Ihe Anyị Ga-amụta n’Aka Ụmụ Nwaanyị Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl
Ihe Baịbụl kwuru
Baịbụl kọrọ gbasara ọtụtụ ụmụ nwaanyị ndị anyị nwere ike isi n’akụkọ ha mụta ọtụtụ ihe. (Ndị Rom 15:4; 2 Timoti 3:16, 17) Isiokwu a kwuru ná nkenke gbasara ụfọdụ n’ime ụmụ nwaanyị ndị a kpọrọ aha na Baịbụl. Ọtụtụ n’ime ha bụ ndị anyị kwesịrị ịmụta ihe ndị dị mma ha mere. Ụfọdụ n’ime ha bụ ndị anyị kwesịrị ịgbara àgwà ha ọsọ.—1 Ndị Kọrịnt 10:11; Ndị Hibru 6:12.
Abigel
Ònye bụ Abigel? Ọ bụ nwunye otu nwoke a na-akpọ Nebal. Nwoke a bụ ọgaranya ma bụrụ onye aka ike. Ma, Abigel nwere ezi uche ma dị umeala n’obi. Ọ mara mma nwaanyị, nwekwa ọtụtụ àgwà ndị na-amasị Jehova.—1 Samuel 25:3.
Gịnị ka o mere? Abigel gosiri na ya nwere amamihe na nghọta mgbe o gbochiri nsogbu gaara ata isi ndị ezinụlọ ya. Ya na Nebal bi n’ebe Devid zoro mgbe ọ na-agbara ndị iro ya ọsọ. Ọ bụ Devid ga-emecha bụrụ eze Izrel. N’oge niile Devid na ndị òtù ya bi nso n’ebe Nebal bi, ha chebere ìgwè atụrụ Nebal ka ndị ohi ghara izuru ha. Ma, mgbe Devid zigara ndị na-ejere ya ozi ka ha gaa rịọ Nebal ka ọ chọtụrụ ha ihe oriri, Nebal kparịrị ha ma jụ inye ha ihe ọ bụla. Nke a were Devid ezigbo iwe! N’ihi ya, ya na ndị òtù ya gawara igbu Nebal na ụmụ nwoke niile bi n’ụlọ ya.—1 Samuel 25:10-12, 22.
Mgbe Abigel nụrụ ihe di ya mere, o mere ihe ozugbo. O nyere ndị na-ejere ya ozi ihe oriri ka ha wegara Devid na ndị òtù ya, o sochikwara ha azụ ozugbo ka ọ rịọ Devid ka ọ gbaghara ha. (1 Samuel 25:14-19, 24-31) Mgbe Devid hụrụ ihe Abigel nyere ha, hụ otú o si dị umeala n’obi, nụkwa okwu ọ gwara ya nke gosiri na ọ maara ihe, ọ ghọtara na Chineke ji nwaanyị a gbochie ihe ọjọọ gaara emenụ. (1 Samuel 25:32, 33) Ọ dịghị anya Nebal anwụọ, Abigel mechakwara ghọọ nwunye Devid.—1 Samuel 25:37-41.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Abigel? N’agbanyeghị na Abigel mara mma nwaanyị, bụrụkwa onye di ya bara ọgaranya, o kweghị ka ihe ndị ahụ buwe ya isi. Ọ rịọrọ arịrịọ maka ihe na-abụghị yanwa mere n’ihi na ọ chọrọ udo. Abigel ji akọ na obi ike, gbochie nnukwu nsogbu gaara ata isi ọtụtụ ndị. O weturu obi mee ihe o kwesịrị ime n’egbughị oge.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Abigel, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ Kpara Àgwà Onye Nwere Ezi Uche.”
Debora
Ònye bụ Debora? Debora bụ onye amụma nwaanyị. Jehova, bụ́ Chineke Izrel, ji ya gwa ndị Izrel ihe ndị ọ chọrọ ka ha mara. Chineke jikwa nwaanyị a doziere ndị Izrel nsogbu ndị ha na ibe ha na-enwe.—Ndị Ikpe 4:4, 5.
Gịnị ka o mere? Debora onye amụma nwaanyị ji obi ike kwado ndị na-efe Chineke. N’otu oge Chineke gwara ya ka ọ kpọọ Berak gwa ya ka o duru ndị agha Izrel gaa buso ndị Kenan, bụ́ ndị na-akpagbu ha, agha. (Ndị Ikpe 4:6, 7) Mgbe Berak rịọrọ Debora ka o soro ya gaa, Debora atụghị ụjọ kama o ji obi ya niile soro ya gaa agha ahụ.—Ndị Ikpe 4:8, 9.
Mgbe Chineke nyechaara ndị Izrel aka ha emerie n’agha ahụ Debora rọrọ ụfọdụ n’ime abụ ya na Berak bụrụ, nke ha nọ na ya kọọ ihe ndị mere n’agha ahụ. N’abụ ahụ, o kwuru ihe Jeel mere. Jeel bụ nwaanyị ọzọ nwere obi ike, onye nyeere ndị Izrel aka ka ha merie ndị Kenan.—Ndị Ikpe isi nke 5.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Debora? Debora bụ nwaanyị nwere obi ike. Ọ bụkwa onye na-ewepụta onwe ya ijere ndị ọzọ ozi. Ọ gbara ndị ọzọ ume ka ha mee ihe dị mma n’anya Chineke. Mgbe ọ bụla ha mere otú ahụ, ọ na-aja ha ezigbo mma maka ya.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Debora, gụọ isiokwu bụ́ “M Biliri Dị Ka Nne n’Izrel.”
