Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Nwoke Idina Nwoke na Nwaanyị Idina Nwaanyị?
Ihe Baịbụl kwuru
Chineke kere ụmụ mmadụ ka ọ bụrụ naanị di na nwunye ga na-enwe mmekọahụ. (Jenesis 1:27, 28; Levitikọs 18:22; Ilu 5:18, 19) Baịbụl kagburu ndị na-abụghị di na nwunye inwe mmekọahụ, nakwa mmadụ iso nwoke ibe ya na nwaanyị ibe ya nwee mmekọahụ. (1 Ndị Kọrịnt 6:18) Ịpị ma ọ bụ ịdịda mmadụ aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, iji ọnụ amị ihe mmadụ bụrụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, na i si n’otule enwe mmekọahụ socha ná mmekọahụ Baịbụl kagburu.
Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kagburu nwoke idina nwoke na nwaanyị idina nwaanyị, ma, o kwughị ka a kpọọ ndị na-eme ụdị omume ahụ asị. Baịbụl gwara Ndị Kraịst ka ha ‘sọpụrụ ụdị mmadụ niile.’—1 Pita 2:17.
Mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya ò nwere ike ịbụ ebumpụta ụwa?
Baịbụl ekwughị kpọmkwem gbasara otú ahụ́ ndị na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha si arụ ọrụ. Ma ihe o kwuru bụ na a mụrụ anyị otú ga-eme ka ọ na-agụ anyị agụụ imebi iwu Chineke. (Ndị Rom 7:21-25) Baịbụl abịaghị kwuwe ihe mere o ji agụ ụfọdụ ndị idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha, kama ime otú ahụ, ọ kagburu mmadụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya.
Otú ị ga-esi eme ihe Chineke na-achọ n’agbanyeghị na ọ na-adị agụ gị agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe gị.
Baịbụl sịrị anyị mee ‘ka akụkụ ahụ́ anyị nwụọ n’ihe banyere agụụ mmekọahụ’ na-ezighị ezi.’ (Ndị Kọlọsi 3:5) Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ihe ọjọọ ghara ịna-agụ gị agụụ, i kwesịrị ịma ụdị ihe ị ga na-eche. Ọ bụrụ na ihe ị na-eche mgbe niile bụ ihe dị mma, ọ ga-eme agụụ ime ihe ọjọọ bata gị n’obi, gị ewepụ ya ngwa ngwa. (Ndị Filipaị 4:8; Jems 1:14, 15) Ọ bụ eziokwu na iwepụ ihe ọjọọ batara gị n’obi ngwa ngwa nwere ike isiri gị ike ná mmalite, ma nwayọọ nwayọọ, ọ ga-adịrị gị mfe. Chineke kwere nkwa na ya ga-enyere gị aka ‘ka ike nke na-eduzi uche gị dị ọhụrụ.’—Ndị Efesọs 4:22-24.
E nwekwara ọtụtụ ndị mmekọ nwoke na nwaanyị na-agụ agụụ ma ha ana-agbalị iwepụ ya n’obi ha n’ihi na ha chọrọ ịna-eme ihe Baịbụl kwuru. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, na-anaghị atụ anya na ha ga-alụ, ma ọ bụkwanụ ndị ọnọdụ di ha ma ọ bụ nwunye ha na-agaghị ekwe ha na-enwe mmekọahụ. Ha na-ejide onwe ha n’agbanyeghị na ọnwụnwa ịkwa iko na-abịara ha. Ha na-enwekwa obi ụtọ ná ndụ ha. Ndị ọ na-agụ agụụ idina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nwekwara ike ịmụta ijide onwe ha ma ọ bụrụ n’eziokwu na ha chọrọ ime ihe dị Chineke mma.—Diuterọnọmi 30:19.