Ịṅụ Sịga Ọ̀ Bụ Ihe Ọjọọ
Ihe Baịbụl zara
E nweghị ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ sịga a ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ e ji sịga eme. Ma, Baịbụl kwuru ihe ndị na-egosi na Chineke akwadoghị ka anyị na-eme ihe otú ga-emerụ anyị ahụ́, o sikwa otú a gosi na ịṅụ sịga bụ ihe ọjọọ.
Ka anyị jiri ndụ kpọrọ ihe. “Chineke . . . na-enye mmadụ niile ndụ na ume na ihe niile.” (Ọrụ Ndịozi 17:24, 25) Ebe ọ bụ Chineke nyere anyị ndụ, anyị ekwesighị ime ihe ọ bụla ga-anapụ anyị ndụ a n’ike, dị ka ịṅụ sịga. Ịṅụ sịga bụ otu n’ime ihe ndị kacha akpata ndị mmadụ ịnwụchu ọnwụ n’ụwa niile.
Ka anyị hụ ndị ọzọ n’anya. “Hụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.” (Matiu 22:39) Onye nọ n’ebe ndị ọzọ nọ na-aṅụ sịga anaghị egosi na ọ hụrụ ha n’anya. Ndị na-anọkarị n’ebe a na-aṅụ sịga nwere ike ịda ọrịa ịṅụ sịga na-akpata ngwa ngwa karịadị ndị ahụ na-aṅụ ya.
Anyị kwesịrị ịdị nsọ. “Ka unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma.” (Ndị Rom 12:1) “Ka anyị sachapụ onwe anyị mmerụ niile nke anụ ahụ́ na nke mmụọ, wee mee ka ịdị nsọ anyị zuo okè n’egwu Chineke.” (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ịṅụ sịga bụ agwa ọjọọ, onye na-aṅụkwa ya adịghị nsọ, ya bụ, ọ dịghị ọcha n’ihi na ndị na-aṅụ sịga ma ụma na-eri nsí na-ala ahụ́ ha n’iyi.
Ò nwere ihe Baịbụl kwuru banyere ịṅụ igbó ma ọ bụ ọgwụ ike ndị ọzọ?
Baịbụ ekwughị ihe ọ bụla banyere igbó (bụ́kwa nke a na-akpọ ahịhịa ike ma ọ bụ wiiwii), otú ahụ ọ na-akpọghịkwa ọgwụ ike ndị ọzọ n’aha. Ma, o nwere ihe ndị o kwuru gosiri na ịṅụ ọgwụ ike ndị dị otú ahụ, n’ụdị iji ya na-atụrụ ndụ, bụ ihe ọjọọ. E wepụ ihe ndị si na Baịbụl ndị anyị kwurula okwu ha n’isiokwu a, amaokwu ndị a na-esonụ na-ekwukwa otu ihe ahụ:
Isi kwesịrị ịkpakọ anyị ọnụ mgbe niile. “Jiri . . . uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37, 38) “Nweenụ uche ziri ezi.” (1 Pita 1:13) Onye na-aṅụ ọgwụ ọjọọ agaghị asị na ihe niile ọ na-eme doro ya anya. Ụdị ọgwụ ndị ahụ nwedịrị ike iri ọtụtụ ndị na-aṅụ ha ahụ́. Kama ịna-eche ihe bara uru, ihe ha na-eche mgbe niile bụ otú ha si enweta ọgwụ ahụ ṅụọ—Ndị Filipaị 4:8.
Anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi. ‘Na-erubekwara ọchịchị na ikike dị iche iche isi.’ (Taịtọs 3:1) N’ọtụtụ mba, e nwere iwu a kapịrị ọnụ kwuru ọgwụ mmadụ nwere ike ịṅụ na ndị nke ọ na-agaghị aṅụ. Ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe Chineke chọrọ, anyị kwesịrị ịna-erubere ndị ọchịchị isi—Ndị Rom 13:1.
a Ihe a na-ekwu okwu ya ebe a bụ mmadụ ịkpachara anya na-aṅụ anwụrụ ọkụ sịga, ọkpọkọ, ma ọ bụ ihe ndị yiri ya. Ma, ihe ndị ọzọ so n’ihe a na-ekwu ebe a bụ ịracha ụtaba, ịkpọ anwụrụ, ịṅụ sịga, ma ndị nke ọgbara ọhụrụ ya ndị ọzọ.