Delaịla
Ònye bụ Delaịla? Ọ bụ nwaanyị Samsịn hụrụ n’anya. Samsịn bụ onyeikpe n’Izrel.—Ndị Ikpe 16:4, 5.
Gịnị ka o mere? Ọ naara ndị isi ndị Filistia ego ka ọ rara Samsịn nye ha. Samsịn bụkwanụ onye Chineke ji na-anapụta ndị Izrel n’aka ndị Filistia. Jehova mere ka Samsịn sie ike dị egwu, ndị Filistia gbalịrị ijide ya ma ha enwelighị ike. (Ndị Ikpe 13:5) Ọ bụ ya mere ndị isi ndị Filistia ji gakwuru Delaịla ka o nyere ha aka.
Ndị Filistia nyere Delaịla ego ka ọ chọpụtara ha ebe ike Samsịn dị. Delaịla naara ha ego, ọ gbalịkwara ugboro ugboro ka ọ mata ebe ike Samsịn dị. N’ikpeazụ ọ matara ebe ike Samsịn dị. (Ndị Ikpe 16:15-17) Ọ gaziri gwa ndị Filistia ebe ike Samsịn dị, ha agaa jide Samsịn ma tụọ ya mkpọrọ.—Ndị Ikpe 16:18-21.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Delaịla? E ji akụkọ Delaịla na-adọ anyị aka ná ntị. Anyaukwu mere ka ọ ghọgbuo onye na-ejere Jehova Chineke ozi, gharịpụkwa ya. Àgwà Delaịla gosiri na ọ na-achọ naanị uru nke ya.
Esta
Ònye bụ Esta? Ọ bụ nwaanyị Juu, onye Eze Peshia bụ́ Ahazuirọs họọrọ ka ọ bụrụ nwunye ya.
Gịnị ka o mere? Esta bụ́ nwunye eze ji ikike o nwere mee ka a ghara igbuchapụ ndị Juu ibe ya. Ọ chopụtara na e nwere iwu e tiri nke a nọ na ya wepụta otu ụbọchị a ga-egbuchapụ ndị Juu niile bi n’obodo niile Eze Peshia na-achị. Onye kpara nkata ọjọọ a bụ otu nwoke aha ya bụ Heman, ọ bụkwa ya bụ praịm minista. (Esta 3:13-15; 4:1, 5) Esta maara na ịgakwuru di ya, bụ́ Eze Ahazuirọs, mgbe ọ na-akpọghị ya nwere ike ịta isi ya, ma o mechara mee ka di ya mara nkata ọjọọ ahụ a kpara megide ndị Juu. Mọdekaị, bụ́ deede ya, so gbaa ya ume ka o mee nke a. (Esta 4:10-16; 7:1-10) Ahazuirọs gwaziri Esta na Mọdekaị ka ha tie iwu ọzọ nke ga-enye ndị Juu ikike ịlụso ndị iro ha ọgụ. Ndị Juu mechara merie nnọọ ndị iro ha.—Esta 8:5-11; 9:16, 17.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Esta? Ihe anyị na-amụta n’aka Esta bụ́ nwunye eze bụ na anyị kwesịrị inwe obi ike, dị umeala n’obi, ma ghara ịbụ ndị onwe ha na-ebu isi. (Abụ Ọma 31:24; Ndị Filipaị 2:3) N’agbanyeghị na ọ mara mma nwaanyị, bụrụkwa nwunye eze, o weturu onwe ya ala ma gakwuru ndị ọzọ ka ha nye ya ndụmọdụ ma nyere ya aka. Mgbe ọ na-agwa di ya okwu, ọ kwanyeere ya ùgwù, o zoghị ọnụ gwa ya ihe bụ nsogbu ya, o jikwa akọ kwuo okwu. N’oge ọ makwa na onye ọ bụla bụ́ onye Juu nọ ná nsogbu, ọ katara obi mee ka a mata na ya bụ onye Juu.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Esta, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ Gbachiteere Ndị Chineke” nakwa “Nwaanyị Obi Kara, nke Na-achọghịkwa Naanị Ọdịmma Onwe Ya.”
Iv
Ònye bụ Iv? Ọ bụ nwaanyị mbụ Chineke kere nakwa nwaanyị mbụ a kpọrọ aha na Baịbụl.
Gịnị ka o mere? Iv nupụrụ isi n’iwu doro anya Chineke nyere. Iv zuru okè dị nnọọ ka di ya bụ́ Adam. O nweere onwe ya ikpebi ihe ọ ga-eme. E nyekwara ya ikike ịmụta àgwà ọma ndị dị ka ịhụnanya na amamihe. (Jenesis 1:27) Iv ma na e nwere osisi Chineke gwara Adam ka ha ghara iri mkpụrụ si na ya, nakwa na ha ga-anwụ ma ha rie ya. Ma, Setan ghọgburu ya gwa ya na ọ gaghị anwụ. N’eziokwu, ọ gwadịrị ya na ihe ga-akara ya mma ma ọ bụrụ na o nupụrụ Chineke isi. Iv tara mkpụrụ osisi ahụ ma mechaa rafuo di ya ya esoro ya taa.—Jenesis 3:1-6; 1 Timoti 2:14.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Iv? Ihe Iv mere na-akụziri anyị na ọ bụrụ na echiche ọjọọ abata anyị n’obi, anyị ekwesịghị ịnọ na-eche ya. N’agbanyeghị iwu doro anya Chineke nyere, agụụ iwere ihe na-abụghị nke ya gụsiwere ya ike.—Jenesis 3:6; 1 Jọn 2:16.
