Jehova bụ aha Chineke. Ọtụtụ amaokwu Baịbụl kwuru na aha a bụ ihe “dị nsọ.”
b Baịbụl katọrọ ife ihe ndị nọwara kemgbe oge ochie e ji jeere Chineke ozi ofufe.—1 Ndị Kọrịnt 10:14.