Gaa n'Isiokwu

Ònye Bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim?

Ònye Bụ Jọn Onye Na-eme Baptizim?

Ihe Baịbụl kwuru

 Jọn Onye Na-eme Baptizim bụ onye amụma Chineke. (Luk 1:76) A mụrụ ya n’afọ 2 T.O.N.K., ya anwụọ n’afọ 32 O. N.K. Chineke nyere ya ọrụ ka ọ kwadebe ụzọ maka Mezaya ma ọ bụ Kraịst. Otú Jọn si rụọ ọrụ a bụ izi ndị Juu ibe ya ozi ọma gbasara Chineke ka ha wee chegharịa laghachikwuru Chineke.​—Mak 1:1-4; Luk 1:13, 16, 17.

 Ozi Jọn ziri nyeere ndị nwere ezigbo obi aka ka ha mata na Jizọs onye Nazaret bụ Mezaya ahụ e kwere ná nkwa. (Matiu 11:10) Jọn gwara ndị o ziri ozi ọma ka ha chegharịa ná mmehie ha, meekwa baptizim iji gosi na ha echegharịala. (Luk 3:3-6) Jọn mere ọtụtụ ndị baptizim. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya Jọn Onye Na-eme Baptizim. Baptizim kacha mkpa Jọn mere bụ nke o mere Jizọs. a​—Mak 1:9.

Ihe ndị e kwuru n’isiokwu a

 Gịnị mere Jọn Onye Na-eme Baptizim ji pụọ iche?

 E buru amụma banyere ọrụ ọ ga-arụ: Ọrụ ikwusa ozi ọma Jọn rụrụ mezuru amụma Baịbụl buru banyere onye ozi Jehova ga-ezite. (Malakaị 3:1; Matiu 3:1-3) Ọrụ ọ rụrụ gosiri na ọ bụ ya bụ onye ‘ga-akwadebere Jehova otu ndị,’ ya bụ, na o nyeere ndị Juu ibe ya aka ka ha nwee ike ịnabata ozi Jizọs Kraịst, bụ́ onye na-anọchite anya Jehova Chineke, ziri ha.​—Luk 1:17.

 Ihe Jọn ji ndụ ya mee: Jizọs kwuru na “o nwebeghị onye ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu, ma onye dị ala n’Alaeze eluigwe ka ya ukwuu.” (Matiu 11:11) E nweghị onye ọ bụla fere Chineke tupu a mụọ Jọn a ga-asị ka ya n’ihi na Jọn bụ ma onye amụma ma “onye ozi” e buru n’amụma. Ihe Jizọs kwuru gosikwara na Jọn agaghị abụ eze n’Alaeze Chineke. b Onye amụma a nke ji obi ya niile fee Chineke nwụrụ tupu Kraịst emee ka ndị mmadụ nwee ohere ịga eluigwe. (Ndị Hibru 10:19, 20) Ma, Jọn ga-ebi n’Alaeze Chineke n’ụwa, ọ ga-enwekwa ike ịdị ndụ ebighị ebi na Paradaịs.​—Abụ Ọma 37:29; Luk 23:43.

 Ole ndị bụ́ nne na nna Jọn Onye Na-eme Baptizim?

 Ọ bụ di na nwunye bụ́ Zekaraya na Elizabet mụrụ Jọn. Zekaraya bụ onye nchụàjà bụ́ onye Juu. Ọmụmụ Jọn bụ ọrụ ebube maka na nne ya bụ nwaanyị aga. Ihe ọzọ bụ na ya na Zekaraya “emeekwala agadi.”​—Luk 1:5-7, 13.

 Ònye kpatara ọnwụ Jọn Onye Na-eme Baptizim?

 Eze Herọd Antipas nyere iwu ka e gbupụ Jọn isi. O nyere iwu a maka na nwunye ya bụ́ Herodias ziri ada ya nwaanyị ka ọ gwa ya ka o gbuo ya. Herodias kpọrọ Jọn asị maka na Jọn gwara Herọd, bụ́ onye sịrị na ya bụ onye Juu, na ọlụlụ ọ lụrụ Herodias adabaghị n’iwu ndị Juu.​—Matiu 14:1-12; Mak 6:16-19.

 Jọn Onye Na-eme Baptizim na Jizọs hà nọ na-amarịta aka?

 E nweghị ihe dị na Baịbụl gosiri na ha abụọ nọ na-amarịta aka. (Jọn 3:25-30) Nke bụ́ eziokwu bụ na Jọn kwuru hoo haa na ọ bụ ọrụ ya ịkwadebere Mezaya ụzọ, ọ bụghị ịma ya aka. Jọn kwuru, sị: “Ihe mere m ji bịa jiri mmiri na-eme baptizim bụ ka e mee ka Izrel mara ya.” O kwukwara, sị: “Ọ bụ ya bụ Ọkpara Chineke.” (Jọn 1:26-34) N’ihi ya, obi tọrọ Jọn ezigbo ụtọ ịnụ otú ozi Jizọs si na-aga n’ihu n’ihu.

a Jizọs ‘emeghị mmehie ọ bụla.’ (1 Pita 2:21, 22) N’ihi ya, baptizim e mere ya abụghị maka na o kwesịrị ichegharị, kama ọ bụ maka na ọ na-enyefe Chineke onwe ya ime uche ya. Ịnwụ maka anyị sokwa n’uche Chineke ọ bịara ime.​—Ndị Hibru 10:7-10.

b Gụọ isiokwu bụ́ “Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?