Hana
Ònye bụ Hana? Ọ bụ nwunye Elkena nakwa nne Samuel, onye mechara bụrụ onye amụma a ma ama n’Izrel oge ochie.—1 Samuel 1:1, 2, 4-7.
Gịnị ka o mere? Mgbe Hana na-amụtabeghị nwa, ọ kọọrọ Chineke nsogbu ya. Di Hana lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Nwunye ya nke ọzọ bụ́ Penina mụtara ụmụ. Ma, Hana amụtaghị nwa ruo ogologo oge. Penina nọ na-akọ nwunye di ya ọnụ, na-achịkwa ya ọchị, ma Hana rịọrọ Chineke ka ọ kasie ya obi. O kwere Chineke nkwa na ọ bụrụ na o nye ya nwa nwoke, na ya ga-enye ya nwa ahụ ka o jewe ozi n’ụlọikwuu ya. Ụlọikwuu bụ ụlọ ntu a na-ebughari ebugharị, ebe ndị Izrel na-anọ efe Chineke.—1 Samuel 1:11.
Chineke zara ekpere Hana, ya amụta Samuel. Hana mezuru ihe o kwere ná nkwa ma kpọga Samuel n’ụlọikwuu mgbe ọ ka bụ nwata. (1 Samuel 1:27, 28) N’afọ ọ bụla, ọ na-akwara Samuel uwe elu na-enweghị aka ma wegara ya. Ka oge na-aga, Chineke ji ụmụ ise ọzọ, ya bụ, ụmụ nwoke atọ na ụmụ nwaanyị abụọ, gọzie Hana.—1 Samuel 2:18-21.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Hana? Ekpere Hana ji obi ya niile kpee nyeere ya aka ịtachi obi n’ọnwụnwa ndị bịaara ya. E dere ekpere o kpere o ji kelee Chineke na 1 Samuel 2:1-10. Ekpere a gosiri na o nwere okwukwe siri ike n’ebe Chineke nọ.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Hana, gụọ isiokwu bụ́ “Ọ Gwara Chineke Obi Ya n’Ekpere.”
▸ Ị chọọ ịma ihe mere Chineke ji kwe ka ndị na-efe ya n’oge ochie lụọ karịa otu nwaanyị, gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?”
Jeel
Ònye bụ Jeel? Ọ bụ nwunye otu nwoke na-abụghị onye Izrel aha ya bụ Hiba. Jeel gbachiteere ndị Chineke n’atụghị egwu ọ bụla.
Gịnị ka o mere? Mgbe Sisera bụ́ onyeisi agha ndị Kenan bịara n’ebe Jeel mara ụlọikwuu, Jeel kpebiri ihe ọ ga-eme ozugbo. Ndị Izrel meriri Sisera na ndị agha ya. Sisera sikwa n’agha ahụ gbapụ na-achọ ebe ọ ga-ezo. Jeel kpọbatara ya ka o zoo n’ụlọikwuu ya ma zuo ike. Mgbe ụra buuru ya, ya egbuo ya.—Ndị Ikpe 4:17-21.
Ihe ahụ Jeel mere mezuru amụma Debora buru, ọ sịrị: “Ọ bụ nwaanyị ka Jehova ga-ewere Sisera resị.” (Ndị Ikpe 4:9) N’ihi ihe a Jeel mere a jara ya mma na ọ bụ “onye a gọziri agọzi karịsịa.”—Ndị Ikpe 5:24.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Jeel? Jeel echeghị ka a gwa ya ihe ọ ga-eme tupu ya emee ya, o gosikwara na o nwere obi ike. Akụkọ ya na-akụzikwara anyị na Chineke nwere ike ime ka ihe gaa otú ọ bụla ọ chọrọ ka amụma ya wee mezuo.
Jezibel
Ònye bụ Jezibel? Ọ bụ nwunye Ehab, bụ́ eze Izrel. Ọ bụghị onye Izrel, ọ naghịkwa efe Jehova. Kama ihe ọ na-efe bụ chi ndị Kenan bụ́ Bel.
Gịnị ka o mere? Jezibel nwunye eze bụ ajọ mmadụ, onye na-achọ ka okwu bie n’ọnụ ya, nakwa onye obi tara mmiri. O mere ka ọtụtụ ndị fewe Bel ma na-etinye aka n’omume rụrụ arụ ya na ya so. Ọ gbalịkwara ime ka ndị Izrel kwụsị ife ezi Chineke, bụ́ Jehovah.—1 Ndị Eze 18:4, 13; 19:1-3.
Jezibel na-agha ụgha ma ọ bụdị gbuo mmadụ ka o nwee ike inweta ihe ọ chọrọ. (1 Ndị Eze 21:8-16) Chineke buru amụma na ọ ga-anwụ ọnwụ ike nakwa na a gaghị eli ya eli, ọ bụkwa otú ahụ ka o si mee.—1 Ndị Eze 21:23; 2 Ndị Eze 9:10, 32-37.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Jezibel? E ji akụkọ Jezibel adọ anyị aka ná ntị. N’ihi àgwà ọjọọ dị iche iche Jezibel kpara, aha ya ghọziri ihe e ji akọwa nwaanyị ọ bụla ihere na-adịghị n’anya, onye na-ebi ndụ akwụna ma ọ bụ na-eme otú o si masị ya.
Lia
Ònye bụ Lia? Ọ bụ nwunye mbụ Jekọb, nna ochie ndị Izrel. Nwanne ya nwaanyị nke nta bụ́ Rechel, bụ nwunye Jekọb nke ọzọ.—Jenesis 29:20-29.
