Gaa n'Isiokwu

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ A KỌWARA

Abụ Ọma 37:4—‘Ka Ihe Jehova Tọọkwa Gị Ụtọ’

Abụ Ọma 37:4—‘Ka Ihe Jehova Tọọkwa Gị Ụtọ’

 “Na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi Jehova, ọ ga-emere gị ihe obi gị chọrọ.”​—Abụ Ọma 37:​4, Baịbụl Nsụgharị Ụwa Ọhụru.

 “Ka ihe Jehova tọọ kwa gị ụtọ nke ukwuu; Ọ ga-enye kwa gị ihe niile obi gị na-arịọ.”​—Abụ Ọma 37:4, Bible Nsọ nke Union Version.

Ihe Abụ Ọma 37:4 Pụtara

 Ọbụ abụ dere amaokwu a na-agba ndị na-efe Chineke ume ka ha na-enwe ọṅụ maka na ha na Chineke dị n’ezigbo mma. Obi siri ndị niile ha na Jehova a Chineke bụ enyi ike na ọ ga-emere ha ihe ọ bụla na-akpa ha.

 “Na-enwe ezigbo obi ụtọ n’ihi Jehova.” Otú ọzọ e nwere ike isi kwuo ihe a bụ “na-enwe ọṅụ kachanụ n’ime Jehova,” “na-enwe aṅụrị n’ijere Onyenwe anyị ozi,” ma ọ bụkwanụ “na-enwe ọṅụ ná nkwa Onyenwe anyị kwere gị.” Ihe ihe a niile pụtara bụ na anyị kwesịrị ‘ịna-enwe ọṅụ kachanụ’ maka na anyị na-efe Chineke. (Ihe e dere n’ala ala peeji Abụ Ọma 37:4) Gịnị mere anyị ga-eji kwuo otú ahụ?

 Baịbụl mere ka anyị mata otú Jehova si ele ihe anya. Ndị na-efe Jehova na-elekwa ihe anya otú ahụ o si ele ya. Ha ma Chineke, marakwa na ihe ga-egosi na ha ma ihe bụ ha ịna-erubere ya isi. N’ihi ya, akọnuche ha anaghị ama ha ikpe, ha na-ezerekwa ọtụtụ nsogbu. (Ilu 3:5, 6) Dị ka ihe atụ, ha anaghị ewewe iwe ma ọ bụ nwewe anyaụfụ ma ha hụ na o yiri ka ihe na-agaziri ndị anyaukwu ma ọ bụ ndị na-anaghị akwụwa aka ọtọ. (Abụ Ọma 37:1, 7-9) Obi dị ndị na-efe Chineke ụtọ maka na ha ma na Chineke ga-eme ka ikpe na-ezighị ezi na nsogbu niile ya na ya so kwụsị n’oge na-adịghị anya nakwa na ọ ga-akwụ ndị na-erubere ya isi ụgwọ maka ezigbo àgwà ha na-akpa. (Abụ Ọma 37:34) Obi dịkwa ha ụtọ ịma na ha na-eme Nna ha nke eluigwe obi ụtọ.​—Abụ Ọma 5:12; Ilu 27:11.

 “Ọ ga-emere gị ihe obi gị chọrọ.” Otú ọzọ e nwere ike isi sụgharịa ya bụ “ọ ga-aza ekpere gị” ma ọ bụ “ọ ga-enye gị ihe obi gị na-achọ.” Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova agaghị enye anyị ihe ọ bụla anyị rịọrọ. Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru otú ahụ ezigbo nna ma ọ bụ nne ma ihe ga-akacha abara nwa ya uru. Ihe ọzọkwa bụ na ihe anyị na-arịọ Chineke na otú anyị si ebi ndụ kwesịrị ịdaba n’uche ya. (Ilu 28:9; Jems 4:3; 1 Jọn 5:14) Ọ bụrụ na ihe anyị na-arịọ Chineke na otú anyị si ebi ndụ adaba n’uche ya, obi ga-esi anyị ike na “Onye na-anụ ekpere” ga-anụ olu anyị.​—Abụ Ọma 65:2; Matiu 21:22.

Ihe Ndị Gbara Psalm 37:4 Gburugburu

 Ọ bụ Eze Devid, onye chịrị Izrel n’oge ochie dere Abụ Ọma 37. O dere abụ ọma a n’usoro otú e si ede abịdịị. b

 E nwere oge ndị e mere Devid ihe na-adịghị mma. E nwekwara mgbe ọ nọ na-agba ọsọ ndụ ka Eze Sọl na ndị ọzọ chọrọ igbu ya ghara inweta ya. (2 Samuel 22:1) Ma, Devid akwụsịghị ịtụkwasị Chineke obi. Devid ma na Chineke ga-emecha taa ndị ajọ omume ahụhụ. (Abụ Ọma 37:10, 11) Ọ bụrụgodị na ihe na-agaziri ha, ha ga-emecha laa n’iyi ka “ahịhịa ndụ.”​—Abụ Ọma 37:2, 20, 35, 36.

 Abụ Ọma 37 kwuru ihe ga-eme ndị na-erubere Chineke isi nakwa ihe ga-eme ndị na-anaghị erubere ya isi. (Abụ Ọma 37:16, 17, 21, 22, 27, 28) N’ihi ya, abụ ọma a na-enyere anyị aka ịma ihe nakwa ịbụ ụdị ndị Chineke na-anabata.

 Lee obere vidio a ka ị hụ ihe akwụkwọ Abụ Ọma na-ekwu.

a Jehova bụ otú e si ede aha Chineke n’Igbo. Ị chọọ ịmata ihe mere e ji dee Onyenwe anyị n’ọtụtụ Baịbụl kama ide aha Chineke, gụọ isiokwu bụ́ “Ònye bụ Jehova?

b E dewe ihe n’usoro abịdịị, a na-eji mkpụrụ akwụkwọ mbụ e nwere n’asụsụ Hibru malite amaokwu nke mbụ ma ọ bụ amaokwu ndị bu ụzọ. A na-ejizi mkpụrụ akwụkwọ nke abụọ malite amaokwu ndị na-esonụ, derezie ha otú ahụ na-aga. Ọ ga-abụ na otú a e si dee abụ ọma a mere ka ọ dịrị ndị mmadụ mfe icheta ha.