Gịnị ka o mere? Lia mụtaara Jekọb ụmụ nwoke isii. (Rut 4:11) Onye Jekọb bu n’obi ịlụ bụ Rechel, ọ bụghị Lia. Ma, nna ha bụ́ Leban, kpara nkata ka Lia nọchie Rechel mgbe oge ruru ka ọ kpọnye Jekọb onye ọ chọrọ ịlụ. Mgbe Jekọb hụrụ na a ghọgburu ya ka ọ lụwa Lia, ọ jụrụ Leban ihe mere o ji mee ụdị ihe ahụ. Leban sịrị na ọ bụghị omenala obodo ha ibu ụzọ kee nwa nke nta di tupu nke ada. Mgbe otu izu gara, Jekọb lụrụ Rechel.—Jenesis 29:26-28.
Jekọb hụrụ Rechel n’anya karịa Lia. (Jenesis 29:30) N’ihi nke a, Lia gbalịsiri ike ka Jekọb hụ ya n’anya otú o si hụ nwanne ya nwaanyị. Chineke hụrụ otú ọ dị Lia ma jiri ụmụ asaa gọzie ya. Ọ mụtara ụmụ nwoke isii na otu nwaanyị.—Jenesis 29:31.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Lia? Lia tụkwasịrị Chineke obi. O kweghịkwa ka nsogbu ndị ọ na-enwe n’ezinụlọ ya mee ka ọ kwụsị ịhụ otú Chineke si na-enyere ya aka. (Jenesis 29:32-35; 30:20) Akụkọ ya na-enyere anyị aka ịhụ nsogbu na-adị ma nwoke lụọ karịa otu nwaanyị, n’agbanyeghị na e nwere mgbe Chineke gbara ndị mmadụ nkịtị ka ha na-eme ya. Ihe Chineke chọrọ kemgbe ụwa bụ ka nwoke lụọ naanị otu nwunye nakwa ka nwaanyị nwee naanị otu di.—Matiu 19:4-6.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Lia, gụọ isiokwu bụ́ “Ụmụnne Nwanyị Abụọ Obi Na-adịghị Mma ‘Wuru Ụlọ Izrel.’”
▸ Ị chọọ ịmata ihe mere Chineke ji kwe ka ndị ya lụọ ọtụtụ nwaanyị n’oge ochie, gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?”
Mata
Ònye bụ Mata? Ọ bụ nwanne Lazarọs na Meri, ha atọ bikwa n’obodo Betani nke dị nso na Jeruselem.
Gịnị ka o mere? Mata bụ enyi Jizọs. Baịbụl kwukwara na Jizọs “hụrụ Mata na nwanne ya nwaanyị na Lazarọs n’anya.” (Jọn 11:5) Mata na-ele ọbịa nke ọma. N’otu n’ime oge Jizọs bịara n’ụlọ ha, Meri nọdụrụ ala na-ege Jizọs ntị ma Mata nọ na-agbakeri ala na-achọ ihe ọ ga-eji lee Jizọs ọbịa. Mata gara kpesara Jizọs, gwa ya na Meri ekweghị enyere ya aka. Jizọs ji nwayọọ mee ka Mata ghọta ihe ndị ka mkpa.—Luk 10:38-42.
Mgbe Lazarọs dara ọrịa, Mata na nwanne ya nwaanyị ziri ozi ka Jizọs bịa, n’ihi na obi siri ha ike na ọ ga-agwọli nwanne ha nwoke. (Jọn 11:3, 21) Ma Lazarọs mechara nwụọ. Ihe Mata gwara Jizọs gosiri na Mata kwenyesiri ike ná nkwa e kwere na Baịbụl na ndị nwụrụ anwụ ga-ebilite n’ọnwụ. Obi sikwara ya ike na Jizọs ga-enwe ike ịkpọlite nwanne ya nwoke n’ọnwụ.—Jọn 11:20-27.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Mata? Mata bụ onye na-ele ọbịa nke ọma. O jikwa obi ya niile nabata aka ná ntị a dọrọ ya. O mekwara ka a mara otú obi dị ya nakwa ihe o kweere.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Mata, gụọ isiokwu bụ́ “Ekwerewo M..”
Meri (nne Jizọs)
Ònye bụ Meri? Ọ bụ otu nwa agbọghọ onye Juu. Ọ bụkwa nwa agbọghọ na-amaghị nwoke mgbe ọ mụrụ Jizọs, ebe ọ bụ na ọ dịịrị ime ọkpara Chineke n’ụzọ ọrụ ebube.
Gịnị ka o mere? Meri ji obi umeala rụọ ọrụ Chineke nyere ya. Ya na Josef ekwela onwe ha nkwa ọlụlụ mgbe mmụọ ozi bịara gwa ya na ọ ga-adị ime ma mụọ Mezaya ahụ ndị Juu tụwara anya ya kemgbe. (Luk 1:26-33) O ji obi ya niile kweta ịrụ ọrụ Chineke nyere ya. Mgbe Meri mụchara Jizọs, ya na Josef mụtara ụmụ nwoke anọ na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụmụ nwaanyị abụọ. N’ihi ya, Meri abụghịzi nwa agbọghọ na-amaghị nwoke. (Matiu 13:55, 56) Ọ bụ eziokwu na Chineke nyere ya ihe ùgwù pụrụ iche, o nweghị mgbe ọ chọrọ ka a sọpụrụwa ya n’ụdị pụrụ iche, o nweghịkwanụ mgbe e meere ya ụdị ihe ahụ, ma mgbe Jizọs nọ n’ụwa ma n’oge ndịozi Jizọs oge mbụ.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Meri? Meri bụ nwaanyị nwere okwukwe, o jikwa obi ya niile kweta ịrụ nnukwu ọrụ dị mkpa Chineke nyere ya. Ọ maara Akwụkwọ Nsọ nke ọma. Otu akwụkwọ kwuru na mgbe Meri kwuru ihe ahụ dị na Luk 1:46-55, o yiri ka ò kwuru ihe e dere n’ebe dị iche iche n’Akwụkwọ Nsọ ihe dị ka ugboro iri abụọ.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Meri, gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Anyị Nwere Ike Ịmụta ná Ndụ Meri.”
Meri (nwanne Mata na Lazarọs)
Ònye bụ Meri? Meri na Lazarọs, nwanne ya nwoke, nakwa Mata, nwanne ya nwaanyị, bụ ndị enyi Jizọs.
Gịnị ka o mere? Meri gosiri ugboro ugboro na ya ghọtara na Jizọs bụ Ọkpara Chineke. O kwuru ihe gosiri na o nwere okwukwe na Jizọs gaara egbochi nwanne ya nwoke bụ́ Lazarọs ịnwụ, ọ nọkwa ya mgbe Jizọs kpọlitere ya n’ọnwụ. Mata, nwanne ya nwaanyị, wesara Meri iwe mgbe ọ gara nọrọ na-ege Jizọs ntị kama ịbịa nyere ya aka sie nri. Ma Jizọs jara Meri mma maka na ọ họrọ ige okwu Chineke.—Luk 10:38-42.
N’oge ọzọ, Meri gosiri na ọ bụ onye na-emesapụ aka mgbe ọ wụsara ‘mmanụ dị oké ọnụ’ n’isi Jizọs nakwa n’ụkwụ ya. (Matiu 26:6, 7) Ndị ọzọ nọ ebe ahụ were iwe na Meri na-emefusị ego. Ma Jizọs gbachiteere ya, sị: “N’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma [Alaeze Chineke] n’ụwa dum, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere ka ọ bụrụ ihe a ga-eji na-echeta ya.”—Matiu 24:14; 26:8-13.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Meri? Meri nwere okwukwe siri ezigbo ike. O ji ofufe Chineke kpọrọ ihe karịa ihe ndị ọzọ. O ji obi umeala meere Jizọs otu ihe ọma n’agbanyeghị na o furu ya nnukwu ego.
Meri Magdalin
Ònye bụ Meri Magdalin? Ọ bụ otu ezigbo onye na-eso ụzọ Jizọs.
Gịnị ka o mere? Meri Magdalin bụ otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị so Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mgbe ha na-ekwusa ozi ọma n’ebe dị iche iche. O jikwa ego ya na ihe ndị o nwere gbooro Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mkpa ha. (Luk 8:1-3) O sogidere Jizọs ruo ngwụcha ozi ọma ya, ọ nọkwa nso mgbe e gburu ya. O nwekwara ihe ùgwù nke iso ná ndị mbụ hụrụ Jizọs mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ.—Jọn 20:11-18.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Meri? Meri Magdalin ji ihe ndị o nwere kwadoo ọrụ ikwusa ozi ọma Jizọs, ọ bụkwa onye na-eso ụzọ Jizọs ruo n’isi.
Miriam
Ònye bụ Miriam? Ọ bụ nwanne nwaanyị Mozis na Erọn. Ọ bụ ya bụ nwaanyị mbụ Baịbụl kpọrọ onye amụma nwaanyị.
Gịnị ka o mere? Ebe ọ bụ onye amụma nwaanyị, Chineke si n’ọnụ ya gwa ndị ya ihe ụfọdụ ọ chọrọ ka ha mara. Ọ bụ onye a ma ama n’Izrel, o sokwa ụmụ nwoke ndị Izrel bụọ abụ otuto mgbe Chineke sụrụ ndị Ijipt akwụ n’Osimiri Uhie.—Ọpụpụ 15:1, 20, 21.
Obere oge nke a mechara, Miriam na Erọn kwuru okwu ọjọọ banyere Mozis. O yiri ka ọ bụ anyaụfụ na nganga mere ha ji mee ihe a. Chineke “nọkwa na-ege ntị,” ọ bakwaara Miriam na Erọn mba. (Ọnụ Ọgụgụ 12:1-9) Chineke meziri ka ekpenta ju Miriam ahụ́. O yiri ka ihe mere e ji tie ya ekpenta bụ na ọ bụ ya bụ onyeisi malitere ikwutọ Mozis. Mgbe Mozis rịọrọ Chineke ka ọ gbaghara ya, Chineke mere ka ahụ́ ya dịghachi mma. A kpọpụrụ Miriam iche ruo abalị asaa tupu e mechaa nabataghachi ya n’ebe ndị Izrel ndị ọzọ bi.—Ọnụ Ọgụgụ 12:10-15.
Baịbụl gosiri na Miriam nabatara aka ná ntị ahụ a dọrọ ya. Ka ọtụtụ narị afọ gara, Chineke kwuru okwu banyere ọrụ pụrụ iche Miriam rụrụ mgbe ọ gwara ndị Izrel, sị: ‘M ziteere unu Mozis, Erọn na Miriam.’—Maịka 6:4.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Miriam? Akụkọ Miriam na-enyere anyị aka ịghọta na Chineke na-ege ntị n’ihe ndị na-efe ya na-agwa ibe ha ma ọ bụ n’ihe ha na-ekwu gbasara ndị ọzọ. Anyị na-amụtakwa na ọ bụrụ na anyị chọrọ ime ihe dị Chineke mma, anyị agaghị ekwe ka anyaụfụ na nganga gbaa mgbọrọgwụ n’obi anyị. N’ihi na àgwà ndị a nwere ike ime ka anyị kwuwe okwu ọjọọ banyere ndị ọzọ.
Rechel
Ònye bụ Rechel? Ọ bụ nwa Leban, bụrụkwa nwunye Jekọb, bụ́ nna ochie ndị Izrel, kacha hụ n’anya.
Gịnị ka o mere? Rechel lụrụ Jekọb ma mụtara ya ụmụ nwoke abụọ, ndị mechara soro ná ndị e si na ha nweta ebo iri na abụọ nke Izrel oge ochie. Rechel na onye mechara lụọ ya hụrụ mgbe ọ na-elekọta atụrụ nna ya. (Jenesis 29:9, 10) Ọ “mara mma” karịa Lia, bụ́ nwanne ya nwaanyị nke tọrọ ya.—Jenesis 29:17.
Jekọb hụrụ Rechel n’anya, ma kweta ịrụrụ nna ya ọrụ afọ asaa ka o nwee ike ịlụ Rechel. (Jenesis 29:18) Ma, Leban ghọgburu Jekọb ma buru ụzọ kpọnye ya Lia ka ọ lụọ, Leban mechakwara kwe ka ọ lụọ Rechel.—Jenesis 29:25-27.
Jekọb hụrụ Rechel na ụmụ nwoke abụọ ahụ ọ mụtaara ya n’anya karịa ka ọ hụrụ Lia na ụmụ ya. (Jenesis 37:3; 44:20, 27-29) N’ihi nke a, ana-enwe esemokwu n’etiti ụmụ nwaanyị abụọ ahụ mgbe niile.—Jenesis 29:30; 30:1, 15.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Rechel? Rechel diri ọtụtụ nsogbu n’ezinụlọ ya, ma o nweghị mgbe ọ kwụsịrị inwe okwukwe na Chineke ga-aza ekpere ya. (Jenesis 30:22-24) Akụkọ ya na-enyere anyị aka ịhụ nsogbu na-adị mgbe nwoke lụrụ ọtụtụ nwaanyị. Akụkọ Rechel na-eme ka anyị ghọta na Chineke maara ihe wee nye nwoke mbụ otu nwaanyị. O ji ya gosi na ọ chọrọ ka nwoke nwee naanị otu nwunye.—Matiu 19:4-6.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Rechel, gụọ isiokwu bụ́ “Ụmụnne Nwanyị Abụọ Obi Na-adịghị Mma ‘Wuru Ụlọ Izrel.’”
▸ Ị chọọ ịma ihe mere Chineke ji kwe ka ndị na-efe ya n’oge ochie lụọ karịa otu nwaanyị, gụọ isiokwu bụ́ “Chineke Ọ̀ Kwadoro Nwoke Ịlụ Ihe Karịrị Otu Nwaanyị?”
Rehab
Ònye bụ Rehab? Ọ bụ nwaanyị akwụna, onye bi n’obodo Jeriko, nke dị na Kenan. Ọ ghọkwara onye na-efe Jehova Chineke.
Gịnị ka o mere? Rehab zoro ndị Izrel abụọ bịara iledo ala Jeriko. Ihe mere o ji mee ihe a bụ n’ihi akụkọ ndị ọ nụrụ banyere otú Jehova, bụ́ Chineke ndị Izrel, si zọpụta ndị Izrel n’Ijipt nakwa n’aka ndị a na-akpọ ndị Amọraịt.
Rehab nyeere ndị nledo ahụ aka ka a ghara ijide ha ma rịọzie ha ka ha chebe ya na ndị ezinụlọ ya mgbe ndị Izrel ga-abịa ibibi Jeriko. Ndị nledo ahụ kwetara, ma ha gwara ya ihe ndị ọ ga-eme: Ọ gaghị agwa onye ọ bụla gbasara ha, ya na ndị ezinụlọ ya ga-anọ n’ime ụlọ ya mgbe ndị Izrel ga-abịa ibuso Jeriko agha, nakwa na ọ ga-ekegide eriri uhie na windo ka ha nwee ike ịmata ụlọ ya. Rehab mere ihe niile ha gwara ya, ya na ndị ezinụlọ ya esokwaghị ná ndị e gburu mgbe ndị Izrel bịara bibie Jeriko.
Rehab mechara lụọ onye Izrel ma bụrụkwa nne ochie Eze Devid nakwa Jizọs Kraịst.—Joshụa 2:1-24; 6:25; Matiu 1:5, 6, 16.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Rehab? Rehab so ná ndị Baịbụl kwuru na ha nwere okwukwe e ji ama atụ. (Ndị Hibru 11:30, 31; Jems 2:25) Akụkọ ya na-eme ka anyị mata na Chineke na-agbaghara mmehie nakwa na ọ naghị ele mmadụ anya n’ihu. Ọ na-agọzikwa ndị niile tụkwasịrị ya obi, n’agbanyeghị obodo ha si.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Rehab, gụọ isiokwu bụ́ “E ‘Sitere n’Ọrụ Ya Kpọọ Ya Onye Ezi Omume.’”
Ribeka
Ònye bụ Ribeka? Ọ bụ nwunye Aịzik na nne ụmụ ejima ha, bụ́ Isọ na Jekọb.
Gịnị ka o mere? Ribeka mere ihe Chineke chọrọ, ma mgbe ime ya siiri ya ike. Mgbe ọ na-esere mmiri n’otu olulu mmiri, otu nwoke sị ya nyetụ ya mmiri ka ya ṅụọ. Ozugbo ahụ Ribeka nyere ya mmiri ma gwa nwoke ahụ na ya ga-esetakwara kamel ya mmiri ka ha ṅụọ. (Jenesis 24:15-20) Nwoke ahụ bụ onye na-ejere Ebreham ozi, o sikwa n’ebe dị anya bịa ịchọtara nwa Ebreham bụ́ Aịzik nwunye. (Jenesis 24:2-4) Nwoke a kpekwara ekpere ka Chineke gọzie ije ahụ ọ bịara. Mgbe ọ hụrụ otú Ribeka si gbasie ike na otú o si bụrụ onye na-ele ọbịa nke ọma, ọ ghọtara na Chineke azaala ekpere ya, nakwa na nwaanyị a bụ onye Chineke chọrọ ka ọ bụrụ nwunye Aịzik.—Jenesis 24:10-14, 21, 27.
Mgbe Ribeka nụrụ ihe onye ahụ na-ejere Ebreham ozi chọ bịa, o kwetara iso ya laa ma bụrụ nwunye Aịzik. (Jenesis 24:57-59) Ribeka mechara mụta ụmụ ejima nwoke. Mgbe ụmụaka ahụ ka nọ n’afọ, Chineke gwara ya na Isọ, bụ́ nke okenye, ga-ejere Jekọb, bụ nke nwata ozi. (Jenesis 25:23) Mgbe Aịzik mere ndokwa ka Isọ bụ́ ọkpara nara ngọzi, Ribeka mere ihe ozugbo ka ọ bụrụ Jekọb nwetara ngọzi ahụ, ebe ọ ma na ọ bụ otú ahụ ka Chineke si chọọ ya.—Jenesis 27:1-17.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Ribeka? Ribeka dị umeala n’obi, bụrụ onye dị ike ọrụ na onye na-ele ọbịa nke ọma. Ọ bụ àgwà ndị a mere o ji bụrụ ezigbo nwaanyị, ezigbo nne, nakwa nwaanyị hụrụ Chineke n’anya.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Ribeka, gụọ isiokwu bụ́ “Achọrọ M Iso Ya Laa.”
Rut
Ònye bụ Rut? Ọ bụ nwaanyị Moab, onye hapụrụ chi ya na obodo ya ma bịa mba Izrel ghọọ onye na-efe Jehova.
Gịnị ka o mere? Rut gosiri na ọ hụrụ Neomi, bụ́ nne di ya, n’anya nke ukwuu. Neomi, di ya na ụmụ ya nwoke abụọ si n’ala Izrel kwaga Moab n’ihi ụnwụ nri. Ụmụ ya nwoke abụọ ahụ mechara lụọ Rut na Ọpa, ụmụ nwaanyị Moab. Ma ka oge na-aga, di Neomi na ụmụ ya nwoke abụọ ahụ nwụrụ, hapụzie ụmụ nwaanyị atọ a.
Neomi kpebiri ịlaghachi Izrel ebe ọ bụ na ụnwụ nri adịghịzi ebe ahụ. Rut na Ọpa sooro ya lawa. Ma n’ụzọ, Neomi rịọrọ ha ka ha laghachikwuru ndị ikwu ha. Ọpa lawara. (Rut 1:1-6, 15) Ma Rut jụwapụrụ isi na ya agaghị alaghachi kama na ya ga-eso nne di ya. Ọ hụrụ Neomi n’anya, chọọkwa ife Jehova, bụ́ Chineke Neomi.—Rut 1:16, 17; 2:11.
Na Betlehem, bụ́ obodo Neomi, ndị mmadụ mechara mara Rut ama na ọ bụ nwunye nwa hụrụ nne di ya n’anya nke ukwuu, nakwa nwaanyị dị ike ọrụ. Àgwà ọma Rut tọrọ otu nwoke bara ọgaranya aha ya bụ́ Boaz ụtọ nke mere na o nyere Rut na Neomi ọtụtụ ihe oriri. (Rut 2:5-7, 20) Boaz mechara lụọ Rut. Rut mechakwara bụrụ nne ochie Eze Devid na Jizọs Kraịst.—Matiu 1:5, 6, 16.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Rut? Ọ bụ otú Rut si hụ Neomi na Jehova n’anya mere o ji hapụ obodo ya na ndị ikwu ya gaa biri n’ala ọzọ ọ na-amaghị. Ọ bụ nwaanyị na-arụsi ọrụ ike, onye na-eji obi ya niile arụ ọrụ, nakwa onye na-atachi obi n’ihe ọ na-eme n’agbanyeghị ihe isi ike ndị bịara ya.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Rut, gụọ isiokwu ndị a, “Ebe Ị Gara Ka M Ga-aga” na “Ezigbo Nwaanyị.”
Sera
Ònye bụ Sera? Ọ bụ nwunye Ebreham, bụrụkwa nne Aịzik.
Gịnị ka o mere? N’ihi okwukwe Sera nwere ná nkwa Chineke kwere di ya, bụ́ Ebreham, ọ hapụrụ ọmarịcha ụlọ ya ebe ọ tụsaara ahụ́ n’obodo Ọọ, bụ́ obodo bara ọgaranya. Chineke gwara Ebreham ka ọ hapụ obodo Ọọ ma gaa ala Kenan. Chineke kwere Ebreham nkwa na ya ga-agọzi ya ma mee ka ọ ghọọ mba ukwu. (Jenesis 12:1-5) O nwere ike ịbụ na Sera dị ihe dị ka afọ iri isii na ise oge ahụ. Ma si mgbe ahụ gawa, Sera na di ya bidoro ibi ndụ nkwagharị n’ụlọikwuu.
Ọ bụ eziokwu na ndụ isi ebe a kwaga ebe ọzọ kpataara Sera ọtụtụ nsogbu, ọ kwadoro Ebreham n’ihe niile Chineke gwara ya mee. (Jenesis 12:10, 15) Sera nọrọ ọtụtụ afọ ọ mụtaghị nwa, o dokwara anya na nke a na-ewute ya. Ma, Chineke kwere Ebreham nkwa na ya ga-agọzi ụmụ ya. (Jenesis 12:7; 13:15; 15:18; 16:1, 2, 15) Ka oge na-aga, Chineke kwuru na Sera ga-amụtara Ebreham nwa. O mechakwara mụta nwa mgbe ọ gaferela afọ nwaanyị ji amụ nwa. Ọ dị afọ iri itoolu mgbe ahụ, ebe di ya dị otu narị afọ. (Jenesis 17:17; 21:2-5) Ha gụrụ nwa ahụ Aịzik.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ Sera? Sera na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịtụkwasị Chineke obi mgbe niile na ọ ga-emezu nkwa niile o kwere, ọ sọkwa ya ya bụrụ nke yiri ka ọ gaghị ekwe omume! (Ndị Hibru 11:11) Otú o sikwa bụrụ ezigbo nwunye na-akụziri anyị na ọ dị mkpa ka nwaanyị na-akwanyere di ya ùgwù.—1 Pita 3:5, 6.
▸ Ị chọọ ebe a kọkwuru gbasara Sera, gụọ isiokwu ndị bụ́ “Ị Bụ Nwaanyị Mara Mma” na “Chineke Kpọrọ Ya ‘Nne Ndị Eze.’”
Nwa agbọghọ Shulem
Ònye bụ nwa agbọghọ Shulem? Ọ bụ otu nwa agbọghọ mara mma nke bi n’otu ime obodo. Ọ bụ ya bụ onye bụ́ isi a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ Baịbụl a na-akpọ Abụ Sọlọmọn. Baịbụl ekwughị aha ya.
Gịnị ka o mere? Nwa agbọghọ Shulem ahụ hụrụ otu nwa okoro na-azụ atụrụ n’anya, o kweghịkwa ahapụ ya. (Abụ Sọlọmọn 2:16) Ma ụdị mma ọ mara chabara Eze Sọlọmon n’anya, ya agbalịwa ime ka nwa agbọghọ a hụ ya n’anya. (Abụ Sọlọmọn 7:6) N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị ọzọ gwara nwa agbọghọ a ka o kweta Sọlọmọn, o kwetaghị. Ọ hụrụ nwa okoro ahụ na-azụ atụrụ n’anya, o nweghịkwa ihe ga-eme ka ọ hapụ ya.—Abụ Sọlọmọn 3:5; 7:10; 8:6.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ nwa agbọghọ Shulem? N’agbanyeghị mma ya nakwa na eze na-achọ inweta ya, onwe ya ebughị ya isi. O kweghị ka ihe ụmụ agbọghọ ibe ya na ndị ọzọ na-agwa ya ma ọ bụ nkwa dị iche iche eze na-ekwe ya mee ka ọ kwụsị ịhụ onye ọ hụrụ n’anya n’anya. O jidere onwe ya, o kweghị ka ihe ọ bụla mee ya ka o tinye aka n’omume rụrụ arụ.
Nwunye Lọt
Ònye bụ nwunye Lọt? Baịbụl akpọghị aha nwaanyị a. Ma ọ gwara anyị na ọ mụtara ụmụ nwaanyị abụọ nakwa na ya na ndị ezinụlọ ya bi n’obodo Sọdọm.—Jenesis 19:1, 15.
Gịnị ka o mere? O nupụrụ isi n’otu iwu Chineke nyere. Chineke kpebiri na ya ga-ebibi obodo Sọdọm na obodo ndị ọzọ gbara ha gburugburu n’ihi omume rụrụ arụ ha na-eme. Lọt na ezinụlọ ya bi na Sọdọm, n’ihi ịhụnanya Chineke nwere n’ebe Lọt nọ, o zitere ndị mmụọ ozi abụọ ka ha gaa kpọpụta Lọt na ndị ezinụlọ ya ka ihe ghara ime ha.—Jenesis 18:20; 19:1, 12, 13.
Ndị mmụọ ozi ahụ gwara Lọt na ndị ezinụlọ ya ka ha gbapụ n’obodo ahụ nakwa ka ha ghara ile anya n’azụ; ọ bụrụ na ha elee anya n’azụ, ha ga-anwụ. (Jenesis 19:17) Nwunye Lọt ‘malitere ile anya n’azụ, o wee ghọọ ogidi nnu.’—Jenesis 19:26.
Gịnị ka anyị na-amụta n’akụkọ nwunye Lọt? Akụkọ ya na-akụziri anyị na ọ dịghị mma ka mmadụ hụ ihe onwunwe n’anya nke na ọ ga-enupụrụ Chineke isi. Jizọs ji akụkọ ya dọọ anyị aka ná ntị. Ọ sịrị: “Chetanụ nwunye Lọt.”—Luk 17:32.
Oge Ụmụ Nwaanyị Ndị A Kọrọ Akụkọ Ha na Baịbụl Biri Ndụ
Iju Mmiri (2370 T.O.A.)
Mgbe ndị Izrel si n’Ijipt pụta (1513 T.O.A.)
Eze mbụ chịrị Izrel (1117 T.O.A.)
Mgbe e mere Jizọs baptizim (29 O.A.)
Mgbe Jizọs nwụrụ (33 O.A.)